Job
39 “Ị̀ ma oge ewu ọhịa* ji amụ nwa?+
Ị̀ hụtụla mgbe mgbada na-amụ nwa?+
2 Ị̀ na-agụkọ ọnwa ole ha na-ebu afọ ime?
Ị̀ ma mgbe ha ji amụ nwa?
3 Ha na-ehulata mụọ nwa mgbe ime na-eme ha,
Ahụ́ mgbu ha akwụsị.
4 Ụmụ ha na-agbasi ike ma too n’ime ọhịa.
Ha na-apụ, ha anaghịkwa alọghachikwute nne ha.
5 Ònye hapụrụ jakị ọhịa ka ọ gawara onwe ya?+
Ọ̀ bụkwa onye tọpụrụ eriri e kere jakị ọhịa?*
6 M meela ka ọzara bụrụ ụlọ ya,
Meekwa ka ala nnu bụrụ ebe ọ na-ebi.
7 Ọ na-achị ọgba aghara e nwere n’obodo ọchị.
Ọ naghị anụ mkpu onye na-achị anụmanụ na-eti.
8 Ọ na-akpagharị n’ugwu na-achọ ahịhịa ọ ga-ata,
Na-achọ ụdị ahịhịa ndụ ọ bụla.
9 Atụ́ ọ̀ ga-achọ ijere gị ozi?+
Ọ̀ ga-anọbọ chi n’ụlọ anụmanụ gị?*
10 Ì nwere ike iji ụdọ kegide atụ́ ka ọ kọọrọ gị ihe n’ubi,
Ka ọ̀ ga-eso gị gaa kọọrọ gị ihe na ndagwurugwu?
11 Ị̀ ga-atụkwasị ya obi maka na ọ dị ezigbo ike,
Ma hapụ ya ka ọ rụọrọ gị nnukwu ọrụ i nwere ịrụ?
12 Ị̀ ga-atụkwasị ya obi ka o bulatara gị ihe ubi gị mepụtara?*
Ọ̀ ga-ekpokọta ha n’ebe ị na-azọcha ọka?*
13 Obi na-atọ enyí nnụnụ ụtọ mgbe ọ na-efe nku ya.
Ma à ga-eji nku ya na ábụ́bà* ya tụnyere nke ụgbala ọcha?*+
14 N’ihi na ọ na-ahapụ àkwá ya n’ala.
Ọ na-ahapụ ha n’ájá ka ájá na-ekpo ha ọkụ.
15 Ọ na-echefu na mmadụ nwere ike ịzọpịa ha
Ma ọ bụ na anụmanụ nwere ike ịzọ ha ụkwụ.
16 Ọ na-emesi ụmụ ya ike ka à ga-asị na ọ bụghị ya mụrụ ha.+
Ọ chọghịdị ịma na mbọ niile ọ gbara nwere ike ịla n’iyi.
18 Ma mgbe o biliri fee nku ya,
Ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ya ọchị.
19 Ọ̀ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya?+
Ọ̀ bụ gị na-eme ka o nwee ọzà n’olu ya?
20 Ì nwere ike ime ka ọ malie ka igurube?
Otú o si eze ume n’ike n’ike na-emenye ụjọ.+
21 Ọ na-akụ ụkwụ n’ala n’ike n’ike na ndagwurugwu, na-amalikwa elu.+
Ọ na-azọrọ kwem kwem pụta n’ọgbọ agha.+
22 Ọ na-achị ihe na-emenye ụjọ ọchị, e nweghịkwa ihe ọ na-atụ egwu.+
Mma agha anaghị eme ka ọ gbaghachi azụ.
23 Akpa akụ́ na-eme mkpọtụ n’akụkụ ya,
Ube na árọ̀ ana-egbukwa maramara.
24 Ebe ọ bụ na ọ na-enu ya enu, ọ na-awụrụ ọsọ gawa.
O nweghị ike ịkwụrụ otu ebe ma ọ nụ ụda opi.*
25 A fụọ opi, ọ na-asị, ‘Ehee!’
Ọ na-anọ n’ebe dị anya anụ ísì agha,
Na-anụkwa mkpu ndị ọchịagha na-eti nakwa mkpu agha.+
26 Ọ̀ bụ gị kụziiri agụ nkwọ otú ọ ga-esi na-efe?
Ị̀ kụziiri ya otú ọ ga-esi na-efega n’ebe ndịda?
28 Ọ na-anọ n’ọnụ ọnụ nkume dị elu chi abọọ.
Ọ na-ebi n’ebe ọ rụsiri ike ná nnukwu nkume pịrị ọnụ.
29 Ọ na-esi n’ebe ahụ achọ nri.+
Anya ya na-eru n’ebe dị ezigbo anya.
30 Ụmụ ya na-aṅụ ọbara.
Ọ na-anọkwa n’ebe ọ bụla ozu dị.”+