Jenesis
29 Mgbe e mechara, Jekọb bidokwara ije ya ma gawa n’ala ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ. 2 N’ebe ahụ, ọ hụrụ otu olulu mmiri nke dị n’ọhịa, hụkwa ka ìgwè atụrụ atọ makpu n’akụkụ olulu mmiri ahụ maka na ọ bụ n’olulu mmiri ahụ ka ndị na-azụ atụrụ si enweta mmiri ha na-enye ìgwè anụ ha. E nwere nnukwu nkume e ji dọchie ọnụ olulu mmiri ahụ. 3 Ọ na-abụ a chịkọtachaa ìgwè anụ niile n’ebe ahụ, ndị na-azụ atụrụ na-akwapụ nkume ahụ e ji dọchie ọnụ olulu mmiri ahụ ma nye ìgwè anụ ha mmiri. Ha ṅụchaa, ndị na-azụ atụrụ na-akwaghachi nkume ahụ n’ọnụ olulu mmiri ahụ.
4 Jekọb sịrị ha: “Ụmụnne m, ebee ka unu si?” Ha sịrị ya: “Anyị si Heran.”+ 5 O wee jụọ ha, sị: “Ùnu ma Leban+ nwa nwa Nehọ?”+ ha asị ya: “Anyị ma ya.” 6 O wee jụọ ha, sị: “Ahụ́ ọ̀ dịkwa ya?” Ha sịrị ya: “Ahụ́ dị ya. Lekwa Rechel nwa ya+ ka o du atụrụ na-abịa.” 7 Ọ sịziri ha: “Ihe a ka bụ ehihie. Oge e ji achịkọta anụ ụlọ erubeghị. Nyenụ atụrụ ndị a mmiri, unu akpọrọzie ha gaa ebe ha ga-ata ahịhịa.” 8 Ha wee sị ya: “A naghị ekwe ka anyị mee otú ahụ ruo mgbe a chịkọtachara ìgwè anụ niile, a kwapụzie nkume n’ọnụ olulu mmiri. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ga-enye atụrụ mmiri.”
9 Ka ha na Jekọb nọ na-ekwu okwu, Rechel du atụrụ nna ya bịa, maka na ọ bụ nwaanyị na-azụ atụrụ. 10 Mgbe Jekọb hụrụ Rechel nwa Leban nwanne mama ya nakwa atụrụ Leban, Jekọb gara ozugbo kwapụ nkume ahụ e ji dọchie ọnụ olulu mmiri ahụ ma nye atụrụ Leban nwanne mama ya mmiri. 11 Jekọb susuru Rechel ọnụ* ma bewe ezigbo ákwá. 12 Jekọb wee gwawa Rechel na ya bụ onye ikwu* nna ya nakwa na ya bụ nwa Ribeka. Rechel gbaara ọsọ gaa kọọrọ nna ya.
13 Ozugbo Leban+ nụrụ banyere Jekọb nwa nwanne ya nwaanyị, ọ gbaara ọsọ gakwuru ya n’ebe ọ nọ. Ọ makụrụ ya, susuo ya ọnụ* ma kpọbata ya n’ụlọ ya. Jekọb wee kọọrọ Leban ihe niile merenụ. 14 Leban sịrị ya: “N’eziokwu, mụ na gị bụ otu ọbara.”* Ya na ya wee bie otu ọnwa zuru ezu.
15 Leban sịziri Jekọb: “Ị̀ ga-ejere m ozi n’efu naanị maka na ị bụ onye ikwu* m?+ Gwa m ihe m ga-eji kwụọ gị ụgwọ?”+ 16 Leban mụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Aha nke okenye bụ Lia, aha nke nta abụrụ Rechel.+ 17 Anya Lia amaghị mma, ma Rechel mara mma ahụ́, maakwa mma ihu. 18 Jekọb hụrụ Rechel n’anya. N’ihi ya, ọ sịrị: “Achọrọ m ijere gị ozi afọ asaa maka Rechel nwa gị nwaanyị nke nta.”+ 19 Leban wee sị ya: “Ọ kaara m mma ịkpọnye gị ya kama ịkpọnye ya nwoke ọzọ. Biri n’ụlọ m.” 20 Jekọb wee jeere Leban ozi afọ asaa maka Rechel.+ Ma n’anya ya, ọ dị ka ụbọchị ole na ole n’ihi otú o si hụ Rechel n’anya.
21 Jekọb sịziri Leban: “Kpọnye m nwunye m n’ihi na oge anyị kwuru ezuola, ka mụ na ya nwee mmekọahụ.” 22 Leban wee kpọkọta ndị* niile bi n’ebe ahụ ma mee oriri. 23 Ma ná mgbede, ọ kpọọrọ ada ya Lia kpọgara Jekọb ka ya na ya nwee mmekọahụ. 24 Leban kpọkwaara Zilpa, bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi, kpọnye Lia ka o jewere ya ozi.+ 25 N’ụtụtụ, Jekọb hụrụ na ọ bụ Lia ka a kpọnyere ya. N’ihi ya, ọ sịrị Leban: “Gịnị bụkwanụ ihe a i mere m? Ọ̀ bụ na ọ bụghị maka Rechel ka m ji jeere gị ozi? Gịnịzi mere i ji ghọọ m aghụghọ?”+ 26 Leban wee sị ya: “N’omenala anyị, a naghị ebu ụzọ eke nwa agbọghọ nke nta di tupu nke ada. 27 Mechagodị ememme e kwesịrị imere Lia n’izu a. E mechaa, a ga-akpọnyekwu gị nwanne ya nwaanyị maka ozi ị ga-ejere m afọ asaa ọzọ.”+ 28 Jekọb mere otú ahụ. O meere Lia ememme e kwesịrị imere ya n’izu ahụ. Mgbe e mechara, Leban kpọnyere ya Rechel nwa ya ka ọ bụrụ nwunye ya. 29 Leban kpọkwaara Bilha,+ bụ́ nwaanyị na-ejere ya ozi, kpọnye Rechel nwa ya ka o jewere ya ozi.+
30 Jekọb na Rechel nwekwara mmekọahụ. O wee hụ Rechel n’anya karịa Lia, o jekwaara Leban ozi afọ asaa ọzọ.+ 31 Mgbe Jehova hụrụ na Jekọb ahụghị Lia n’anya,* o mere ka o nwee ike ịdị ime.*+ Ma Rechel bụ nwaanyị aga.+ 32 Lia wee dị ime ma mechaa mụọ nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Ruben*+ maka na ọ sịrị: “Ọ bụ maka na Jehova ahụla nsogbu m nọ na ya,+ n’ihi na di m ga-ebidozi hụwa m n’anya.” 33 O wee dị ime ọzọ mụọ nwa nwoke ma sị: “Ọ bụ maka na Jehova egeela m ntị wee nyekwa m nwa a maka na di m ahụghị m n’anya.” Ọ gụrụ ya Simiọn.*+ 34 Ọ dịkwara ime ọzọ ma mụọ nwa nwoke wee sị: “Ugbu a, di m ga-arapara m n’ahụ́ maka na m mụọrọla ya ụmụ nwoke atọ.” N’ihi ya, a gụrụ ya Livaị.*+ 35 O wee dị ime ọzọ mụọ nwa nwoke ma sị: “Ugbu a, m ga-eto Jehova.” N’ihi ya, ọ gụrụ ya Juda.*+ Mgbe ọ mụchara ya, ọ kwụsịrị ịmụ nwa.