Abụ Ọma
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ọma Devid.
14 Ndị nzuzu* na-asị n’obi ha:
“Jehova adịghị.”+
Ha na-eme omume rụrụ arụ, na-emekwa ihe ọjọọ dị iche iche.
E nweghị onye na-eme ihe dị mma.+
2 Ma Jehova si n’eluigwe na-ele ndị mmadụ anya
Ka ọ hụ ma è nwere onye na-aghọta ihe, ma è nwere onye na-achọ Jehova.+
3 Ha niile akwụsịla ime ihe dị mma.+
Ha niile rụrụ arụ.
E nweghị onye na-eme ihe dị mma,
E nweghịdị otu onye.
4 Ọ̀ bụ na e nweghị onye na-aghọta ihe n’ime ndị na-eme ihe ọjọọ?
Ha na-eri ndị m ka à ga-asị na ha na-eri nri.*
Ha anaghị efe Jehova.
6 Unu ndị ajọ omume na-agbalị ka unu mebie atụmatụ nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,
Ma Jehova bụ ebe mgbaba ya.+
7 Ọ dị m ka ya bụrụ na a ga-esi na Zayọn zọpụta ndị Izrel.+
Ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka ndị Izrel nweekwa obi ụtọ
Mgbe Jehova ga-akpọlata ndị ya a dọọrọ n’agha.