Samuel nke Abụọ
5 Ka oge na-aga, ebo niile n’Izrel bịakwutere Devid na Hebrọn,+ sị ya: “Anyị na gị bụ otu ọbara.*+ 2 N’oge gara aga, mgbe Sọl bụ eze anyị, ọ bụ gị na-edu ndị Izrel aga agha.+ Jehova gwakwara gị, sị: ‘Ọ bụ gị ga-azụ ndị m Izrel dị ka atụrụ. Ọ bụkwa gị ga-abụ onye ndú Izrel.’”+ 3 Ndị okenye niile n’Izrel wee bịakwute Eze Devid na Hebrọn. Ha na ya anọrọ ebe ahụ gbaa ndụ+ n’ihu Jehova. Ha tekwara Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze Izrel.+
4 Devid dị afọ iri atọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịkwara afọ iri anọ.+ 5 Ọ nọ na Hebrọn chịa Juda afọ asaa na ọnwa isii. Ọ nọkwa na Jeruselem+ chịa Izrel na Juda afọ iri atọ na atọ. 6 Eze Devid na ndị agha ya wee gaa Jeruselem ịlụso ndị Jebus+ bi ebe ahụ agha. Ha mara ya aka, sị ya: “I mekataghị bata ebe a. Ọ bụ ndị ìsì na ndị ngwọrọ ga-achụghachi gị azụ.” Ha nọ na-asị n’obi ha: ‘Devid emekataghị bata ebe a.’+ 7 Ma, Devid weghaara Zayọn, bụ́ obodo a rụsiri ike, nke a na-akpọzi Obodo Devid ugbu a.+ 8 Devid wee kwuo n’ụbọchị ahụ, sị: “Ndị ga-alụso ndị Jebus agha kwesịrị isi n’ọwa mmiri gaa gbuo ma ‘ndị ngwọrọ ma ndị ìsì,’ ndị Devid* kpọrọ asị.” Ọ bụ ya mere ha ji asị: “Ndị ìsì na ndị ngwọrọ emekataghị bata n’ụlọ a.” 9 Devid wee biri n’ebe a rụsiri ike. A kpọkwara* ebe ahụ Obodo Devid. Devid bidokwara ịrụ mgbidi na ihe ndị ọzọ, ma na Milo*+ ma n’ebe ndị ọzọ.+ 10 Devid nọkwa na-esikwu ike.+ Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha nọnyekwaara ya.+
11 Haịram+ eze Taya ziri ndị ozi ka ha gakwuru Devid, ka ha hazie otú a ga-esi bute osisi sida,+ o zigakwara ndị ọkwá nkà na ndị na-eji nkume arụ mgbidi ka ha rụọrọ Devid ụlọ.*+ 12 Ihe a mere ka o doo Devid anya na Jehova emeela ka ọchịchị ya sie ezigbo ike n’Izrel+ nakwa na o jirila maka ndị ya bụ́ Izrel+ mee ka alaeze ya na-aga nke ọma.+
13 Mgbe Devid si Hebrọn lọta Jeruselem, o nwetakwuru ndị iko,+ lụkwuokwa ụmụ nwaanyị. Ọ mụtakwukwara ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị.+ 14 Aha ndị a mụụrụ ya na Jeruselem bụ: Shamua, Shobab, Netan,+ Solomọn,+ 15 Ịbha, Elaịshua, Nifeg, Jefaya, 16 Elishama, Elayada, na Elifelet.
17 Mgbe ndị Filistia nụrụ na e teela Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze Izrel,+ ha niile pụtara na-achọ Devid.+ Mgbe Devid nụrụ ya, ọ gara nọrọ n’ebe a rụsiri ike.+ 18 Ma, ndị Filistia bịara na-agagharị na Ndagwurugwu Refeyim.+ 19 Devid wee jụọ Jehova,+ sị: “Ọ̀ bụ m gaa lụso ndị Filistia agha? Ị̀ ga-enyefe ha n’aka m?” Jehova asị ya: “Gawa, n’ihi na m ga-enyeferịrị ndị Filistia n’aka gị.”+ 20 Devid wee gaa Bel-perezim, gbuo ha ebe ahụ. Mgbe o gbuchara ha, ya asị: “Jehova akwadala ndị iro m+ n’ihu m ka ebe mmiri kwadara mgbidi.” Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ebe ahụ Bel-perezim.*+ 21 Ndị Filistia hapụrụ arụsị ha niile ebe ahụ, Devid na ndị agha ya eburu ha gaa bibie.
22 Mgbe e mechara, ndị Filistia bịakwara ọzọ na-agagharị na Ndagwurugwu Refeyim.+ 23 Devid wee jụọ Jehova ma ọ̀ bụ ya gakwuru ha, ma, ọ sịrị ya: “Agakwurula ha ihu na ihu. Kama, gaa nkọnkọ nkọnkọ ruo n’azụ ha, lụsokwa ha agha n’ihu ebe ahụ osisi beka juru. 24 Ị nụ ihe na-ada ka ụda ụkwụ ndị mmadụ n’elu osisi beka ndị ahụ, gaa lụso ha agha ozugbo, n’ihi na ọ pụtara na Jehova eburularị gị ụzọ pụta igbu ndị agha ndị Filistia.” 25 Devid mere nnọọ ihe Jehova gwara ya mee. O gbukwara ndị Filistia+ malite na Giba+ ruo Giza.+