Job
26 Job wee sị:
2 “Legodị ụdị aka i nyeere onye ike na-adịghị.
Legodị otú i si zọpụta onye na-enweghị ume.+
3 Legodị ọmarịcha ndụmọdụ i nyere onye na-amaghị ihe.+
Legodị otú i si gosi na ị ma nnọọ ihe.
4 Ònye ka ị na-agbalị ịgwa okwu?
Ọ̀ bụkwa onye mere ka i kwuo ihe ndị a?
5 Ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ọ bụla, ha na-amakwa jijiji.
Ha nọdị n’ebe dị ala karịa osimiri na ihe ndị bi n’ime ya.
7 Ọ na-agbasa mbara igwe nke dị n’ebe ugwu n’elu ebe tọgbọ chakoo,+
E nweghịkwa ihe o kokwasịrị ụwa na ya.
8 Ọ na-eji ígwé ojii ya afụchi mmiri+
Otú ígwé ojii na-agaghị agbawa n’agbanyeghị otú mmiri si dị arọ.
10 Ọ na-akpara mbara igwe na osimiri ókè.+
Ọ na-akpara ìhè na ọchịchịrị ókè.
11 Ogidi ndị ji eluigwe na-ama jijiji.
Mba ọ na-aba na-eme ka egwu jide ha.
12 Ọ na-eji ike ya eme ka oké osimiri mee mkpọtụ.+
Ọ na-akụri nnukwu anụ mmiri* n’ihi nghọta o nwere.+
13 Ọ na-eji ume ọ na-ekupụ* eme ka mbara igwe gbachapụ agbachapụ.
Aka ya na-egwepịa agwọ siri ike njide.*
14 Lee, ihe ndị a bụ nnọọ obere ihe n’ihe ndị ọ na-eme.+
Naanị obere ihe nke yiri ihe a takwunyere atakwunye ka a nụrụla banyere ya.
Ònyezi ga-aghọtali otú o si eme ka égbè eluigwe ya dị egwu gbaa?”+