Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ndị Eze 10
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ

      • Jihu gburu ndị ezinụlọ Ehab (1-17)

        • Jehonadab nyeere Jihu aka (15-17)

      • Jihu gburu ndị na-efe Bel (18-27)

      • Otú ọchịchị Jihu si gaa (28-36)

2 Ndị Eze 10:1

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ndị na-elekọtara Ehab ihe.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 16:29
  • +1Ez 21:8

2 Ndị Eze 10:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 9:24, 27

2 Ndị Eze 10:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ụlọ.”

2 Ndị Eze 10:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 21:21

2 Ndị Eze 10:9

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “Unu bụ ndị ezi omume.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 9:14, 24

2 Ndị Eze 10:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Sa 15:29; Aịz 14:27
  • +1Ez 21:19-24; 2Ez 9:7, 36

2 Ndị Eze 10:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 18:19; 2Ez 23:19, 20
  • +1Ez 21:21

2 Ndị Eze 10:13

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, Jezibel nwunye eze, nne Eze Jehoram.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 8:29; 9:21, 27; 2Ih 22:1

2 Ndị Eze 10:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 22:8

2 Ndị Eze 10:15

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ọ gọziri.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jer 35:6, 19
  • +1Ih 2:55

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/1/2005, p. 11

    1/1/1998, p. 12-13

2 Ndị Eze 10:16

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ka ị hụ otú m si anụ ọkụ n’obi maka Jehova.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 25:11; 1Ez 19:10

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    1/1/1998, p. 12-13

2 Ndị Eze 10:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 9:8; 2Ih 22:7
  • +1Ez 21:20, 21; 2Ez 9:26

2 Ndị Eze 10:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 16:32, 33; 18:22

2 Ndị Eze 10:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 3:13
  • +2Ez 10:11

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/15/2011, p. 5

2 Ndị Eze 10:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 16:30, 32

2 Ndị Eze 10:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 10:15; Jer 35:6, 19

2 Ndị Eze 10:24

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

2 Ndị Eze 10:25

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ndị ọgba ọsọ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 32:26, 27; Di 13:6-9; Ezi 9:5

2 Ndị Eze 10:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:1
  • +Di 7:25

2 Ndị Eze 10:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:30; Di 7:5
  • +1Ez 16:30, 32

2 Ndị Eze 10:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:28-30; 13:33; Ho 8:6

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/15/2011, p. 5

2 Ndị Eze 10:30

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 21:21
  • +2Ez 13:1, 10; 14:23; 15:8, 12

2 Ndị Eze 10:31

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 10:12; Ho 1:4
  • +1Ez 12:28-30; 13:34; 14:16

2 Ndị Eze 10:32

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “na-eme ka ala ndị Izrel belata.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 19:17; 2Ez 8:12; 13:22

2 Ndị Eze 10:33

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 32:33; Jos 22:9
  • +Di 3:13-16; 28:63; Jos 13:8-12

2 Ndị Eze 10:35

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 13:1

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Eze 10:11Ez 16:29
2 Eze 10:11Ez 21:8
2 Eze 10:42Ez 9:24, 27
2 Eze 10:71Ez 21:21
2 Eze 10:92Ez 9:14, 24
2 Eze 10:101Sa 15:29; Aịz 14:27
2 Eze 10:101Ez 21:19-24; 2Ez 9:7, 36
2 Eze 10:111Ez 18:19; 2Ez 23:19, 20
2 Eze 10:111Ez 21:21
2 Eze 10:132Ez 8:29; 9:21, 27; 2Ih 22:1
2 Eze 10:142Ih 22:8
2 Eze 10:15Jer 35:6, 19
2 Eze 10:151Ih 2:55
2 Eze 10:16Ọg 25:11; 1Ez 19:10
2 Eze 10:172Ez 9:8; 2Ih 22:7
2 Eze 10:171Ez 21:20, 21; 2Ez 9:26
2 Eze 10:181Ez 16:32, 33; 18:22
2 Eze 10:192Ez 3:13
2 Eze 10:192Ez 10:11
2 Eze 10:211Ez 16:30, 32
2 Eze 10:232Ez 10:15; Jer 35:6, 19
2 Eze 10:25Ọp 32:26, 27; Di 13:6-9; Ezi 9:5
2 Eze 10:26Le 26:1
2 Eze 10:26Di 7:25
2 Eze 10:27Le 26:30; Di 7:5
2 Eze 10:271Ez 16:30, 32
2 Eze 10:291Ez 12:28-30; 13:33; Ho 8:6
2 Eze 10:301Ez 21:21
2 Eze 10:302Ez 13:1, 10; 14:23; 15:8, 12
2 Eze 10:31Di 10:12; Ho 1:4
2 Eze 10:311Ez 12:28-30; 13:34; 14:16
2 Eze 10:321Ez 19:17; 2Ez 8:12; 13:22
2 Eze 10:33Ọg 32:33; Jos 22:9
2 Eze 10:33Di 3:13-16; 28:63; Jos 13:8-12
2 Eze 10:352Ez 13:1
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
  • 35
  • 36
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ndị Eze 10:1-36

