Ndị Ikpe
19 N’oge ahụ, mgbe a na-enweghị eze n’Izrel,+ otu onye Livaị nke bi n’ime ime ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu+ kpọọrọ otu nwaanyị onye Betlehem+ dị na Juda ka ọ bụrụ iko ya nwaanyị.* 2 Ma, iko ya nwaanyị malitere ịkwa iko, hapụkwa ya laa n’ụlọ nna ya na Betlehem dị na Juda. Ọ nọ ebe ahụ ruo ọnwa anọ. 3 Di ya wee chọrọ ya gaa ka ọ gwa ya okwu ka ọ lọghachi. Ọ kpọ onye na-ejere ya ozi. Ha gba jakị abụọ. Nwaanyị ahụ wee kpọbata ya n’ụlọ nna ya. Ozugbo nna nwaanyị ahụ hụrụ nwoke ahụ, ọ ṅụrịrị ọṅụ. 4 Ọgọ ya nwoke, bụ́ nna nwa agbọghọ ahụ, wee gwa ya okwu mere ka o kweta ịnọ na nke ya ruo ụbọchị atọ. Ha wee na-eri nri ma na-aṅụ mmanya, ọ na-ehikwa n’ebe ahụ.
5 N’ụbọchị nke anọ, mgbe ha biliri n’isi ụtụtụ ka ha lawa, nna nwa agbọghọ ahụ gwara ọgọ ya nwoke, sị: “Rie ihe ka i nweta ume, unu richaa, unu alawa.” 6 Ha wee nọdụ ala. Ha abụọ rikọrọ nri, ṅụkọọkwa mmanya. E mechaa, nna nwa agbọghọ ahụ gwara nwoke ahụ, sị: “Biko, nọrọ ka chi bọọ, meekwa onwe gị obi ụtọ.” 7 Mgbe nwoke ahụ biliri ka ọ lawa, ọgọ ya nwoke nọ na-arịọ ya, o wee rahụ ọzọ n’ebe ahụ.
8 Mgbe o biliri n’isi ụtụtụ n’ụbọchị nke ise ka ọ lawa, nna nwa agbọghọ ahụ sịrị ya: “Biko, rie ihe ka i nweta ume.” Ha wee nọrọ ruo mgbe ụbọchị gamiri, ha abụọ nọkwa na-eri ihe. 9 Mgbe nwoke ahụ biliri ka ọ lawa, ya na iko ya nwaanyị na onye na-ejere ya ozi, ọgọ ya nwoke, bụ́ nna nwa agbọghọ ahụ, sịrị ya: “Leenụ, chi ejiwela. Biko, nọrọ ka chi bọọ. Lee, ọ fọrọ obere ka chi jie. Nọrọ ebe a ka chi bọọ, meekwa onwe gị obi ụtọ. I nwere ike ibili n’isi ụtụtụ echi lawa n’ụlọ* gị.” 10 Ma, nwoke ahụ achọghị ịnọ ka chi bọọ ọzọ. O wee bilie lawa ma rute na Jebus, ya bụ, Jeruselem.+ Ya na iko ya nwaanyị na onye na-ejere ya ozi so. Ha gba jakị abụọ ndị e dokwasịrị ihe e ji anọ ọdụ n’elu jakị.
11 Mgbe ha rutewere Jebus, ìhè adịchaghịzi. Onye ahụ na-eje ozi wee gwa nna ya ukwu, sị: “Ànyị ga-akwụsị n’obodo ndị Jebus a nọrọ ka chi bọọ?” 12 Ma nna ya ukwu sịrị ya: “Anyị ekwesịghị ịkwụsị n’obodo ndị mba ọzọ, ndị na-abụghị ndị Izrel. Anyị ga-agaru Gibia.”+ 13 O wee gwa onye na-ejere ya ozi, sị: “Bịa ka anyị gbalịa garuo Gibia ma ọ bụ na Rema.+ Anyị ga-arahụ n’otu n’ime obodo ndị ahụ.” 14 Ha wee na-aga ebe ha na-aga. Anyanwụ adawala mgbe ha ruwere Gibia, bụ́ obodo dị n’ebo Benjamin.
