Abụ Ọma
Abụ ọma. Abụ ụmụ Kora.+
48 Jehova bụ onye ukwu, onye ọ bụla kwesịkwara ịna-eto ya
N’obodo Chineke anyị, n’ugwu nsọ ya.
2 Ugwu Zayọn nke dị n’ime ime ebe ugwu,
Bụ́ obodo Eze Ukwu,+
Mara mma n’ebe dị ezigbo elu ọ dị, bụrụkwa obodo na-eme ka ụwa niile ṅụrịa ọṅụ.+
3 N’ụlọ elu ndị a rụsiri ike dị na ya,
Chineke emeela ka a mara na ya bụ ebe mmadụ na-agbaba, aka aghara ịkpa ya.+
4 Lee, ndị eze ezukọtala.
Ha niile enurula bịa.
5 Mgbe ha hụrụ ya, o juru ha anya.
Egwu tụrụ ha, ha wee gbalaga n’ihi ụjọ.
6 Ụjọ jidere ha n’ebe ahụ.
Ha hụsiri anya ka nwaanyị na-amụ nwa.
7 I ji ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ mee ka ụgbọ mmiri Tashish kpuo.
8 Anyị nọ n’obodo Jehova nke ụsụụ ndị agha, n’obodo Chineke anyị,
Hụ ihe ndị anyị nụrụ n’akụkọ.
Chineke ga-echebe obodo a ruo mgbe ebighị ebi.+ (Sila)
Ị na-eji ike* gị eme ihe ziri ezi.+
12 Gaanụ Zayọn gburugburu. Gazuonụ ya okirikiri.
Gụọnụ ụlọ elu ndị dị na ya ọnụ.+
13 Chebaranụ mgbidi ya ndị siri ike echiche.+
Leruonụ ụlọ elu ndị dị na ya a rụsiri ike anya,
Ka unu wee kọọrọ ya ọgbọ ndị na-abịa abịa.
14 N’ihi na Chineke a bụ Chineke anyị+ ruo mgbe niile ebighị ebi.