-
Mkpughe 18:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 “Ndị ahịa ụwa na-ebere ya ákwá, na-erukwara ya uju, n’ihi na e nweghịzi onye ga-azụ ngwá ahịa ha. 12 Ngwá ahịa ha bụ ọlaedo, ọlaọcha, nkume dị oké ọnụ,* nkume pel, ezigbo ákwà linin, ákwà na-acha pọpụl, ákwà silk, ákwà na-acha uhie uhie,* osisi ọ bụla na-esi ísì ọma, ụdị ihe ọ bụla e ji ọdụ́ mee, ụdị ihe ọ bụla e ji osisi dị oké ọnụ mee, ihe e ji ọla kọpa mee, na nke e ji ígwè mee, nakwa nke e ji nkume mabụl mee.
-