Ezikiel
4 “Gịnwa bụ́ nwa nke mmadụ, buru otu brik busa n’ihu gị, seekwa obodo a bụ́ Jeruselem n’elu ya. 2 Mee ka à ga-asị na ị na-anọchibido ya.+ Rụọ mgbidi gburugburu ya iji nọchibido ya.+ Jiri ájá rụọ mgbidi gburugburu ya.+ Maa ụlọikwuu gburugburu ya, busakwa ihe e ji akwatu mgbidi gburugburu ya.+ 3 Were ite ígwè e ji eghe ihe, dowekwa ya ka ọ bụrụ mgbidi ígwè n’agbata gị na obodo ahụ. Chee ya ihu, a ga-anọchibidokwa ya. Ọ bụ gị ga-anọchibido ya. Ndị Izrel ga-eji ya mara na e nwere ihe na-aga ime.+
4 “I mechaa ya, jiri akụkụ aka ekpe gị dinara ala, burukwa mmehie ndị Izrel.+ Ị ga-eburu mmehie ha n’ụbọchị niile ị ga-edina otú ahụ. 5 Ị ga-edina otú ahụ narị ụbọchị atọ na iri itoolu (390), ka ọ daba n’afọ ole ha mehiere.+ Ị ga-eburukwa mmehie ndị Izrel. 6 Ị nọzuo ụbọchị ole ahụ,
“Jirizie akụkụ aka nri gị dinara na nke ugboro abụọ. Ị ga-eburukwa mmehie ndị Juda+ ruo ụbọchị iri anọ, otu ụbọchị maka otu afọ. Ọ bụ m kpebiri na otu ụbọchị ga-anọchi anya otu afọ. 7 Chee ihu ebe ahụ ị nọchibidoro Jeruselem,+ pịa aka uwe gị ka a na-ahụ aka gị, buokwa amụma ihe a ga-eme Jeruselem.
8 “M ga-eke gị ụdọ ka ị ghara ịtụgharị si n’otu akụkụ gị gaa n’akụkụ gị nke ọzọ ruo mgbe ụbọchị ị ga-anọchibido ya zuru.
9 “Werekwa ọka wit, ọka bali, akịdị, lentil, ọka milet, na ọka spelt, tinye ha n’otu ite, werekwa ha mee achịcha ị ga-ata. Ị ga na-ata ya ruo ụbọchị ole ị ga-edina n’otu akụkụ gị, ya bụ, narị ụbọchị atọ na iri itoolu (390).+ 10 Ị ga na-atụ̀ nri ị ga-eri atụ̀. Shekel iri abụọ* ka ị ga-eri n’otu ụbọchị. Ị ga-enwe oge ị ga na-eri ya n’ụbọchị.
11 “Ị ga na-atụ̀kwa mmiri ị ga-aṅụ atụ̀. E kee otu hin* ụzọ isii, ị ga na-aṅụ otu ụzọ. Ị ga-enwe oge ị ga na-aṅụ ya n’ụbọchị.
12 “Ị ga-ata achịcha ahụ otú i si ata achịcha ọka bali. Ị ga-eji nsị kpọrọ nkụ mmadụ nyụrụ mere nkụ, nọrọkwa n’ihu ha ghee ya n’elu nsị ahụ.” 13 Jehova kwukwara, sị: “Otú a ka ndị Izrel ga-esi taa achịcha ha na-adịghị ọcha ná mba ndị m ga-achụga ha.”+
14 Ma m sịrị: “Mbanụ, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Kemgbe m bụ nwata ruo ugbu a, eritụbeghị m* anụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ anụ a dọgburu adọgbu,+ ihe ọ ga-abụ m mee, mụ emerụọ onwe m. Anụ rụrụ arụ abatụbeghịkwa m n’ọnụ.”+
15 Ọ gwaziri m, sị: “Nsogbu adịghị. M ga-ahapụ gị ka i jiri nsị ehi mere nkụ, kama iji nsị mmadụ. Ị ga-eghe achịcha gị ahụ n’elu ya.” 16 Ọ gwakwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, m ga-eme ka a ghara inwe ebe e si enweta nri* na Jeruselem.+ Ụjọ ga na-atụ ndị bi na ya ịta achịcha hiri nne+ na ịṅụ nnukwu mmiri, n’ihi na achịcha ha gwụ ma ọ bụ mmiri ha gwụ, inweta ọzọ ga-esi ike.+ 17 Ihe a ga-eme n’ihi na achịcha ha ga-agwụ, mmiri ha agwụkwa, ha ana-ele ibe ha anya ka ndị ihe juru anya, taakwa ahụ́ n’ihi mmehie ha.