Ndị Eze nke Abụọ

10 Ma, ụmụ Ehab+ ndị nwoke iri asaa nọ na Sameria. N’ihi ya, Jihu dere akwụkwọ ozi, e ziga ya Sameria, nye ya ndị isi Jezril, ndị okenye,+ na ndị na-elekọta ụmụ Ehab.* Ihe o dere n’akwụkwọ ozi ahụ bụ: 2 “Unu na ụmụ onyenwe unu nọ. Ụgbọ ịnyịnya agha na ịnyịnya na ngwá agha ndị dị ebe ahụ dịkwa unu n’aka. Unu bikwa n’obodo a rụsiri ike. Akwụkwọ ozi a ruo unu aka, 3 họpụtanụ nwa onyenwe unu nke kacha mma, kachakwa ruo eruo ịbụ eze, chiekwanụ ya eze ka ọ nọrọ n’ocheeze nna ya. Lụọkwaranụ ezinụlọ onyenwe unu agha.”

4 Ma, egwu tụrụ ha, ha asị: “Ndị eze abụọ emerilighị ya,+ ọ̀ bụzi anyịnwa ga-emerili ya?” 5 N’ihi ya, onye na-elekọta obí* eze, onyeisi obodo ahụ, ndị okenye, na ndị na-elekọta ụmụ eze zigaara Jihu ozi, sị: “Anyị bụ ndị ohu gị. Anyị ga-eme ihe niile ị ga-agwa anyị. Anyị agaghị echi onye ọ bụla eze. Mee ihe ọ bụla dị mma n’anya gị.”

6 N’ihi ya, o degaara ha akwụkwọ ozi nke abụọ, sị: “Ọ bụrụ na unu dịnyeere m, ọ bụrụkwa na unu dị njikere irubere m isi, buterenụ m isi ụmụ onyenwe unu ụdị oge a echi na Jezril.”

N’oge ahụ, ụmụ eze, ndị nwoke iri asaa, nọ n’ụlọ ndị na-azụ ha, bụ́ ndị a na-akwanyere ùgwù n’obodo ahụ. 7 Ozugbo akwụkwọ ozi ahụ ruru ha aka, ha kpọọrọ ụmụ eze, ndị nwoke iri asaa,+ gbuo, wụnye isi ha na nkata, burukwa ha bugara Jihu na Jezril. 8 Otu onye batara bịa gwa Jihu, sị: “Ha ebutela isi ụmụ eze.” Ya asị: “Kposanụ ha ụzọ abụọ n’ọnụ ụzọ ámá, ka ha dịrịkwa ebe ahụ ruo ụtụtụ.” 9 Mgbe Jihu pụtara ebe ahụ n’ụtụtụ, ọ gara guzoro n’ihu mmadụ niile nọ ebe ahụ, sị: “Aka unu dị ọcha.* N’eziokwu, ọ bụ m gbara izu gbuo onyenwe m.+ Ma, ònye gburu ndị a niile? 10 Maranụ na o nweghị ihe ọ bụla Jehova kwuru, nke Jehova kwuru ga-eme ezinụlọ Ehab, na-agaghị emezu.+ Jehova emeela ihe o si n’ọnụ ohu ya bụ́ Ịlaịja kwuo.”+ 11 Jihu gbukwara ndị ezinụlọ Ehab niile fọrọ na Jezril, ha na ndị niile a na-akwanyere ùgwù na-ejere Ehab ozi, ndị enyi ya, na ndị nchụàjà ya.+ O nweghị onye n’ime ha ọ hapụrụ ndụ.+

12 Mgbe o gbuchara ha, ọ lawara Sameria. E nwekwara ụlọ ndị na-azụ atụrụ na-anọ akpacha ajị atụrụ dị n’ụzọ o si lawa. 13 Ka Jihu na-eru ebe ahụ, ọ hụrụ ụmụnne Ehazaya+ eze Juda. Ya ajụọ ha, sị, “Ùnu bụ ole ndị?” Ha asị: “Anyị bụ ụmụnne Ehazaya. Anyị na-aga ka anyị mara otú ụmụ eze na ndị nne eze* mụrụ mere.” 14 Ozugbo ahụ, ọ sịrị: “Jidenụ ha!” Ha wee jide ha, gbuo ha n’olulu mmiri dị n’ụlọ ahụ a na-anọ akpacha ajị atụrụ. Ha dị ụmụ nwoke iri anọ na abụọ. Ọ hapụghị otu onye n’ime ha ndụ.+

15 Ka o si ebe ahụ na-aga, ọ hụrụ Jehonadab+ nwa Rikab+ ka ọ na-abịa izute ya. Mgbe o kelere* ya, ọ sịrị ya: “Ì ji obi gị niile na-akwado m otú m si jiri obi m niile na-akwado gị?”

Jehonadab asị: “Ee.”

Jihu asị ya: “Ọ bụrụ otú ahụ, nye m aka gị.”

