Jeremaya
18 Jehova gwara Jeremaya okwu, sị: 2 “Bịa gaa n’ụlọ ọkpụite.+ I ruo, m ga-agwa gị okwu ebe ahụ.”
3 M wee gawa n’ụlọ ọkpụite, rute, ya abụrụ na o ji wiil e ji akpụ ite na-akpụ ite. 4 Ma, aka ọkpụite ahụ mebiri arịa o ji ụrọ na-akpụ. N’ihi ya, o ji ya kpụọ ụdị arịa ọzọ otú dị ya mma n’anya.*
5 Jehova gwaziri m, sị: 6 “‘Ndị Izrel, ọ̀ bụ na mụ enweghị ike ime unu ihe ọkpụite a mere? Otú ahụ ụrọ dị n’aka ọkpụite ka ununwa, bụ́ ndị Izrel, dị n’aka m.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 7 ‘Mgbe ọ bụla m kwuru na m ga-efopụ mba ọ bụla ma ọ bụ alaeze ọ bụla, kwuokwa na m ga-akwatu ya ma bibie ya,+ 8 mba ahụ wee hapụ ihe ha na-eme nke m kwuru na ọ dịghị mma, m ga-agbanwe obi m gbasara ọdachi ahụ m bu n’obi ime ka ọ dakwasị ha.+ 9 Ma, mgbe ọ bụla m kwuru na m ga-akụ mba ma ọ bụ alaeze ka osisi, meekwa ka ọ kwụsie ike, 10 ha abịa mee ihe dị njọ n’anya m, nupụkwara m isi, m ga-agbanwe obi m gbasara ihe ọma m bu n’obi imere ha.’
11 “Ugbu a, biko, gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “M na-akwadebere unu ọdachi, na-echekwa echiche ihe m ga-eme unu. Biko, ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme. Mewenụ ihe dị mma, na-akpakwanụ àgwà ọma.”’”+
12 Ma ha sịrị: “Ọ baghị uru!+ N’ihi na anyị ga na-eme uche anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-akpọ ekwo nkụ na-eme ihe ọjọọ dị ya n’obi.”+
13 Jehova ji maka ihe a kwuo, sị:
“Biko, jirinụ ọnụ unu jụọ mba dị iche iche ajụjụ.
Ònye nụtụrụla ụdị ihe a?
Ndị Izrel* emeela ihe jọgburu onwe ya.+
14 Snoo nke na-ada na Lebanọn ọ̀ ga-akwụsị ịdị n’elu oké nkume ndị dị n’ebe ndị kpọdara akpọda?
Ka mmiri jụrụ oyi, nke na-asọ asọ, si na Lebanọn ọ̀ ga-ata?
Ha na-achụrụ chi dị iche iche na-abaghị uru àjà.+
Ha na-emekwa ka ndị mmadụ na-ada ka ha na-aga n’ụzọ ha, bụ́ ụzọ dịwara kemgbe oge ochie.+
Ha na-eme ihe a ka ndị ahụ soro okporo ụzọ ọzọ na-adịghị larịị.*
16 Ndị m na-eme ihe a ka ala ha na-emenye ndị ga-ahụ ya ụjọ,+
Ha ana-afụkwa mkpọrọhịhị ruo mgbe ebighị ebi.+
Onye ọ bụla nke si na ya na-agafe ga-ekporopụ anya na-ele ya, fufeekwa n’isi.+
17 M ga-achụsasị ha n’ihu ndị iro ha otú ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ si efesasị ihe.
M ga-agbakụta ha azụ. Agaghị m eche ha ihu n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ha.”+
18 Ma ha sịrị: “Bịanụ ka anyị chepụta ihe anyị ga-eme Jeremaya,+ n’ihi na ọ bụ ndị nchụàjà anyị ga na-agwa anyị ihe iwu kwuru.* Ọ bụ ndị ma ihe ga na-adụ anyị ọdụ. Ọ bụkwa ndị amụma ga na-agwa anyị ihe Chineke kwuru. Bịanụ ka anyị kwuo okwu ọjọọ gbasara Jeremaya,* ka anyị gharakwa ịṅa ntị n’ihe ọ bụla ọ na-ekwu.”
19 Jehova, biko, ṅaa m ntị,
Nụrụkwa ihe ndị na-emegide m na-ekwu.
20 È kwesịrị iji ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma?
N’ihi na ha egwuorola m* olulu ka m daba nwụọ.+
Cheta otú m si guzoro n’ihu gị kwuo ihe ọma banyere ha,
Iji mee ka ị kwụsị iwesa ha iwe.
21 N’ihi ihe a ha mere, hapụ ụmụ ha ka agụụ gụgbuo ha.
Hapụkwa ha na ụmụ ha ka e jiri mma agha gbuo ha.+
Ka ndị nwunye ha gbara aka ụmụ, ghọọkwa ụmụ nwaanyị isi mkpe.+
Ka ajọ ọrịa gbuo ụmụ nwoke ha.
Ka e jirikwa mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha n’agha.+
22 Ka a nụ mkpu ákwá n’ụlọ ha
Mgbe ị ga-eme ka ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga bịakwute ha na mberede.
N’ihi na ha egwuola olulu ka ha jide m,
Siekwa ọnyà ka ọ ma m n’ụkwụ.+
Agbagharala ha njehie ha.
Ehichapụkwala mmehie ha.