3 Ka e too Chineke bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Ọ bụ maka nnukwu ebere o meere anyị mere o ji mụọ anyị ọzọ+ ka anyị nwee ezigbo olileanya+ maka na a kpọlitere Jizọs Kraịst n’ọnwụ.+
23 N’ihi na a mụọla unu ọzọ.+ E si ná mkpụrụ na-enweghị ike ịnwụ anwụ* mụọ unu, ọ bụghị mkpụrụ nwere ike ịnwụ anwụ.+ E ji okwu Chineke, onye dị ndụ, onye na-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi, mụọ unu.+
9 Onye ọ bụla bụ́ nwa Chineke anaghị anọgide na-eme mmehie+ n’ihi na mmụọ* Chineke dị n’ime onye ahụ, o nweghịkwa ike ịnọgide na-eme mmehie n’ihi na ọ bụ nwa Chineke.+