29 Kpọkọọnụ ndị na-agba ụta
Na ndị niile na-ekwe ụta ka ha lụso Babịlọn agha.+
Maanụ ụlọikwuu gburugburu ya. Unu ekwekwala ka onye ọ bụla si na ya gbapụ.
Kwụọnụ ya ụgwọ ihe o mere.+
Meenụ ya ihe niile o mere ndị ọzọ.+
N’ihi na ọ bụ Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel,
Ka ọ na-egosi na ya dị mpako.+