15 Ha wee kwụsị n’ebe ahụ ma banye ka ha rahụ na Gibia. Ozugbo ha banyere, ha nọdụrụ ala n’ámá obodo ahụ. Ma, e nweghị onye kpọbara ha n’ụlọ ya ka ha rahụ na nke ya.+ 16 Mgbe e mechara ná mgbede ahụ, otu agadi nwoke si ubi lọta. Nwoke ahụ si n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu,+ ma o bi na Gibia. Ma ndị bi n’obodo ahụ bụ ndị ebo Benjamin.+ 17 Mgbe agadi nwoke ahụ leliri anya hụ onye ije ahụ n’ámá obodo, ọ sịrị ya: “Ebee ka ị na-aga, ebeekwa ka i si?” 18 Ọ sịrị ya: “Anyị si na Betlehem dị na Juda na-aga n’ebe dị n’ime ime ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, bụ́ ebe m si. M gara Betlehem dị na Juda,+ ọ bụkwa n’ụlọ Jehova ka m na-aga.* Ma, e nweghị onye chọrọ ịkpọba m n’ụlọ ya. 19 Anyị nwere okporo ọka na ahịhịa jakị anyị ga-ata+ nakwa achịcha+ mụ na nwaanyị a na onye na-ejere anyị ozi ga-eri na mmanya anyị ga-aṅụ. E nweghị ihe kọrọ anyị.” 20 Ma, agadi nwoke ahụ sịrị ya: “Udo dịrị gị. Ka m nye gị ihe ọ bụla dị gị mkpa. Ma unu arahụla n’ámá obodo a.” 21 O wee kpọbata ya n’ụlọ ya, nyekwa jakị ya nri. Ha wee saa ụkwụ ha, rie nri ma ṅụọ mmanya.
22 Mgbe ha nọ na-enwe obi ụtọ, ụfọdụ ụmụ nwoke na-abaghị uru n’obodo ahụ gbara ụlọ ahụ gburugburu, na-akụsi aka ike n’ụzọ ma na-agwa agadi nwoke nwe ụlọ ahụ, sị: “Kpọpụta nwoke ahụ batara n’ụlọ gị ka anyị na ya nwee mmekọahụ.”+ 23 Onye ahụ nwe ụlọ wee pụọ n’èzí sị ha: “Mba, ụmụnne m, unu emela ihe ọjọọ. Biko, nwoke a bụ ọbịa n’ụlọ m. Unu emela ihe a na-eme ihere. 24 Leenụ nwa m nwaanyị na-amaghị nwoke na iko nwaanyị nwoke a. Ka m kpọpụtara unu ha. Unu nwere ike ime ha ihe ọ bụla dị unu mma.+ Ma unu emela nwoke a ihe a na-eme ihere.”
25 Ma ụmụ nwoke ahụ jụrụ ige ya ntị. Nwoke onye Livaị ahụ wee kpọrọ iko ya nwaanyị+ kpọpụtara ha n’èzí. Ha dinara ya n’ike ma metọọ ya n’abalị ahụ niile ruo n’ụtụtụ. Ha hapụziri ya ka ọ lawa mgbe chi bọwara. 26 N’isi ụtụtụ, nwaanyị ahụ bịara daa n’ọnụ ụzọ ụlọ nwoke ahụ bụ́ ebe nna ya ukwu nọ, tọgbọrọ ebe ahụ ruo mgbe chi bọchara. 27 Mgbe nna ya ukwu biliri n’ụtụtụ meghee ọnụ ụzọ ụlọ ahụ ka ọ pụta lawa, ọ hụrụ nwaanyị ahụ, bụ́ iko ya nwaanyị, ka ọ tọgbọ n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, dosa aka ya n’ihu ọnụ ụzọ. 28 O wee sị ya: “Bilie ka anyị lawa.” Ma o kwughị ihe ọ bụla. Nwoke ahụ wee kukwasị ya n’elu jakị ya, lawa n’ụlọ ya.
29 Mgbe o ruru n’ụlọ ya, o weere mma e ji egbu anụ, buru ozu iko ya nwaanyị gburie ya ụzọ iri na abụọ ma zigara ebo nke ọ bụla n’Izrel otu. 30 Ndị niile hụrụ ya sịrị: “Ụdị ihe a emetụbeghị, a hụtụbeghịkwa ya malite n’ụbọchị ndị Izrel si n’Ijipt pụta ruo taa. Chebaranụ ya echiche. Gbaanụ izu, gwakwanụ anyị ihe a ga-eme.”+