Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 1 Ndị Eze 14
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ

      • Ahaịja buru amụma ihe ga-eme Jeroboam (1-20)

      • Rehoboam nọ na-achị Juda (21-31)

        • Shaịshak bịara lụso Jeruselem agha (25, 26)

1 Ndị Eze 14:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 11:30, 31

1 Ndị Eze 14:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 18:1; 1Sa 4:3

1 Ndị Eze 14:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “Lekwa lekwa ihe ị ga-agwa ya.”

1 Ndị Eze 14:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 11:30, 31; 12:20

1 Ndị Eze 14:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:16
  • +1Ez 15:5; Ọrụ 13:22

1 Ndị Eze 14:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 27:15; 2Ih 11:15
  • +Neh 9:26; Ọm 50:17

1 Ndị Eze 14:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 15:25-29

1 Ndị Eze 14:13

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Bịaruo Jehova Nso, p. 244

    Ụlọ Nche,

    7/1/2010, p. 29

    7/1/2005, p. 31

    4/1/1995, p. 12

1 Ndị Eze 14:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 15:25-29

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Amụma Aịsaịa I, p. 133-134

1 Ndị Eze 14:15

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 8:7-9; 29:28; Jos 23:15; 2Ez 17:6
  • +Di 28:64; 2Ez 15:29; 18:11
  • +Di 12:3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Amụma Aịsaịa I, p. 133-134

1 Ndị Eze 14:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:28-30; 13:33, 34

1 Ndị Eze 14:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 12:15; 13:3

1 Ndị Eze 14:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 13:20
  • +1Ez 15:25

1 Ndị Eze 14:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 78:68; 132:13
  • +Ọp 20:24; Di 12:5, 6; 1Ez 8:16, 17
  • +1Ez 11:1; 2Ih 12:13

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    12/15/2011, p. 10

1 Ndị Eze 14:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 11:7; 2Ih 12:1
  • +Aịz 65:2

1 Ndị Eze 14:23

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:1
  • +Aịz 65:7
  • +Di 12:2, 3; Aịz 57:5; Jer 2:20; Ho 4:13

1 Ndị Eze 14:24

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ndị na-agba akwụna n’ụlọ arụsị.” O nwere ike ịbụ na ịgba akwụna a bụ ụdị nke e ji efe chi dị iche iche.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 23:17, 18; 1Ez 15:11, 12; 22:46; 2Ez 23:7; Ho 4:14

1 Ndị Eze 14:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 11:40
  • +2Ih 12:2-4

1 Ndị Eze 14:26

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’obí.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 7:51; 15:18; 2Ez 18:14, 15; 24:12, 13
  • +1Ez 10:16, 17; 2Ih 12:9-11

1 Ndị Eze 14:27

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ndị ọgba ọsọ.”

1 Ndị Eze 14:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 27:24; 2Ih 12:15

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    3/15/2009, p. 32

1 Ndị Eze 14:30

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 15:6

1 Ndị Eze 14:31

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    A na-akpọkwa ya Abaịja.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 11:43
  • +1Ez 11:1; 2Ih 12:13
  • +1Ih 3:10; Mt 1:7

