Hosia
5 ““Ndị nchụàjà,+ nụrụnụ okwu a.
Ndị Izrel, ṅaakwanụ ntị.
Ndị si n’ezinụlọ eze, geekwanụ ntị,
Maka na ọ bụ unu ka a ga-ekpe ikpe a,
N’ihi na unu bụ ọnyà e siri na Mizpa,
Bụrụkwa ụgbụ e ji sie ọnyà na Tebọ.+
2 Ndị nupụụrụ m isi* jizi oge ha niile na-egbu* anụ e ji achụ àjà.
M ga-adọkwa ha niile aka ná ntị.*
3 Ama m Ifrem,
Izrel ezoghịkwa ezo n’anya m.
Ugbu a, Ifrem, gị na ọtụtụ ụmụ nwaanyị akwaala iko.*
Izrel emerụọla onwe ya.+
Ha amaghịkwa Jehova.
5 Ihe Izrel ji anya isi agbagidela ya akaebe.*+
Ma Izrel ma Ifrem adaala n’ihi mmehie ha.
Juda esorokwala ha daa.+
6 Ha chị ìgwè atụrụ ha na ìgwè ehi ha gaa ịchọ Jehova,
Ma ha achọtaghị ya.
Ọ hapụla ha.+
N’ime otu ọnwa, a ga-ebibi ha na ihe ndị ha ketara.*
8 Fụọnụ opi+ na Gibia, fụọkwanụ opi na Rema.+
Tienụ mkpu agha na Bet-even.+ Benjamin, anyị so gị n’azụ.
9 Ifrem, ihe a ga-eme gị n’ụbọchị a ga-ata gị ahụhụ ga-adị egwu.+
Emeela m ka ebo niile n’Izrel mata ihe ga-emerịrị.
10 Ndị isi Juda dị ka ndị na-ewela ihe e ji kpaa ókè ala azụ.+
M ga-awụsa ha iwe m dị ka mmiri.
11 E mekpaala Ifrem ahụ́. Ngwepịa e gwepịara ya kwesịrị ekwesị,
N’ihi na o kpebisiri ike iso onye iro ya.+
13 Mgbe Ifrem hụrụ ọrịa ọ na-arịa, Juda ahụkwa ọnyá nke dị ya n’ahụ́,
Ifrem gara Asiria+ zigara eze ukwu ndị ozi.
Ma ọ gwọlighị unu.
O melighịkwa ka ọnyá unu laa.
14 M ga-adị ka ọdụm n’anya Ifrem,
M ga-adịkwa ka ọdụm siri ike n’anya ndị Juda.
M ga-adọrisị ha.+ M ga-agakwa buru ha.
O nweghịkwa onye ga-anapụta ha.+
15 M ga-alaghachi ebe m si ruo mgbe ha ji isi ha buru ihe ha metara.
Ha ga-achọkwa ka m meere ha amara.*+
Mgbe ihe siiri ha ike, ha ga-achọ m.”+