Ozi Ọma Jọn Dere
1 Okwu ahụ+ nọ ná mmalite, Okwu ahụ na Chineke nọkwa,+ Okwu ahụ bụkwa chi.*+ 2 Ya na Chineke nọ ná mmalite. 3 Ihe niile si n’aka ya dịrị.+ E nweghịdị otu ihe dịnụ nke na-esighị n’aka ya.
Ihe e si n’aka ya 4 mee ka ọ dịrị bụ ndụ. Ndụ ahụ bụkwaara ụmụ mmadụ ìhè.+ 5 Ìhè ahụ na-enwu n’ọchịchịrị,+ ma ọchịchịrị ahụ akabeghị ya ike.
6 E nwere otu nwoke Chineke zitere ka ọ bụrụ onye nnọchiteanya ya. Aha ya bụ Jọn.+ 7 Nwoke a bịara ka ọ bụrụ onye àmà, ka o wee gbaa àmà banyere ìhè ahụ,+ ka ụdị mmadụ niile si n’aka ya kwere. 8 Ọ bụghị ya bụ ìhè ahụ.+ Kama ọ bịara ka ọ gbaa àmà banyere ìhè ahụ.
9 Oge eruwela ka ezigbo ìhè ahụ nke na-enye ụdị mmadụ ọ bụla ìhè bịa n’ụwa.+ 10 Ọ nọrọla n’ụwa,+ ụwa sikwa n’aka ya dịrị.+ Ma ụwa amaghị ya. 11 Ọ bịara n’obodo a mụrụ ya, ma ndị obodo ya anabataghị ya. 12 Ma, o nyere ndị niile nabatara ya ikike ịghọ ụmụ Chineke+ n’ihi na ha nwere okwukwe n’aha ya.+ 13 E sighị n’ọbara ma ọ bụ n’anụ ahụ́ ma ọ bụ n’ọchịchọ mmadụ mụọ ha, kama e si na Chineke mụọ ha.+
14 Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ́+ ma bie n’etiti anyị. Anyị hụkwara ebube ya, bụ́ ụdị ebube ọkpara a mụrụ naanị ya na-enweta+ n’aka nna ya. O jupụtakwara n’amara Chineke nakwa n’eziokwu. 15 (Jọn gbara àmà banyere ya. N’eziokwu, o tiri mkpu, sị: “Ọ bụ onye a ka m kwuru banyere ya, sị, ‘Onye na-abịa n’azụ m agafeela n’ihu m n’ihi na ọ dị adị tupu mụnwa.’”)+ 16 N’ihi na anyị niile si n’aka ya enweta amara mgbe niile maka na o jupụtara n’amara Chineke. 17 N’ihi na Chineke si n’aka Mosis nye Iwu,+ ma o si n’aka Jizọs Kraịst+ mee ka anyị nweta amara+ na eziokwu. 18 O nweghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.+ Ọ bụ chi a mụrụ naanị ya+ nke nọ n’akụkụ* Nna ya+ kọwara onye Nna ya bụ.+
19 Ihe a bụ àmà Jọn gbara mgbe ndị Juu si na Jeruselem zipụ ndị nchụàjà na ndị Livaị ka ha gaa jụọ ya, sị: “Ònye ka ị bụ?”+ 20 Ọ gọghị agọ, kama o kwuru hoo haa, sị: “Abụghị m Kraịst.” 21 Ha wee jụọ ya, sị: “Ònyekwanụ ka ị bụ? Ị̀ bụ Ịlaịja?”+ Ọ zara, sị: “Abụghị m ya.” “Ị̀ bụ Onye Amụma ahụ a na-atụ anya ya?”+ O wee sị: “Mba.” 22 Ha sịziri ya: “Ònye ka ị bụ? Gwa anyị ka anyị mara ihe anyị ga-aza ndị zitere anyị. Olee ihe ị na-ekwu banyere onwe gị?” 23 Ọ sịrị: “Abụ m olu onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị, ‘Meenụ ka ụzọ Jehova* kwụrụ ọtọ,’+ dị ka Aịzaya onye amụma kwuru.”+ 24 Ọ bụ ndị Farisii zitere ndị ahụ. 25 Ha wee jụọ ya, sị: “Gịnịzi mere i ji na-eme ndị mmadụ baptizim ma ọ bụrụ na ị bụghị Kraịst ma ọ bụ Ịlaịja ma ọ bụ Onye Amụma ahụ a na-atụ anya ya?” 26 Jọn zara ha, sị: “Eji m mmiri na-eme baptizim. E nwere onye unu na ya nọ unu na-amaghị, 27 onye na-abịa n’azụ m. Erughị m eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.”+ 28 Ihe ndị a mere na Betani n’ofe Osimiri Jọdan,* bụ́ ebe Jọn nọ na-eme baptizim.+
