Job
2 “Olee mgbe ị ga-akwụsị ikwu okwu otú a?+
Okwu si gị n’ọnụ apụta bụ naanị oké ifufe.
3 Chineke ọ̀ ga-ekpe ikpe na-ezighị ezi,
Ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọ̀ ga-eme ihe na-adịghị mma?
4 Ọ bụrụ na ụmụ gị mehiere ya,
Ọ hapụrụ ha ka a taa ha ahụhụ maka nnupụisi ha.
5 Ma ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi,+
Rịọkwa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka o meere gị amara,
6 Ọ bụrụkwa eziokwu na ị na-eme ezi omume ma na-akwụwa aka ọtọ,+
Ọ ga-elebara gị anya
Ma mee ka ihe dịrị gị ná mma otú ọ dịbuuru gị.
9 N’ihi na ọ ka bụ ụnyaahụ ka a mụrụ anyị, e nweghịkwa ihe anyị ma,
N’ihi na anyị anaghị adịte ndụ aka.*
10 Ọ̀ bụ na ha agaghị akụziri gị ihe,
Kọọkwara gị ihe ha ma?
11 Ahịhịa papaịrọs ọ̀ ga-eto ogologo n’ebe mmiri na-anaghị adọ?
Ahịhịa amị ọ̀ ga-eto ogologo ma ọ bụrụ na mmiri adịghị?
12 Ọ ga-ebu ahịhịa ọ bụla ụzọ kpọọ nkụ
Mgbe ọ na-amabeghị ifuru, mgbe a na-akajipụbeghị ya.
13 Ọ bụ ihe a ga-eme ndị niile na-echefu Chineke,
N’ihi na ihe onye na-anaghị asọpụrụ Chineke* na-ele anya ya agaghị enwe isi,
14 Bụ́ onye chekwubere ihe na-enweghị isi,
Onye tụkwasịkwara obi n’ihe na-esighị ike ka ọnyà* ududo.
15 Ọ ga-adabere n’ụlọ ya, ma ụlọ ya ga-adakasị.
Ọ ga-agbalị ka o jide ụlọ ya aka, ma ọ gaghịzi adị.
17 Ọ gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’ikpo nkume.
Ọ na-eji ebe nkume juru emere ụlọ ya.
19 N’eziokwu, ọ bụ otú a ka ọ ga-esi funyụọ anya.+
Osisi ndị ọzọ ga-esizi n’ájá pulite nọchie ya.
20 O doro anya na Chineke agaghị ajụ ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta,*
Ọ gaghịkwa akwado ndị ọjọọ,*
21 N’ihi na ọ ka ga-eme ka ọchị ju gị n’ọnụ,
Meekwa ka ọnụ gị na-eti naanị mkpu ọṅụ.
22 A ga-eyiwe ndị kpọrọ gị asị ihere ka uwe.
Ụlọikwuu ndị ajọ omume agaghịzi adị.”