Levitikọs
23 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ememme ndị a ga na-emere Jehova n’oge dị iche iche,+ bụ́ ndị unu ga-ama ọkwa ka e mee,+ bụcha mgbakọ dị nsọ. Ha bụ ememme ndị a ga na-emere m n’oge dị iche iche:
3 “‘Unu nwere ike ịrụ ọrụ ụbọchị isii, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike nke a ga-ezu naanị ike na ya.+ Ọ bụ ụbọchị mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla. Ọ bụ ụbọchị izu ike unu ga-edebere Jehova n’ebe ọ bụla unu bi.+
4 “‘Ihe ndị a bụ ememme ndị a ga na-emere Jehova n’oge dị iche iche, ya bụ, mgbakọ dị nsọ ndị unu ga-ama ọkwa ka e mee n’oge e ji eme ha: 5 N’abalị iri na anọ n’ọnwa mbụ,+ unu ga-emere Jehova Ememme Ngabiga ná mgbede.*+
6 “‘Ọ bụ n’abalị iri na ise n’ọnwa a ka Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko unu ga-emere Jehova ga-amalite.+ Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa.+ 7 N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike. 8 Ma unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ ruo ụbọchị asaa. Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ n’ụbọchị nke asaa. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike.’”
9 Jehova gwakwara Mosis, sị: 10 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu ga-emecha bata n’ala m ga-enye unu ma wee ihe ubi ya, unu ga-ebutere onye nchụàjà otu ùkwù ọka bali si ná mkpụrụ mbụ unu+ wetara n’ubi unu.+ 11 Onye nchụàjà ga-efegharị ùkwù ọka bali ahụ n’ihu Jehova ka o wee nabata unu. Ọ bụ n’ụbọchị na-esote Ụbọchị Izu Ike ka ọ ga-efegharị ya. 12 N’ụbọchị e fegharịrị ùkwù ọka bali ahụ, unu ga-achụ ebule ahụ́ dị mma, nke na-agafebeghị otu afọ, n’àjà. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova. 13 A ga-eji ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, chụọ àjà ọka ya. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma* a na-esuru Jehova ọkụ. A ga-eji otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanya chụọ àjà mmanya ya. 14 Unu erila achịcha ọ bụla ma ọ bụ ọka bali e ghere eghe* ma ọ bụ ọka bali ọhụrụ ruo n’ụbọchị a, ruo mgbe unu wetaara Chineke unu onyinye. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe n’ebe ọ bụla unu bi.
15 “‘Malite n’ụbọchị na-esote Ụbọchị Izu Ike ahụ, ya bụ, malite n’ụbọchị unu wetara ùkwù ọka bali a ga-eji chụọ àjà a na-efegharị efegharị, unu ga-agụ ụbọchị izu ike asaa.+ Ụbọchị izu ike ndị ahụ ga-ezu ezu. 16 Unu ga-agụ ụbọchị iri ise+ gụruo n’ụbọchị na-esote Ụbọchị Izu Ike nke asaa, unu ewetaziere Jehova àjà ọka ọhụrụ.+ 17 Unu ga-esi n’ebe unu bi weta ogbe achịcha abụọ ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị. A ga-eji ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma mee ha. A ga-etinye ha ihe na-eko achịcha,+ ka ha bụrụ mkpụrụ mbụ kara aka a na-enye Jehova.+ 18 Ihe ndị unu ga-eweta ha na ogbe achịcha ndị ahụ bụ ebule asaa ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, nakwa otu ehi na ebule abụọ.+ Ha ga-abụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova, ha na àjà ọka ha na àjà mmanya ha. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma* a na-esuru Jehova ọkụ. 19 Unu ga-ejikwa nwa ewu chụọ àjà mmehie,+ jirikwa ụmụ ebule abụọ gbara otu afọ otu afọ chụọ àjà udo.+ 20 Onye nchụàjà ga-efegharị ebule abụọ ahụ, ha na ogbe achịcha ndị ahụ e ji ọka wit mbụ kara aka mee, ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. Ha ga-abụrụ Jehova ihe dị nsọ nke ga-abụ nke onye nchụàjà.+ 21 N’ụbọchị ahụ, unu ga-ama ọkwa+ ka unu nwee mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe n’ebe ọ bụla unu bi.
