2Joshụa nwa Nọn wee si na Shitim+ zipụ ụmụ nwoke abụọ na nzuzo. Ọ sịrị ha: “Gaanụ nyopụta otú ala ahụ dị, karịchaa Jeriko.” Ha wee gawa. Mgbe ha ruru Jeriko, ha bara n’ụlọ otu nwaanyị akwụna aha ya bụ Rehab+ wee nọrọ ebe ahụ.
17 A ga-ebibi obodo a na ihe niile dị n’ime ya.+ Ha niile bụ nke Jehova. Naanị Rehab+ nwaanyị akwụna ahụ ga-adị ndụ, ya na ndị niile ya na ha nọ n’ụlọ, n’ihi na o zoro ndị anyị dunyere ozi.+
31 Ọ bụ okwukwe mere ka Rehab, bụ́ nwaanyị akwụna, ghara iso ndị nupụụrụ Chineke isi nwụọ, n’ihi na o ji obiọma nabata ndị bịara inyopụta otú obodo ahụ dị.+