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

1 Eze 14:21Ez 11:30, 31
1 Eze 14:4Jos 18:1; 1Sa 4:3
1 Eze 14:71Ez 11:30, 31; 12:20
1 Eze 14:81Ez 12:16
1 Eze 14:81Ez 15:5; Ọrụ 13:22
1 Eze 14:9Di 27:15; 2Ih 11:15
1 Eze 14:9Neh 9:26; Ọm 50:17
1 Eze 14:101Ez 15:25-29
1 Eze 14:141Ez 15:25-29
1 Eze 14:15Di 8:7-9; 29:28; Jos 23:15; 2Ez 17:6
1 Eze 14:15Di 28:64; 2Ez 15:29; 18:11
1 Eze 14:15Di 12:3
1 Eze 14:161Ez 12:28-30; 13:33, 34
1 Eze 14:192Ih 12:15; 13:3
1 Eze 14:202Ih 13:20
1 Eze 14:201Ez 15:25
1 Eze 14:21Ọm 78:68; 132:13
1 Eze 14:21Ọp 20:24; Di 12:5, 6; 1Ez 8:16, 17
1 Eze 14:211Ez 11:1; 2Ih 12:13
1 Eze 14:221Ez 11:7; 2Ih 12:1
1 Eze 14:22Aịz 65:2
1 Eze 14:23Le 26:1
1 Eze 14:23Aịz 65:7
1 Eze 14:23Di 12:2, 3; Aịz 57:5; Jer 2:20; Ho 4:13
1 Eze 14:24Di 23:17, 18; 1Ez 15:11, 12; 22:46; 2Ez 23:7; Ho 4:14
1 Eze 14:251Ez 11:40
1 Eze 14:252Ih 12:2-4
1 Eze 14:261Ez 7:51; 15:18; 2Ez 18:14, 15; 24:12, 13
1 Eze 14:261Ez 10:16, 17; 2Ih 12:9-11
1 Eze 14:291Ih 27:24; 2Ih 12:15
1 Eze 14:301Ez 15:6
1 Eze 14:311Ez 11:43
1 Eze 14:311Ez 11:1; 2Ih 12:13
1 Eze 14:311Ih 3:10; Mt 1:7
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
1 Ndị Eze 14:1-31

Ndị Eze nke Mbụ

14 N’oge ahụ, Abaịja nwa Jeroboam dara ọrịa. 2 N’ihi ya, Jeroboam sịrị nwunye ya: “Biko, bilie jigharịa ejiji ka a ghara ịmata na ị bụ nwunye m, gaakwa Shaịlo. Ahaịja onye amụma nọ ebe ahụ. Ọ bụ ya gwara m na m ga-abụ eze ndị a.+ 3 Werekwa ogbe achịcha iri na keeki ndị a ghasara ihe n’elu nakwa otu karama mmanụ aṅụ gakwuru ya. Ọ ga-agwazi gị ihe ga-eme nwa anyị nwoke.”

4 Nwunye Jeroboam mere ihe o kwuru. O biliri gawa Shaịlo,+ rute n’ụlọ Ahaịja. Ma, anya Ahaịja anaghịzi emegharị emegharị, ọ naghịkwa ahụ ụzọ n’ihi na o meela agadi.

5 Ma Jehova gwara Ahaịja, sị: “Nwunye Jeroboam na-abịa ịjụ gị ase banyere nwa ya nwoke na-arịa ọrịa. M ga-agwa gị ihe ị ga-agwa ya.* Ya rute, ọ ga-eme ka a ghara ịmata onye ọ bụ.”

6 Ozugbo Ahaịja nụrụ ụda ụkwụ ya ka ọ na-abata n’ọnụ ụzọ, ọ sịrị ya: “Nwunye Jeroboam, batawa. Gịnị mere i ji na-eme ka a ghara ịmata onye ị bụ? O nwere ozi ọjọọ Chineke sị m zie gị. 7 Lawa, gwa Jeroboam, sị, ‘Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, sị: “N’ime ndị obodo unu niile, m họọrọ gị ka ị na-edu ndị Izrel bụ́ ndị m.+ 8 M napụtara ezinụlọ Devid alaeze ha na-achị ma nye gị ya.+ Ma, ị dịghị ka Devid ohu m, onye debere iwu m, jiri obi ya niile soro m, meekwa naanị ihe ziri ezi n’anya m.+ 9 Kama ị bịara na-eme ihe ọjọọ karịa ndị niile bu gị ụzọ. I meere onwe gị chi ọzọ, ya bụ, arụsị ndị a kpụrụ akpụ, iji kpasuo m iwe.+ Ị gbakụtakwara m azụ.+ 10 Ọ bụ ya mere m ga-eji mee ka ọdachi dakwasị ezinụlọ gị. M ga-egbukwa nwa nwoke ọ bụla si n’ezinụlọ gị, ma onye na-enweghị onye na-enyere ya aka ma onye na-enweghị ume n’Izrel. M ga-ekpochapụkwa ndị ezinụlọ Jeroboam+ otú mmadụ si ekpopụ nsị anụmanụ ruo mgbe o kpopụchara ya. 11 Onye ezinụlọ Jeroboam ọ bụla nke nwụrụ n’obodo, nkịta ga-eri ozu ya, onye nke nwụrụ n’ọhịa, nnụnụ ga-eri ozu ya, n’ihi na Jehova ekwuola ya.”’