22 “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi n’ala unu, unu ewerechala ihe niile dị n’ọnụ ọnụ ubi unu. Unu atụtụkwala ihe fọrọ n’ihe ubi unu.+ Unu ga-ahapụ ha maka ndị ogbenye+ na ndị mbịarambịa.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”
23 Jehova gwakwara Mosis, sị: 24 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘N’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa, unu ga-ezu naanị ike. A ga-afụ opi+ n’ụbọchị ahụ ka e chetara unu na a ga-enwe mgbakọ dị nsọ. 25 Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike. Unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ.’”
26 Jehova gwakwuru Mosis, sị: 27 “Ma, ụbọchị nke iri n’ọnwa nke asaa ahụ ga-abụ Ụbọchị Ikpuchi Mmehie.+ Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu ga-emekpa onwe* unu ahụ́,*+ chụọkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ. 28 Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla n’ụbọchị a n’ihi na ọ bụ ụbọchị ikpuchi mmehie nke a ga-eji na-ekpuchiri unu mmehie+ unu n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu. 29 Onye* ọ bụla na-emekpaghị onwe ya ahụ́* n’ụbọchị ahụ, a ga-egbu ya.*+ 30 M ga-ebibi onye* ọ bụla rụrụ ụdị ọrụ ọ bụla n’ụbọchị ahụ. 31 Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe n’ebe ọ bụla unu bi. 32 Ọ bụ ụbọchị izu ike nke unu ga-ezu naanị ike na ya. Unu ga-emekpakwa onwe* unu ahụ́+ ná mgbede ụbọchị nke itoolu n’ọnwa ahụ. Unu ga-edebe ụbọchị izu ike unu malite ná mgbede ruo ná mgbede.”
33 Jehova gwakwara Mosis, sị: 34 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘N’abalị iri na ise n’ọnwa asaa ahụ, unu ga-amalite Ememme Ụlọ Ndò a na-emere Jehova. Unu ga-eme ya ruo ụbọchị asaa.+ 35 Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ n’ụbọchị nke mbụ. Unu agaghịkwa arụ ọrụ ọ bụla siri ike. 36 Unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esu ọkụ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ. Ọ bụ nzukọ pụrụ iche. Unu agaghị arụ ọrụ ọ bụla siri ike.
37 “‘Ihe ndị a bụ ememme+ ndị a ga na-emere Jehova, ndị unu ga-ama ọkwa ka e mee ka ha bụrụ mgbakọ dị nsọ.+ Ha ga-abụ oge a ga na-achụrụ Jehova àjà a na-esuru ya ọkụ, ya bụ, àjà a na-esu ọkụ+ na àjà ọka+ na àjà mmanya.+ A ga na-achụ àjà ndị a otú e kwuru ka a na-achụ ha n’ụbọchị nke ọ bụla. 38 Unu ga na-achụ àjà ndị a, na-achụkwa ndị nke a na-achụ n’ụbọchị izu ike niile nke Jehova,+ ha na onyinye ndị unu wetara,+ onyinye ndị unu kwere ná nkwa,+ nakwa onyinye ndị si unu n’obi,+ bụ́ ndị unu ga-enye Jehova. 39 Ma n’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa, mgbe unu chịkọtachara ihe ala unu mepụtara, unu ga-eme ememme Jehova ruo ụbọchị asaa.+ Unu ga-ezu naanị ike n’ụbọchị nke mbụ. Unu ga-ezukwa naanị ike n’ụbọchị nke asatọ.+ 40 N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere mkpụrụ nke osisi ndị mara mma, igu nkwụ,+ alaka osisi ndị nwere akwụkwọ na alaka osisi pọpla ndị dị na ndagwurugwu. Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu ruo ụbọchị asaa.+ 41 Unu ga-eme ya ụbọchị asaa n’afọ ka ọ bụrụ ememme a na-emere Jehova.+ Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe. Unu ga na-eme ya n’ọnwa nke asaa. 42 Unu ga-ebi n’ụlọ ndò ụbọchị asaa.+ Ndị niile bụ́ ụmụ afọ Izrel ga-ebi n’ụlọ ndò, 43 ka ọgbọ unu ndị ga-esote unu wee mara+ na ọ bụ n’ụlọ ndò ka m mere ka ndị Izrel biri mgbe m na-akpọpụta ha n’Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”
44 Mosis wee gwa ndị Izrel banyere ememme ndị a ga na-emere Jehova n’oge dị iche iche.