Joel
3 “N’ihi na lee, n’ụbọchị ndị ahụ nakwa n’oge ahụ,
Mgbe m ga-akpọghachite ndị Juda na ndị Jeruselem a dọọrọ n’agha,+
2 M ga-achịkọtakwa mba niile
Ma kpọrọ ha bịa na Ndagwurugwu Jehoshafat.*
M ga-ekpe ha ikpe n’ebe ahụ+
N’ihi ndị m na ndị m ketara bụ́ Izrel,
N’ihi na ha chụsasịrị ha ná mba dị iche iche,
Ha kekwaara onwe ha ala m.+
3 Ha na-efe nza ka ha keere onwe ha ndị m.+
Ha na-eji nwata nwoke agbanweta akwụna
Ma na-ere nwata nwaanyị ka ha zụta mmanya ha ga-aṅụ.
4 Taya na Saịdọn na ógbè niile dị na Filistia,
Gịnị ka m mere unu?
Ò nwere ihe m mere unu unu na-akwụghachi m ụgwọ ya?
Ọ bụrụ na unu na-akwụghachi m ụgwọ,
M ga-eme ka ihe unu mere m lọghachi n’isi unu ngwa ngwa, n’egbughị oge.+
5 Ebe ọ bụ na unu eburula ọlaọcha m na ọlaedo m,+
Unu ebubakwala akụ̀ m ndị kacha mma n’ụlọ chi unu dị iche iche,
6 Unu ereela ndị Juda na ndị Jeruselem resị ha ndị Grik+
Ka unu wee kpọpụ ha n’ala ha kpọga ha n’ebe dị anya,
M ga-emekwa ka ihe unu mere ha lọghachi n’isi unu.
8 M ga-eresị ndị Juda ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị,+
Ha ga-eresịkwa ha ndị Shiba, bụ́ mba dị anya,
N’ihi na Jehova ekwuola ya.
9 Maanụ ọkwa ná mba dị iche iche,+ sị:
‘Jikerenụ agha! Kpọọnụ ndị dike ka ha pụta!
Ka ndị agha niile bịa nso, ka ha lụọ agha!+
10 Kpụgharịanụ mma ogè unu ka ha bụrụ mma agha nakwa mma unu ji akwa osisi ka ha bụrụ ube.
Ka onye na-esighị ike sị: “Esiri m ike.”
11 Unu mba niile nọ gburugburu, bịanụ nyere ibe unu aka. Zukọtanụ.’”+
Jehova, biko, mee ka ndị dike* gị gbadata n’ebe ahụ.
12 “Ka mba dị iche iche zukọta ma bịa na Ndagwurugwu Jehoshafat,
N’ihi na m ga-anọdụ ala n’ebe ahụ ikpe mba niile nọ gburugburu ikpe.+
13 Werenụ mma e ji ewe ihe ubi wee ihe ubi n’ihi na ihe ubi achaala.
Gbadatanụ zọchapụta mmanya n’ihi na mkpụrụ vaịn ejula n’ebe a na-azọchapụta mmanya.+
Olulu ebe mmanya a zọchapụtara na-asọba ejufeela ókè n’ihi na ihe ọjọọ ha dị ukwuu.
14 Ìgwè mmadụ, ìgwè mmadụ juru na ndagwurugwu ikpe,
N’ihi na ụbọchị Jehova ga-ekpe ndị mmadụ ikpe na ndagwurugwu ahụ dị nso.+
15 Anyanwụ na ọnwa ga-agba ọchịchịrị,
Kpakpando agaghịkwa enye ìhè ha.
16 Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ.
Ọ ga-esi na Jeruselem kwuo okwu.
Eluigwe na ụwa ga-amakwa jijiji.
Ma Jehova ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba,+
Ọ ga-abụkwara ụmụ Izrel ebe a rụsiri ike.
17 Unu ga-amarakwa na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye bi na Zayọn, bụ́ ugwu nsọ m.+
18 N’ụbọchị ahụ, mmanya dị ụtọ ga-esi n’ugwu na-atapụsị.+
Mmiri ara ehi ga na-eru n’ugwu nta,
Mmiri ga na-asọkwa n’iyi niile dị na Juda.
Iyi ga-esi n’ụlọ Jehova na-asọpụta,+
Ọ ga na-edekwa Ndagwurugwu Osisi Akeshịa.