Abụ Ọma
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid.
109 Chineke, onye m na-eto,+ biko, agbachizila nkịtị.
2 N’ihi na onye ajọ omume na onye aghụghọ na-akatọ m.
Ha na-ekwu okwu ụgha banyere m.+
3 Ha na-agba m gburugburu, na-agwa m okwu ọjọọ.
Ha na-alụsokwa m ọgụ n’enweghị ihe m mere ha.+
4 Ha na-emegide m n’agbanyeghị na m hụrụ ha n’anya.+
Ma, m ka na-ekpe ekpere.
6 Mee ka onye ajọ omume chịwa onye iro m.*
Ka onye ga-emegide ya* guzoro n’aka nri ya.
7 Ka ikpe ma ya mgbe a na-ekpe ya ikpe.
Ka e were ekpere ọ na-ekpe ka ihe ọjọọ.+
Ka onye ọzọ rụwa ọrụ* ọ na-arụbu.+
9 Ka ụmụ ya bụrụ ụmụ na-enweghị nna,
Ka nwunye ya bụrụkwa nwaanyị di ya nwụrụ.
10 Ka ụmụ ya na-akpagharị na-arịọ arịrịọ,
Ka ha si n’ụlọ ha dakpọsịrị adakpọsị gaa na-achọgharị ihe ha ga-eri.
11 Ka onye o ji ụgwọ bukọrọ ihe niile o nwere,
Ka ndị ala ọzọ kwakọrọ ngwongwo ya.
12 Ka a ghara inwe onye ga-emere ya ihe ọma,
Ka a gharakwa inwe onye ga-emere ụmụ ya, bụ́ ụmụ na-enweghị nna, amara.
Ka a ghara icheta aha ha n’ọgbọ na-abịa abịa.
15 Ka Jehova na-echeta ihe ha mere mgbe niile.
Ka e chefuokwa aha ha n’ụwa.+
16 N’ihi na o chetaghị imere ndị ọzọ ihe ọma,+
Kama ọ nọ na-achụ ogbenye a na-emegbu emegbu,+ nke obi gbawara,
Ka o gbuo ya.+
17 A bụrụ ya ọnụ maka na ọ na-atọ ya ụtọ ịbụ ndị ọzọ ọnụ.
A gọzighị ya maka na ọ naghị achọ ịgọzi ndị ọzọ.
18 Ọnụ a bụrụ ya zuru ya ahụ́ otú uwe si ekpuchi mmadụ ahụ́.
Ọ banyere ya n’ahụ́ otú mmiri si abanye mmadụ n’ahụ́,
Banyekwa ya n’ọkpụkpụ ka mmanụ.
19 Ka ọnụ a bụrụ ya zuo ya ahụ́ otú uwe ya si ekpuchi ya ahụ́,+
Ka ọ dịkwa ka ájị̀ ọ na-eke mgbe niile.
Napụta m n’ihi na ịhụnanya gị* dị mma.+
23 Ndụ m na-agbada n’ike n’ike ka onyinyo ji nwayọọ nwayọọ apụ mgbe anwụ na-ada.
E fechapụla m otú e si efechapụ igurube.
24 Ikpere na-amazi m jijiji n’ihi ọnụ m na-ebu.
Ataala m ahụ́, ike na-agwụkwa m.
Ha hụ m, ha ana-efufe isi.+
26 Jehova Chineke m, biko, nyere m aka.
Zọpụta m n’ihi ịhụnanya gị.*
27 Ka ha mara na ihe a si n’aka gị,
Na ọ bụ gịnwa, bụ́ Jehova, mere ya.
28 Ha ga-abụ m ọnụ, ma ị ga-agọzi m.
Ka e menye ha ihere mgbe ha ga-ebili ka ha mesie m ike,
Ma ka ohu gị ṅụrịa ọṅụ.
29 Ka e mechuo ndị na-emegide m ihu.
Ka ihere jukwa ha ihu ka à ga-asị na e ji uwe kpuchie ha.+
30 M ga-eji ọnụ m too Jehova nke ukwuu.
M ga-anọ n’ihu ọtụtụ ndị too ya.+