12 “Ugbu a, bịa lawa n’ụlọ gị. Ụkwụ gị kpahaala n’obodo unu, nwa ahụ ga-anwụ. 13 Ndị Izrel niile ga-eruru ya uju ma lie ya. Naanị ya ka a ga-eli eli n’ime ndị ezinụlọ Jeroboam, n’ihi na a bịa n’ezinụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị ya ka Jehova bụ́ Chineke Izrel hụrụ ihe dị mma n’obi ya. 14 Jehova ga-eme ka e nwee eze ga-achị Izrel, onye ga-ebibi ndị ezinụlọ Jeroboam+ mgbe oge ruru. O nwedịrị ike ime ya ugbu a. 15 Jehova ga-ebibikwa ndị Izrel, ha adị ka ahịhịa amị na-aṅagharị na mmiri. Ọ ga-efopụkwa ndị Izrel n’ọmarịcha ala a o nyere ndị nna nna ha.+ Ọ ga-achụsasịkwa ha, chụrụ ha gafee Osimiri Yufretis,+ n’ihi na ha mere ogwe osisi arụsị* ha na-efe,+ na-akpasu Jehova iwe. 16 Ọ ga-agbahapụkwa ndị Izrel n’ihi mmehie niile Jeroboam mere, ndị mekwara ka ndị Izrel mehie.”+

17 Nwunye Jeroboam wee lawa, lọrute Teza. Mgbe o ruru n’ọnụ ụzọ ụlọ ha, nwa ha nwoke ahụ nwụrụ. 18 Ha wee lie ya, ndị Izrel niile eruokwara ya uju, otú Jehova si n’ọnụ ohu ya, bụ́ Ahaịja onye amụma, kwuo.

19 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jeroboam, ma otú o si lụọ agha+ ma otú o si chịa, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 20 Jeroboam chịrị afọ iri abụọ na abụọ, mechaakwa nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ.+ Nedab nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.+

21 N’oge ahụ, Rehoboam nwa Solomọn malitere ịchị na Juda. Rehoboam dị afọ iri anọ na otu mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jeruselem, bụ́ obodo Jehova họọrọ+ n’ime ebo niile n’Izrel ka a nọrọ na-eto aha ya.+ Aha nne Rehoboam bụ Neama. Ọ bụ nwaanyị Amọn.+ 22 Ndị Juda nọkwa na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+ Ihe ọjọọ ha mere kpasukwara ya iwe karịa otú ihe ọjọọ ndị nna nna ha mere kpasuru ya.+ 23 Hanwa nọkwa na-arụ ebe ndị dị elu, ogidi arụsị, na ogwe osisi arụsị*+ n’ugwu ọ bụla dị elu+ nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko.+ 24 E nwekwara ụmụ nwoke bụ́ ndị akwụna* n’ala a.+ Ndị a niile na-akpa ụdị arụ niile mba ndị Jehova chụpụrụ n’ihi ndị Izrel na-akpa.

25 N’afọ nke ise n’ọchịchị Rehoboam, Shaịshak+ eze Ijipt bịara lụso Jeruselem agha.+ 26 O bukọọrọ akụ̀ dị n’ụlọ Jehova nakwa akụ̀ dị n’ụlọ* eze.+ O buuru ihe niile, ma ọta ọlaedo niile Solomọn rụrụ.+ 27 Eze Rehoboam wee were ọla kọpa rụọ ọta ọ ga-eji dochie ha. O nyefekwara ha n’aka ndị isi ndị nche,* ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọ eze nche. 28 Mgbe ọ bụla eze bịara n’ụlọ Jehova, ndị nche ahụ na-abata buru ha. Ha na-emechakwa bughachi ha n’ụlọ ndị nche.

29 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Rehoboam na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda.+ 30 Rehoboam na Jeroboam nọkwa na-alụ agha oge niile.+ 31 N’ikpeazụ, Rehoboam nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ. E likwara ya n’ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid.+ Aha nne ya bụ Neama, nwaanyị Amọn.+ Abaịjam* nwa ya+ nọchiri ya, malite ịchị.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya