Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt
13 Nke a bụ nke ugboro atọ m ga-abịa hụ unu. “A ga-esi n’àmà* ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ gbara mara na okwu ọ bụla bụ eziokwu.”+ 2 Ọ bụ eziokwu na mụ na unu anọghị ugbu a, ma ọ dị m ka mụ na unu nọ ọzọ. Ihe a ka m na-agwa ndị mere mmehie n’oge gara aga na ndị ọzọ niile: Ọ bụrụ na mụ emechaa bịa ọzọ, agaghị m emere ndị na-eme ihe ọjọọ ebere. 3 M ga-esi otú ahụ gosi unu na Kraịst na-esi n’ọnụ m ekwu okwu. Ọ naghịkwa egosi unu na ya adịghị ike, kama ọ na-egosi unu na ya dị ike. 4 N’eziokwu, e gburu ya n’elu osisi mgbe ọ na-adịghị ike, ma ọ dị ndụ n’ihi ike Chineke.+ N’eziokwu, anyị adịghịkwa ike otú ahụ yanwa na-adịbughị ike, ma anyị na ya ga-adịkọ ndụ+ n’ihi ike Chineke nke na-arụ ọrụ n’ime unu.+
5 Na-enyochanụ onwe unu ka unu mara ma okwukwe unu ò sikwara ike. Na-egosinụ ụdị mmadụ unu bụ.+ Ka ọ̀ bụ na unu amaghị na unu na Jizọs Kraịst dị n’otu? Unu kwesịrị ịma, ọ gwụkwala ma Chineke ọ̀ jụla unu. 6 Ọ dị m ka ya bụrụ na unu ma na Chineke ajụghị anyị ajụ.
7 Ma anyị na-arịọ Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọọ ọ bụla. Ihe anyị bu n’obi abụghị ka anyị gosi na ihe anyị dị ndị mmadụ mma. Kama, anyị chọrọ ka unu na-eme ezi ihe, ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka ihe anyị ghara ịdị ndị mmadụ mma. 8 Anyị agaghị eme ihe ọ bụla ga-emegide eziokwu. Naanị ihe anyị ga-eme bụ ihe ga-akwado eziokwu. 9 Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ bụla unu dị ike, ọ bụrụgodị na anyịnwa adịghị ike mgbe ahụ. Anyị na-ekpekwa ekpere ka unu mezie ebe ndị unu na-anaghị emetecha.* 10 Ọ bụ ya mere m ji ede ihe ndị a tupu mụ abịa hụ unu, ka ọ ga-abụ, mụ na unu nọrọ, mụ aghara ịdị aka ike, n’ihi na ikike Onyenwe anyị nyere m+ bụ ka m na-agba unu ume, ọ bụghị ime ka unu daa mbà.
11 N’ikpeazụ, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-emezikwanụ ebe ndị unu na-anaghị emetecha.* Na-ekwenụ ka a kasie unu obi.+ Nweenụ otu obi,+ na-ebikwanụ n’udo.+ Chineke nke udo,+ onye hụrụ anyị n’anya, ga-anọnyere unu. 12 Susuonụ ibe unu ọnụ mgbe unu na-ekele ibe unu.* 13 Ndị nsọ niile na-ekele unu.
14 Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara. Ka Chineke hụ unu n’anya. Ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị niile na-arụkwa ọrụ n’ime unu.