Levitikọs
24 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv a na-agwaghị agwa a ga-eji na-amụ ọkụ, ka ọkụ* ndị ahụ* wee na-enwu mgbe niile.+ 3 Erọn ga-ahụ na ọkụ ndị ahụ na-enwu, ya bụ, ọkụ ndị dị n’ihu ebe ahụ e ji ákwà mgbochi gechie igbe ọgbụgba ndụ* ahụ dị n’ụlọikwuu nzute. Ọkụ* ndị ahụ ga na-enwu malite ná mgbede ruo n’ụtụtụ n’ihu Jehova. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe. 4 Ọ ga-edozi ọkụ* ndị ahụ n’ihe ahụ e ji adọsa ọkụ*+ e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ, ka ha dịrị n’ihu Jehova mgbe niile.
5 “Ị ga-eji ntụ ọka e gwere nke ọma mee achịcha iri na abụọ dị okirikiri. A ga-eji ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka mee nke ọ bụla n’ime ha. 6 Ị ga-edosa ha n’ihu Jehova n’elu tebụl ahụ e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ.+ Ha ga-adị ahịrị abụọ. Achịcha isii ga-adị n’otu ahịrị, isii adịrị n’ahịrị nke ọzọ.+ 7 Ị ga-atụkwasị frankinsens a na-agwaghị agwa n’elu ahịrị nke ọ bụla. Ị ga-esu ya ọkụ ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ a chụụrụ Jehova nke nọchiri anya achịcha ahụ.+ 8 Kwa Ụbọchị Izu Ike, ọ ga-edo achịcha ahụ n’usoro mgbe niile n’ihu Jehova.+ Ọ bụ ọgbụgba ndụ ga-adịte aka mụ na ndị Izrel na-agba. 9 Achịcha ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị nwoke.+ Ha ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya+ n’ihi na ọ bụụrụ onye nchụàjà ihe kacha nsọ nke si n’àjà a na-esu ọkụ a chụụrụ Jehova. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide.”
10 E nwere otu nwoke nne ya bụ onye Izrel ma nna ya bụ onye Ijipt.+ Nwoke ahụ na nwoke Izrel ọzọ malitere ịlụ ọgụ n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu. 11 Nwoke ahụ nne ya bụ onye Izrel malitere ikwutọ aha Chineke* ma kpọọ Chineke iyi.+ E wee kpọgara ya Mosis.+ Aha nne ya bụ Shelomit, nwa Dibraị, onye si n’ebo Dan. 12 Ha jichiri nwoke ahụ ruo mgbe a ga-eme ka ha mata ihe Jehova chọrọ ka ha mee.+
13 Jehova wee gwa Mosis, sị: 14 “Si n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ onye ahụ kwutọrọ aha m. Ndị niile nụrụ mgbe o kwutọrọ aha m ga-ebikwasị ya aka n’isi. Nzukọ ahụ niile ga-atụkwa ya nkume.+ 15 Ị ga-agwakwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla akpọọ Chineke ya iyi, ọ ga-aza ajụjụ maka mmehie ya. 16 N’ihi ya, a ga-egburịrị onye kwutọrọ aha Jehova.+ Nzukọ ahụ niile ga-atụrịrị ya nkume. A ga-egbu onye ọ bụla kwutọrọ aha Chineke, ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa ma ọ̀ bụ nwa afọ.
17 “‘Ọ bụrụ na mmadụ egbuo mmadụ,* a ga-egburịrị ya.+ 18 Onye ọ bụla kụgburu anụ ụlọ* ga-akwụ ụgwọ ya. Ndụ ga-alara ndụ.* 19 Ọ bụrụ na mmadụ emerụọ mmadụ ibe ya ahụ́, a ga-eme ya ihe o mere onye ahụ.+ 20 Onye gbajiri mmadụ ọkpụkpụ, a ga-agbaji ya ọkpụkpụ. Onye kụkpọrọ mmadụ anya, a ga-akụkpọ ya anya. Onye kụpụrụ mmadụ ezé, a ga-akụpụ ya ezé. Ụdị ihe ọ bụla o mere onye ahụ ka a ga-eme ya.+ 21 Onye kụgburu anụmanụ ga-akwụ ụgwọ ya.+ Ma a ga-egbu onye kụgburu mmadụ.+
22 “‘Otu iwu ga na-achị unu, ma onye mbịarambịa ma nwa afọ,+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”
23 Mosis gwaziri ndị Izrel okwu, ha wee si n’ebe ha mara ụlọikwuu kpọpụ onye ahụ kwutọrọ aha Chineke ma tụọ ya nkume.+ Ndị Izrel wee mee nnọọ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.