-
Matiu 5:21, 22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
21 “Unu nụrụ na a gwara ndị oge ochie, sị: ‘Egbula mmadụ,*+ ma onye ọ bụla nke gburu mmadụ ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe.’+ 22 Ma, ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ewesa nwanne ya iwe+ ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe. Onye ọ bụla nke na-agwakwa nwanne ya okwu mkparị jọgburu onwe ya ga-aza ajụjụ n’Ụlọikpe Kacha Elu. Onye ọ bụla nke na-asịkwa, ‘Gị onye nzuzu na-abaghị uru!’ a ga-atụba ya na Gehena,* bụ́ ebe ọkụ na-ere.+
-