Ezikiel
19 “Bụọ abụ iru uju gbasara ndị isi Izrel, 2 sị,
‘Gịnị ka nne gị bụ? Ọ bụ nne ọdụm nke ya na ọdụm ndị ọzọ nọ.
Ọ makpu ebe ọdụm ndị ọzọ siri ike makpu. Ọ nọkwa ebe ahụ zụọ ụmụ ya.
Ọ na-adọgbu ma mmadụ.
4 Mba dị iche iche nụrụ gbasara ya, jidekwa ya n’olulu ha.
Ha jikwa nko dọkpụrụ ya gaa Ijipt.+
5 Nne ya nọkwa na-eche ka ọ lọta. Ma, mgbe ọ chọpụtara na ọ gaghịzi alọta,
Ọ zụrụ nwa ya ọzọ, meekwa ka ọ bụrụ ọdụm siri ike.
6 Nwa ya nke a na-esokwa ọdụm ndị ọzọ akpagharị, mechaakwa bụrụ ọdụm siri ike.
Ọ mụtara otú e si adọgbu anụ, na-adọgbukwa ma mmadụ.+
7 Ọ na-ezo n’ụlọ elu mba dị iche iche rụsiri ike, na-alakwa obodo ha dị iche iche n’iyi,
Nke na a na-anọ ebe ọ bụla n’ebe ahụ anụ ụja ya.+
8 Mba ndị gbara ya gburugburu bịara ka ha lụso ya ọgụ, gbasaakwa ụgbụ ha n’elu ya.
Ha jidekwara ya n’olulu ha.
9 Ha ji nko dọrọ ya dọba n’ime nnukwu ngịga* ma butere ya eze Babịlọn.
Ha kpọchiri ya ebe ahụ, ka a ghara ịnụ olu ya ọzọ n’ugwu niile dị n’Izrel.
10 Nne gị dị ka osisi vaịn*+ a kụrụ n’akụkụ mmiri.
O nwere ọtụtụ alaka, mịakwa mkpụrụ n’ihi nnukwu mmiri ọ na-amịta.
11 Alaka* ndị dị na ya bịara sie ezigbo ike, nke na e nwere ike iji ha pịa mkpara ndị na-achị achị na-eji.
O tokwara karịa alaka osisi ndị ọzọ.
A na-ahụ ya anya n’ihi ogologo o toro nakwa n’ihi na alaka ya dị ọtụtụ.
12 Ma e mechara jiri iwe fopụ ya,+ tụsakwa ya n’ala,
Ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ mere ka mkpụrụ ya kpọọ nkụ.
A gbajipụrụ alaka ya ndị siri ike, ha akpọnwụọ,+ ọkụ erepịakwa ha.+
14 Ọkụ bidoro rewe alaka* ya ndị buru ibu, sikwa na ya repịa alaka ya ndị obere nakwa mkpụrụ ya.
O nweghịkwa alaka ọ bụla siri ike fọrọ na ya. E nweghị nke e nwere ike iji pịa mkpara ndị na-achị achị na-eji.+
“‘Ihe a bụ abụ iru uju. Ọ ga-abụkwa abụ iru uju a ma ama.’”