Samuel nke Mbụ
8 Mgbe Samuel mere agadi, ọ họpụtara ụmụ ya ndị nwoke ka ha bụrụ ndị ikpe ndị Izrel. 2 Aha ọkpara ya bụ Joel. Aha nwa ya nwoke nke abụọ bụ Abaịja.+ Ha nọ na Bia-shiba na-ekpe ikpe. 3 Ma, ụmụ ya anaghị eme ka ya. Ha nọ na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru,+ na-ana aka azụ,*+ na-ekpekwa ikpe arụrụala.+
4 Ka oge na-aga, ndị okenye niile n’Izrel zukọtara wee bịakwute Samuel na Rema. 5 Ha sịrị ya: “I meela agadi, ma ụmụ gị anaghị eme ka gị. Họpụtara anyị eze ga na-ekpere anyị ikpe otú mba niile ọzọ na-eme.”+ 6 Ma, obi adịghị Samuel mma maka na ha sị ya họpụtara ha eze ga na-ekpere ha ikpe. Samuel wee kpee ekpere gwa Jehova ihe a. 7 Jehova asị Samuel: “Mee ihe niile ha na-agwa gị. Ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ m ka ha jụrụ ka m ghara ịbụ eze ha.+ 8 Otu ihe ahụ ha na-eme m kemgbe m si n’Ijipt kpọpụta ha ruo taa ka ha na-emekwa gị. Ha na-ahapụ m+ gaa na-efe chi ọzọ dị iche iche.+ 9 Mee ihe ha kwuru. Ma, dọsie ha aka ná ntị ike, gwakwa ha ihe eze ga na-achị ha nwere ikike ịgwa ha ka ha na-emere ya.”
10 Samuel wee gwa ndị ahụ na-achọ ka ọ họpụtara ha eze ihe niile Jehova kwuru. 11 Ọ sịrị: “Ihe a ka eze ga na-achị unu nwere ikike ime:+ Ọ ga-akpọrọ ụmụ unu ndị nwoke,+ ha abụrụ ndị agha ga na-agba ụgbọ ịnyịnya ya,+ na-agbakwa ịnyịnya ya.+ Ụfọdụ ga na-agbakwa ọsọ n’ihu ụgbọ ịnyịnya ya. 12 Ọ ga-ahọpụtakwara onwe ya ndị isi agha ga na-edu otu puku otu puku ndị agha+ na ndị nke ga na-edu ndị agha iri ise iri ise.+ Ọ ga-ahọpụtakwa ụfọdụ ka ha na-akọrọ ya ubi,+ na-ewekwara ya ihe ubi,+ na-akpụkwara ya ngwá agha na ngwá ụgbọ ịnyịnya.+ 13 Ọ ga-akpọrọ ụmụ unu ndị nwaanyị ka ha na-esi mmanụ otite,* na-esi nri, na-emekwa achịcha.+ 14 Ọ ga-enye ndị na-ejere ya ozi ala unu ndị kacha mma na ubi vaịn unu ndị kacha mma nakwa ubi oliv unu ndị kacha mma.+ 15 Ọ ga-enye ndị na-eje ozi n’obí ya nakwa ndị na-ejere ya ozi otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe unu wetara n’ubi ọka wit unu nakwa n’ubi vaịn unu. 16 Ọ ga-akpọrọ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị na-ejere unu ozi, kpụrụkwa ehi unu ndị kacha mma, na jakị unu. Ọ ga-ejikwa ha na-arụ ọrụ ya.+ 17 Ọ ga-akpụrụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ìgwè ewu na atụrụ unu.+ Unu ga na-agbakwara ya ohu. 18 Otu ụbọchị, unu ga-eti mkpu, beekwa ákwá n’ihi ihe eze unu ji aka unu họrọ na-eme unu,+ ma Jehova agaghị atụpụrụ unu ọnụ.”
19 Ma, ndị Izrel jụrụ ige Samuel ntị. Ha sịrị: “Nsogbu adịghị. Anyị chọrọ eze ga na-achị anyị. 20 Anyị ga-adịzi ka mba niile ọzọ. Eze anyị ga na-ekpere anyị ikpe, na-edukwa anyị ma na-alụrụ anyị agha.” 21 Mgbe Samuel nụchara ihe niile ha kwuru, ọ gwara ya Jehova. 22 Jehova asị Samuel: “Mee ihe ha kwuru, họpụtakwara ha eze ga na-achị ha.”+ Samuel wee sị ndị Izrel: “Onye ọ bụla n’ime unu laa n’obodo ya.”