Ya enye ya aka ya, Jihu adọgote ya n’ụgbọ ịnyịnya, 16 gwakwa ya, sị: “Soro m gaa ka ị hụ na anaghị m agbachi ndị na-enupụrụ Jehova isi nkịtị.”*+ Jihu wee buru ya n’ụgbọ ịnyịnya agha ya na-aga. 17 Jihu mechara lọrute Sameria, gbuokwa ndị niile fọrọ n’ezinụlọ Ehab nọ ebe ahụ. O gbugidere ha ruo mgbe o gbuchara ha niile,+ otú Jehova gwara Ịlaịja.+

18 Jihu kpọkọtakwara mmadụ niile, sị ha: “Ehab efesighị Bel ike,+ ma Jihu ga-efesi ya ike. 19 Kpọkọtaranụ m ndị amụma Bel niile,+ ndị niile na-efe ya, na ndị nchụàjà ya niile.+ Ka a ghara ịchọ onye ọ bụla n’ime ha achọ, n’ihi na m ga-achụrụ Bel nnukwu àjà. Onye ọ bụla a chọrọ achọ agaghị adị ndụ.” Ma, Jihu chọrọ isi otú a rata ndị na-efe Bel ma bibie ha.

20 Jihu kwukwara, sị: “Kọsaanụ na a ga-enwe nzukọ pụrụ iche maka Bel.” Ha wee kọsaa ya. 21 Jihu zikwara ndị mmadụ ha agaa ebe niile n’Izrel kpọọ ndị niile na-efe Bel, ha abịa. O nweghị onye n’ime ha na-abịaghị. Ha niile banyekwara n’ụlọ Bel,+ ya eju n’ọnụ. 22 Jihu gwakwara onye na-elekọta ebe a na-achịsa ákwà, sị: “Chịpụtara ndị niile na-efe Bel uwe,” ya achịpụtara ha uwe ha ga-eyi. 23 Jihu na Jehonadab+ nwa Rikab banyeziri n’ụlọ Bel, Jihu asị ndị na-efe Bel: “Leruonụ anya ka unu jide n’aka na e nweghị onye ọ bụla na-efe Jehova nọ ebe a, kama na ọ bụ naanị ndị na-efe Bel nọ ebe a.” 24 N’ikpeazụ, ha malitere ịchụ àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ. Jihu gwara ụmụ nwoke iri asatọ ka ha guzoro n’èzí, sịkwa ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu ahapụ nwoke ọ bụla n’ime ndị a m na-enyefe n’aka unu, onye ahụ ga-eji ndụ* ya kwụọ ụgwọ ya.”

25 Ozugbo a chụchara àjà ahụ a na-esu ọkụ, Jihu gwara ndị nche* na ndị na-esote ndị isi ndị agha, sị: “Batanụ, gbuo ha! Unu ekwela ka onye ọ bụla gbapụ.”+ Ndị nche na ndị na-esote ndị isi ndị agha maliteziri iji mma agha na-egbu ha, na-atụpụkwa ozu ha n’èzí. Ha gbugidere ha ruo n’ime ime ụlọ Bel. 26 Ha bupụtakwara ogidi arụsị+ ndị dị n’ụlọ Bel ma kpọọ ha ọkụ.+ 27 Ha kwatukwara ogidi arụsị+ Bel, kwatuokwa ụlọ Bel,+ mezie ka ọ bụrụ ebe a na-aga mposi. Otú ahụ ka ọ dịkwa ruo taa.

28 Otú a ka Jihu si mee ka ndị Izrel kwụsị ife Bel. 29 Ma, Jihu ahapụchaghị mmehie niile Jeroboam nwa Nibat mere, ndị mere ka ndị Izrel mehie. Ọ hapụrụ ndị Izrel ka ha na-efe ụmụ ehi ọlaedo ndị otu n’ime ha dị na Betel, otu adịrị na Dan.+ 30 Ma, Jehova sịrị Jihu: “I mere ihe niile m bu n’obi ime ezinụlọ Ehab.+ Ihe a i mere dị mma, o zikwara ezi n’anya m. N’ihi ya, ụmụ gị ndị nwoke ga-anọ n’ocheeze Izrel ruo ọgbọ anọ.”+ 31 Ma Jihu asaghị anya na mmiri jiri obi ya niile debe Iwu Jehova bụ́ Chineke Izrel.+ Ọ hapụchaghị mmehie niile Jeroboam mere, ndị mere ka ndị Izrel mehie.+

32 Ọ bụ n’oge ahụ ka Jehova gbara nkịtị ka e jiri nwayọọ nwayọọ na-anara ndị Izrel ala ha.* Hazel sikwa ná mpaghara ala ha niile na-alụso ha agha.+ 33 Ọ malitere ná mpaghara ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, ya bụ, obodo Gilied niile, ebe ebo Gad, ebo Ruben, na ebo Manase+ bi. Ụfọdụ n’ime obodo ndị ahụ si Aroa, nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn, ruo Gilied na Beshan.+

34 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Jihu, ihe niile o mere, na ike niile ọ kpara, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 35 Jihu mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e liekwa ya na Sameria, Jehoahaz+ nwa ya anọchie ya, malite ịchị. 36 Jihu nọ na Sameria chịa Izrel afọ iri abụọ na asatọ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya