Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ndị Eze 13
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ

      • Jehoahaz malitere ịchị Izrel (1-9)

      • Jehoash malitere ịchị Izrel (10-13)

      • Ịlaịsha gwara Jehoash ihe ọ ga-eme ka ọ mara ma ọ̀ na-anụ ọkụ n’obi (14-19)

      • Ịlaịsha nwụrụ, ọkpụkpụ ya mekwara ka otu nwoke si n’ọnwụ bilie (20, 21)

      • Amụma ikpeazụ Ịlaịsha buru mezuru (22-25)

2 Ndị Eze 13:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 11:2, 21
  • +2Ez 8:26; 9:27
  • +2Ez 10:30, 35

2 Ndị Eze 13:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:28-30; 13:33; 14:16

2 Ndị Eze 13:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:14, 17
  • +Hib 12:29
  • +1Ez 19:17; 2Ez 8:12
  • +2Ez 13:24

2 Ndị Eze 13:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 3:7; Ikp 10:16; 2Ez 14:26, 27

2 Ndị Eze 13:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, n’udo na n’obi iru ala.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Neh 9:27

2 Ndị Eze 13:6

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 10:29; 17:21
  • +Di 7:5; 1Ez 14:15; 16:33

2 Ndị Eze 13:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 8:12; 10:32
  • +Em 1:3

2 Ndị Eze 13:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 10:35

2 Ndị Eze 13:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 14:1

2 Ndị Eze 13:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 10:29

2 Ndị Eze 13:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 14:8, 13

2 Ndị Eze 13:13

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, Jeroboam nke Abụọ.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 14:28
  • +2Ez 10:35; 13:9

2 Ndị Eze 13:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 19:16
  • +2Ez 2:11, 12

2 Ndị Eze 13:17

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “azọpụta.”

  • *

    Ma ọ bụ “na-emeri.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Sa 29:1; 1Ez 20:26

2 Ndị Eze 13:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 13:25

2 Ndị Eze 13:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 1:1; 24:2

2 Ndị Eze 13:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jn 11:44; Hib 11:35

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    12/2017, p. 5

    Ụlọ Nche,

    8/1/2005, p. 11

    11/15/1991, p. 5

2 Ndị Eze 13:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 19:15
  • +2Ez 8:12; 10:32

2 Ndị Eze 13:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 14:26, 27
  • +Je 13:14-16
  • +Je 26:3
  • +Je 28:13; Ọm 105:8; Maị 7:20

2 Ndị Eze 13:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 13:19

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Eze 13:12Ez 11:2, 21
2 Eze 13:12Ez 8:26; 9:27
2 Eze 13:12Ez 10:30, 35
2 Eze 13:21Ez 12:28-30; 13:33; 14:16
2 Eze 13:3Le 26:14, 17
2 Eze 13:3Hib 12:29
2 Eze 13:31Ez 19:17; 2Ez 8:12
2 Eze 13:32Ez 13:24
2 Eze 13:4Ọp 3:7; Ikp 10:16; 2Ez 14:26, 27
2 Eze 13:5Neh 9:27
2 Eze 13:62Ez 10:29; 17:21
2 Eze 13:6Di 7:5; 1Ez 14:15; 16:33
2 Eze 13:72Ez 8:12; 10:32
2 Eze 13:7Em 1:3
2 Eze 13:92Ez 10:35
2 Eze 13:102Ez 14:1
2 Eze 13:112Ez 10:29
2 Eze 13:122Ez 14:8, 13
2 Eze 13:132Ez 14:28
2 Eze 13:132Ez 10:35; 13:9
2 Eze 13:141Ez 19:16
2 Eze 13:142Ez 2:11, 12
2 Eze 13:171Sa 29:1; 1Ez 20:26
2 Eze 13:192Ez 13:25
2 Eze 13:202Ez 1:1; 24:2
2 Eze 13:21Jn 11:44; Hib 11:35
2 Eze 13:221Ez 19:15
2 Eze 13:222Ez 8:12; 10:32
2 Eze 13:232Ez 14:26, 27
2 Eze 13:23Je 13:14-16
2 Eze 13:23Je 26:3
2 Eze 13:23Je 28:13; Ọm 105:8; Maị 7:20
2 Eze 13:252Ez 13:19
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ndị Eze 13:1-25

Ndị Eze nke Abụọ

13 N’afọ nke iri abụọ na atọ n’ọchịchị Jehoash+ nwa Ehazaya+ eze Juda, Jehoahaz nwa Jihu+ malitere ịchị Izrel. Ọ chịkwara afọ iri na asaa na Sameria. 2 Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, na-akpakwa àgwà ka Jeroboam nwa Nibat, onye mmehie ya mere ka ndị Izrel mehie.+ Ọ kwụsịghị ịkpa àgwà ka ya. 3 Jehova wee wesa ndị Izrel+ ezigbo iwe,+ nyefeekwa ha n’aka Hazel+ eze Siria na Ben-hedad+ nwa ya, ha ana-emesi ha ike oge niile.

4 Ka oge na-aga, Jehoahaz rịọrọ Jehova ka o meere ya amara, Jehova anụ arịrịọ ya, n’ihi na ọ hụrụ otú eze Siria si na-emesi ndị Izrel ike.+ 5 N’ihi ya, Jehova mere ka e nwee onye zọpụtara ndị Izrel+ n’aka ndị Siria, ha ebirikwa n’ụlọ ha otú ha bibu.* 6 (Ma, ha akwụsịghị ime mmehie e ji mara ezinụlọ Jeroboam, onye mere ka ndị Izrel mehie.+ Ha nọ na-eme mmehie a, ha egbutughịkwa ogwe osisi arụsị*+ ndị dị na Sameria.) 7 Ihe fọọrọ Jehoahaz bụ mmadụ iri ise ndị na-agba ịnyịnya, ụgbọ ịnyịnya iri, na puku ndị agha iri (10,000) ji ụkwụ aga, n’ihi na eze Siria bibiri ndị ọzọ,+ zọpịakwa ha, ha adịrị ka uzuzu na-adị n’oge a na-azọcha ọka.+

8 Ma e dere akụkọ ndị ọzọ gbasara ndụ Jehoahaz, ihe niile o mere, na ike ọ kpara, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 9 Jehoahaz mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e lie ya na Sameria,+ Jehoash nwa ya anọchie ya, malite ịchị.

10 N’afọ nke iri atọ na asaa n’ọchịchị Jehoash eze Juda, Jehoash+ nwa Jehoahaz malitere ịchị Izrel. Ọ chịkwara afọ iri na isii na Sameria. 11 Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. Ọ kwụsịghị ime mmehie niile Jeroboam nwa Nibat mere, ndị mekwara ka ndị Izrel mehie.+ Ọ nọgidere na-eme ha.

12 Ma, e dere akụkọ ndị ọzọ gbasara ndụ Jehoash, ihe niile o mere, ike ọ kpara, na otú o si lụso Amazaya eze Juda agha,+ n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 13 Jehoash mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, Jeroboam*+ anọchie n’ocheeze ya. E likwara Jehoash na Sameria ebe e liri ndị eze Izrel ndị ọzọ.+

14 Mgbe Ịlaịsha+ dara ọrịa nke mechara gbuo ya, Jehoash eze Izrel gakwuuru ya, na-ebesara ya ákwá, sị: “Nna m, nna m! M na-ahụ ụgbọ ịnyịnya agha Izrel na ndị Izrel na-agba ịnyịnya!”+ 15 Ịlaịsha asị ya: “Were ụta, chịrịkwa akụ́.” Ya ewere ụta, chịrịkwa akụ́. 16 Ịlaịsha asị eze Izrel: “Dọọ ụta ahụ.” Ya adọọ ya, Ịlaịsha atụkwasị aka ya n’aka eze, 17 sị: “Meghee windo chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ.” Ya emeghee ya. Ịlaịsha asị: “Gbaa!” Ya agbaa. Ịlaịsha asịzie: “Akụ́ Jehova ji emeri,* akụ́ e ji emeri Siria! Ị ga na-egbu* ndị Siria n’Efek+ ruo mgbe i gbuchara ha.”

18 O kwukwara, sị: “Chịrị akụ́,” eze Izrel achịrị ha. Ịlaịsha asị ya: “Tie ha n’ala.” Ya etie ha n’ala ugboro atọ kwụsị. 19 Ihe a o mere kpasuru onye nke ezi Chineke ezigbo iwe, ya asị: “A sị na i tiri ha n’ala ugboro ise ma ọ bụ isii, ị gaara na-egbu ndị Siria ruo mgbe i gbuchara ha. Ma ugbu a, ugboro atọ ka ị ga-emeri ndị Siria.”+

20 Mgbe ihe a mechara, Ịlaịsha nwụrụ, e liekwa ya. Ma, e nwere ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga+ na-esi Moab abata n’Izrel ná mmalite afọ ọ bụla. 21 Otu ụbọchị, ka ndị mmadụ na-eli otu nwoke, ha hụrụ ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ahụ. N’ihi ya, ha tụbara ozu nwoke ahụ ozugbo n’ebe e liri Ịlaịsha ma gbaa ọsọ. Mgbe ozu nwoke ahụ metụrụ ọkpụkpụ Ịlaịsha, nwoke ahụ si n’ọnwụ bilie+ ma guzoro n’ụkwụ ya.

22 Ma, Hazel+ eze Siria nọ na-emesi ndị Izrel ike+ n’oge niile Jehoahaz dị ndụ. 23 Ma, Jehova meere ha amara, meere ha ebere,+ gosikwa na ihe gbasara ha na-emetụ ya n’obi, n’ihi ndụ ya na Ebreham+ na Aịzik+ na Jekọb+ gbara. Ọ chọghị ibibi ha. Ọ chụpụghịkwa ha n’ihu ya ruo taa. 24 Mgbe Hazel eze Siria nwụrụ, Ben-hedad nwa ya nọchiri ya, malite ịchị. 25 Jehoash nwa Jehoahaz gakwara nata Ben-hedad nwa Hazel obodo ndị Hazel naara Jehoahaz nna ya n’agha. Jehoash meriri Ben-hedad ugboro atọ,+ natakwa ya obodo ndị Izrel nwe.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya