Abụ Ọma
AKWỤKWỌ NKE ABỤỌ
(Abụ Ọma 42-72)
Maka onye na-eduzi abụ. Maskil* nke ụmụ Kora.+
2 Agụụ ife Chineke, bụ́ Chineke dị ndụ, na-agụsi m* ike otú mmiri si agụsi mmadụ ike.+
Olee mgbe m ga-abịa n’ihu Chineke?+
3 Anaghị m eri nri, naanị ákwá ka m na-ebe ehihie na abalị.
Malite n’ụtụtụ ruo n’abalị, ndị mmadụ na-akparị m, na-asị: “Olee ebe Chineke gị nọ?”+
4 M cheta ihe ndị a, ọ na-eme ka m gwa gị ihe niile dị m n’obi,
N’ihi na e nwere mgbe m na-eso ìgwè mmadụ aga.
M na-akwụ ha n’ihu, anyị ejiri nwayọọ nwayọọ na-aga n’ụlọ Chineke.
Anyị na-eti mkpu ọṅụ ka anyị na-aga, na-abụkwa abụ ekele
Ka ìgwè mmadụ ndị na-eme ememme.+
Gịnị mere na obi anaghị ezu m ike?
Ọ bụ ya mere m ji nọrọ+
N’ala Osimiri Jọdan nakwa n’elu elu ugwu Hemọn
Nakwa n’Ugwu Miza* na-echeta gị.
7 Oké osimiri na-akpọ oké osimiri òkù
Mgbe mmiri gị nke na-asọda asọda na-eme mkpọtụ.
Nsogbu ezuola m ahụ́ ka onye oké ebili mmiri gị niile rikpuru.+
8 N’ehihie, Jehova ga-egosi na ọ hụrụ m n’anya.
N’abalị, m ga-abụ abụ too ya, wee gwa Chineke nyere m ndụ okwu n’ekpere.+
9 M ga-ajụ Chineke, bụ́ nkume m dị elu, sị:
“Gịnị mere i ji chefuo m?+
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị na-eru uju n’ihi otú ndị iro m si na-emegbu m?”+
10 Ndị iro m bu iwe na ọnụma n’obi na-akparị m.*
Ha na-akparị m mgbe niile, na-asị: “Olee ebe Chineke gị nọ?”+
Gịnị mere na obi anaghị ezu m ike?