28 “N’eziokwu, unu ahapụghị m+ n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara m.+ 29 Mụ na unu na-agbakwa ndụ na unu ga-achị n’alaeze, dịkwa ka mụ na Nna m gbara ndụ,+ 30 ka unu wee rie ma ṅụọ na tebụl m n’Alaeze m,+ nọdụkwa ala n’ocheeze+ na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.+