13 “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye,+ n’ihi na ọnụ ụzọ ámá sara mbara na okporo ụzọ dị obosara na-eduba ná mbibi, ndị na-esikwa n’ọnụ ụzọ ámá ahụ abanye dị ọtụtụ. 14 Ma, ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.+