Hosia
11 “Mgbe Izrel bụ nwata, m hụrụ ya n’anya.+
N’Ijipt ka m si kpọpụta nwa m.+
3 Ma, ọ bụ m kụziiri Ifrem otú e si aga ije,+ na-ekukwa ha n’aka.+
Ha amataghịkwa na mụ agwọọla ha.
4 M ji obiọma na ịhụnanya dọta ha n’ebe m nọ.*+
M dị ha ka onye na-ekopụ yok n’agba ha.
M jikwa nwayọọ wetara onye nke ọ bụla ihe oriri.
6 Mma agha ga-agazu obodo ya niile+
Wee bibie ihe ndị a tụchiri n’ụzọ ya, gbuokwa ha n’ihi atụmatụ ọjọọ ha.+
7 Ndị m ekpebiela na ha agaghị na-erubere m isi.+
N’agbanyeghị na a na-akpọ ha ịlaghachikwuru onye dị elu, o nweghị onye na-ebili.
8 Ifrem, olee otú m ga-esi gbahapụ gị?+
Izrel, olee otú m ga-esi rara gị nye?
Olee otú m ga-esi mee ka ị dịrị ka Adma?
Olee otú m ga-esi mee ka ị dịrị ka Zeboyim?+
Agbanweela m obi m.
9 Agaghị m ewesa unu iwe ọkụ.
Agaghị m ebibi Ifrem ọzọ,+
N’ihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ.
Abụ m Onye Nsọ nke nọnyeere unu.
Agaghịkwa m eji iwe bịakwute unu.
10 Ha ga-eso Jehova. Ọ ga-ebigbọkwa ka ọdụm.+
Ya bigbọọ, ụmụ ya ga-esi n’ebe ọdịda anyanwụ mara jijiji bịa.+
11 Ha ga-ama jijiji dị ka nnụnụ mgbe ha ga-esi n’Ijipt pụta.
Ha ga-esikwa n’Asiria pụta dị ka nduru.+
M ga-emekwa ka ha biri n’ụlọ ha.” Ọ bụ mụnwa bụ́ Jehova na-ekwu ihe a.+
Ma Juda ka so Chineke na-eje ije.
Ọ na-erubekwara Onye Kacha Nsọ isi.”+