Hosia
1 Ihe a ka Jehova gwara Hosia* nwa Beiraị n’oge Ọzaya,+ Jotam,+ Ehaz,+ na Hezekaya+ bụ ndị eze Juda,+ nakwa n’oge Jeroboam+ nwa Joash+ bụ eze Izrel. 2 Mgbe Jehova malitere isi n’ọnụ Hosia gwa ndị ya okwu, Jehova gwara ya, sị: “Gaa lụrụ nwaanyị nke ga-agba akwụna,* ụmụ ọ kwatara n’iko* ga-abụkwa ụmụ gị, n’ihi na ọ bụ ịgba akwụna* mere ala a ji kwụsị iso Jehova.”+
3 N’ihi ya, ọ gara lụrụ Goma bụ́ ada Dibleyim, ya adịrị ime, mụtakwara ya nwa nwoke.
4 Jehova wee sị ya: “Gụọ ya Jezril,* n’ihi na n’oge na-adịghị anya, m ga-eme ka ezinụlọ Jihu+ zaa ajụjụ maka ndị niile Jezril gburu.* M ga-emekwa ka ọchịchị Izrel kwụsị.+ 5 N’oge ahụ, m ga-agbaji ụta Izrel na Ndagwurugwu Jezril.”
6 O wee dịrị ime ọzọ, mụọ nwa nwaanyị. Chineke wee sị Hosia: “Gụọ ya Lo-ruhema,* maka na agaghịzi m emere ndị Izrel ebere,+ n’ihi na m ga-achụpụ ha.+ 7 Ma m ga-emere ndị Juda ebere.+ Mụnwa, bụ́ Jehova Chineke ha, ga-azọpụta ha.+ Ma, ọ bụghị ụta ma ọ bụ mma agha ma ọ bụ agha ma ọ bụ ịnyịnya ma ọ bụ ndị na-agba ịnyịnya ka m ga-eji zọpụta ha.”+
8 Mgbe ọ kwụsịrị Lo-ruhema ara, ọ tụụrụ ime ọzọ, mụọ nwa nwoke. 9 Chineke wee sị: “Gụọ ya Lo-amaị,* n’ihi na unu abụghị ndị m, agaghịkwa m abụ Chineke unu.
10 “Ndị Izrel ga-adị ka ájá dị n’oké osimiri, nke a na-enweghị ike ịtụ atụ̀ ma ọ bụ ịgụta ọnụ.+ N’ebe m gwara ha, sị, ‘Unu abụghị ndị m,’+ m ga-asịzi ha, ‘Unu bụ ụmụ Chineke dị ndụ.’+ 11 A ga-akpọkọta ndị Juda na ndị Izrel ka ha dịrị n’otu.+ Ha ga-eme otu onye onyeisi ha wee si n’ala ahụ pụọ, n’ihi na ụbọchị Jezril ga-abụ ụbọchị ukwu.+