Job
11 Zofa+ onye Neama kwuru, sị:
2 “À ga-ahapụ ịza gị ihe a niile ị na-ekwu,
Ka ọtụtụ okwu ọ̀ ga-eme ka ị bụrụ onye ezi omume?
3 Okwu na-abaghị uru ị na-ekwu ọ̀ ga-eme ka ndị mmadụ mechie ọnụ?
Ọ̀ bụ na e nweghị onye ga-abara gị mba maka okwu mkparị ị na-ekwu?+
6 Ọ gaara eme ka ị mata ihe nzuzo ndị ga-eme ka ị mara ihe,
N’ihi na onye ma ihe n’eziokwu na-aghọta ọtụtụ ihe.
Ị gaara amata na Chineke chefuru ụfọdụ mmehie gị.
7 Ị̀ ga-achọpụtali amamihe Chineke nke dị omimi?
Ka ị̀ ga-achọpụtali ihe niile banyere Onye Pụrụ Ime Ihe Niile?
8 Ọ dị elu karịa eluigwe. Gịnị ka ị ga-emeli?
O miri emi karịa ili.* Gịnị ka ị ga-amatali?
9 O buru ibu karịa ụwa,
Saakwa mbara karịa oké osimiri.
10 Ọ bụrụ na ọ gafee jichie mmadụ, kpọọkwa onye ahụ ikpe,
Ònye ga-akwụsịli ya?
11 N’ihi na ọ ma mgbe ndị mmadụ na-aghọ aghụghọ.
Ọ hụ ihe ọjọọ, ọ̀ bụ na ọ gaghị ama?
12 Ma, ọ bụ naanị mgbe jakị ọhịa ga-amụtali mmadụ
Ka onye na-anaghị eche echiche ga-aghọta ihe.
13 Ọ dị m ka ya bụrụ na ị ga-edozi obi gị
Ma gbasapụ aka gị rịọ Chineke arịrịọ.
14 Ọ bụrụ na ị na-etinye aka n’ihe ọjọọ, sepụ aka na ya,
Ekwekwala ka a na-eme ihe ọjọọ n’ụlọikwuu gị.
15 Ị ga-enwezi ike iwelite ihu gị elu n’emeghị ihere,
Ị ga-akwụsili ike n’atụghị egwu.
16 Ị ga-echefuzi nsogbu gị.
Ị ga-echefu ya ka mmiri sọfere asọfe.
17 Ndụ gị ga-enwu gbaa karịa etiti ehihie.
Ọchịchịrị ya ga-adị ka ụtụtụ.
18 Ị ga-enwe obi ike maka na i nwere olileanya,
Ị ga-elegharịkwa anya ma dinara ala, obi eruo gị ala.
19 E nweghị onye ga-emenye gị ụjọ ma i dinara ala,
Ọtụtụ ndị ga-achọkwa ka gị na ha dị ná mma.
20 Ma anya ndị ajọ omume agaghị ahụ ụzọ.
Ha agaghị ahụ ebe ha ga-agbaga ka e chebe ha.
Naanị olileanya ha ga-enwe bụ ọnwụ.”+