Hosia
12 “Ifrem tụkwasịrị ihe na-abaghị uru obi.*
Mgbe niile, ọ na-achụ ihe na-abaghị uru.*
Ọ na-aghagbu onwe ya n’ụgha. Ihe na-agụkwa ya mgbe niile bụ tigbuo zọgbuo.
Ya na Asiria agbaala ndụ.+ Ọ na-ebugakwara Ijipt mmanụ.+
Ọ ga-eme ka Jekọb zaa ajụjụ ihe niile o metere.
Ọ ga-akwụkwa ya ụgwọ ihe o metere.+
3 O jidere nwanne ya n’ikiri ụkwụ mgbe ọ nọ n’afọ.+
O jikwa ike ya niile gbaso Chineke mgba.+
4 Ya na mmụọ ozi gbara mgba, ya emerie.
O bere ákwá, rịọkwa ka o meere ya amara.”+
Chineke hụrụ ya na Betel. N’ebe ahụkwa ka Chineke gwara anyị okwu.+
5 Jehova bụ Chineke nke ụsụụ ndị agha.+
Jehova bụ aha e ji echeta ya.+
6 “N’ihi ya, lọghachikwutenụ Chineke unu.+
Na-ahụnụ ndị ọzọ n’anya,* na-ekpekwanụ ikpe ziri ezi.+
Tụkwasịnụ Chineke unu obi mgbe niile.
7 Ma, ihe onye ahịa ji n’aka ya bụ ihe wayo e ji atụ̀ ihe.
Ịghọgbu ndị mmadụ na-atọ ya ụtọ.+
8 Ifrem na-asịkwa, ‘N’eziokwu, abaala m ọgaranya.+
Akpatala m akụ̀.+
O nweghịkwa ihe ọjọọ ma ọ bụ mmehie ọ bụla ha ga-ahụ m mere n’otú niile m si na-arụgbu onwe m n’ọrụ.’
9 Ma, abụ m Jehova Chineke gị malite n’Ijipt.+
M ga-eme ka i biri n’ụlọikwuu
Otú ị na-ebi n’oge ememme.
11 Gilied na-aghọ aghụghọ,*+ na-aghakwa ụgha.
Ha achụọla ehi dị iche iche n’àjà na Gilgal.+
Ebe ịchụàjà ha dịkwa ka ikpo nkume nke dị n’ubi.+
Izrel+ jere ozi ebe ahụ ka ọ lụta nwaanyị.+
O lekọtakwara atụrụ ka ọ lụta nwaanyị.+
13 Jehova ji onye amụma si n’Ijipt kpọpụta Izrel.+
O jikwa onye amụma chee ya nche.+
14 Ifrem kpasuru Chineke ezigbo iwe.+
Ọbara ndị o gburu dị ya n’isi.
Onyenwe ya ga-akwụ ya ụgwọ maka mkparị ọ kparịrị ya.”+