29 N’echi ya, ọ hụrụ Jizọs ka ọ na-abịakwute ya, o wee sị: “Lee Nwa Atụrụ+ Chineke onye na-ewepụ mmehie+ nke ụwa.+ 30 Ọ bụ onye a ka m kwuru banyere ya, sị: ‘Otu nwoke na-abịa n’azụ m, onye gaferela n’ihu m n’ihi na ọ dị adị tupu mụnwa.’+ 31 Amaghịdị m ya. Ma, ihe mere m ji bịa jiri mmiri na-eme baptizim bụ ka e mee ka Izrel mara ya.”+ 32 Jọn gbakwara àmà, sị: “Ahụrụ m mmụọ nsọ ka o si n’eluigwe na-efedata n’ụdị nduru, ọ dịgidekwara n’isi ya.+ 33 Amaghịdị m ya. Ma, Onye zitere m ka m jiri mmiri na-eme baptizim sịrị m: ‘Onye ọ bụla ị hụrụ ka mmụọ nsọ bịakwasịrị ma dịgide n’isi ya,+ ọ bụ ya bụ onye ji mmụọ nsọ eme baptizim.’+ 34 Ahụla m ya, agbaakwala m àmà na ọ bụ ya bụ Ọkpara Chineke.”+
35 N’echi ya, Jọn na mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya guzo. 36 Mgbe ọ hụrụ ka Jizọs na-agafe, ọ sịrị: “Lee Nwa Atụrụ+ Chineke.” 37 Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ ihe a o kwuru, ha sooro Jizọs. 38 Jizọs wee tụgharịa hụ ka ha na-eso ya, ya asị ha: “Gịnị ka unu na-achọ?” Ha sịrị ya: “Rabaị (nke pụtara “Onye Ozizi”), olee ebe i bi?” 39 Ọ sịrị ha: “Bịanụ, ka unu hụ ya.” Ha wee gaa hụ ebe o bi, ha na ya nọkwara n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ n’ihe dị ka awa nke iri.* 40 Andru+ nwanne Saịmọn Pita bụ otu n’ime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru wee soro Jizọs. 41 Ihe mbụ o mere bụ ịchọta nwanne ya, bụ́ Saịmọn, sị ya: “Anyị ahụla Mezaya+ ahụ” (nke pụtara “Kraịst”). 42 O wee duru ya gakwuru Jizọs. Mgbe Jizọs lere ya anya, ọ sịrị: “Ị bụ Saịmọn+ nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sifas” (nke pụtara “Pita”).+
43 N’echi ya, Jizọs chọrọ ịgawa Galili. O wee hụ Filip+ ma sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” 44 Filip bụ onye Betsaịda, onye obodo Andru na Pita. 45 Filip hụrụ Nataniel+ sị ya: “Anyị ahụla onye e dere banyere ya n’Iwu Mosis nakwa n’Akwụkwọ Ndị Amụma, ya bụ, Jizọs, nwa Josef,+ onye Nazaret.” 46 Ma Nataniel sịrị ya: “È nwere ihe ọma ga-esili na Nazaret pụta?” Filip wee sị ya: “Bịa hụrụ.” 47 Jizọs hụrụ ka Nataniel na-abịakwute ya, ya ekwuo banyere ya, sị: “Lee ezigbo onye Izrel, onye na-anaghị aghọ aghụghọ.”+ 48 Nataniel sịrị ya: “Olee otú i si mara m?” Jizọs zara ya, sị: “Tupu Filip akpọọ gị, mgbe ị nọ n’okpuru osisi fig, ahụrụ m gị.” 49 Nataniel wee sị: “Onye Ozizi,* ị bụ Ọkpara Chineke. Ị bụ Eze Izrel.”+ 50 Jizọs sịrị ya: “Ọ̀ bụ maka na m gwara gị na m hụrụ gị n’okpuru osisi fig mere i ji kwere? Ị ga-ahụ ihe karịrị ihe ndị a.” 51 Jizọs gwaziri ya, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na unu ga-ahụ ka eluigwe meghere, ndị mmụọ ozi Chineke ana-arịgo ma na-arịdakwute Nwa nke mmadụ.”+