Job
M ga-ekwupụta ihe na-enye m nsogbu n’obi.
M ga-ekwu okwu n’ihi otú ahụhụ m na-ata si ewute m.
2 M ga-asị Chineke, ‘Ekwula na ikpe mara m.
Gwa m ihe mere i ji na-esesa m okwu.
3 Ọ̀ baara gị uru na ị na-emesi m ike,
Na ị kpọrọ ọrụ aka gị asị,+
Ma na-anabata ndụmọdụ ndị ajọ omume?
4 Ọ̀ bụ anya mmadụ ka i nwere,
Ka ị̀ na-ahụ ihe otú mmadụ efu si ahụ?
5 Ụbọchị ole ị na-adị ndụ ọ̀ bụ ụbọchị ole mmadụ efu na-adị ndụ,
Ka afọ ole ị na-adị ndụ ọ̀ bụ afọ ole mmadụ na-adị ndụ,+
6 Nke mere ị ga-eji na-enyopụta ihe ọjọọ m mere
Ma na-achọgharị ka ị hụ mmehie m?+
E nweghịkwa onye nwere ike ịnapụta m n’aka gị.+
8 Ọ bụ aka gị ka i ji kpụọ m ma kee m.+
Ma ugbu a, ị na-achọ ibibi m kpamkpam.
9 Biko, cheta na ọ bụ ájá ka i ji kpụọ m.+
Ma ugbu a, ị na-eme ka m laghachi n’ájá.+
12 I nyela m ndụ, gosikwa m na ị hụrụ m n’anya.
Nlekọta ị na-elekọta m echebela ndụ* m.+
13 Ma i bu n’obi ime m ihe ndị a na nzuzo.
Ama m na ọ bụ gị na-eme ihe ndị a.
15 Ọ bụrụ na ikpe mara m, nke m agwụla.
Ọ bụrụgodị na aka m dị ọcha, m ga-ekpudo ihu n’ala,+
N’ihi na ihere emegbuola m, ahụhụ zukwara m ahụ́.+
16 Ọ bụrụ na m welite isi m elu, ị na-achụgharị m otú ọdụm si achụ nta anụ,+
Ị na-ejikwa ike gị emekpa m ahụ́.
17 Ị na-akpọta ndị ọhụrụ ga-agbagide m akaebe.
Ị na-ewesakwu m iwe,
Ihe ana-esikwuru m ike.
18 Gịnịzi mere i ji si n’akpa nwa nne m kupụta m?+
Ọ gaara akara m mma na m nwụrụ tupu onye ọ bụla ahụ m anya.
19 Ọ gaara adị ka e nweghị mgbe m dịtụrụla ndụ.
A gaara esi n’akpa nwa kuru m kuba n’ili.’