Joshụa
19 Mgbe e fere nza nke abụọ,+ ọ dabaara Simiọn, ya bụ, ebo Simiọn,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ala ha ketara dị n’ala Juda ketara.+ 2 Ha ketara Bia-shiba,+ Shiba, Moleda,+ 3 Heza-shual,+ Bela, Izem,+ 4 Eltolad,+ Bitọl, Họma, 5 Ziklag,+ Bet-makabọt, Heza-susa, 6 Bet-lebeọt,+ na Sharuhen. Ha dị obodo iri na atọ, ha na ógbè ha niile. 7 Obodo ndị ọzọ bụ Eyin, Rimọn, Ịta, na Eshan.+ Ha dị obodo anọ, ha na ógbè ha niile. 8 Ọ bụkwa ha nwe ógbè niile dị gburugburu obodo ndị a niile ruokwa Belat-bia, ya bụ, Rema nke dị n’ebe ndịda. Ebe ndị a niile ka ebo Simiọn ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 9 E si n’ala e kenyere Juda kenye ụmụ Simiọn ala, n’ihi na ala Juda ketara karịrị akarị. N’ihi ya, ụmụ Simiọn ketara ala n’ala Juda ketara.+
10 Mgbe e fere nza nke atọ,+ ọ dabaara ụmụ Zebulọn,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ala ha rukwara Serid. 11 Ala ha si n’ebe ọdịda anyanwụ gara ruo Mariel, ruokwa Dabeshet, garakwa ruo na ndagwurugwu nke dị ebe e si aga Jọkniam. 12 O sikwa na Serid dị n’ebe ọwụwa anyanwụ gara ruo n’ókè ala Kislọt-tebọ, ruo Daberat,+ ruokwa Jefaya. 13 O sikwa ebe ahụ gara ruo Gat-hifa+ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruo Et-kezin, ruokwa Rimọn. Ọ gakwaara ruo Nia. 14 N’ebe ugwu, ala ha ruru Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ịfta-el. 15 O rukwara Katat, Nahalal, Shimrọn,+ Aịdala, na Betlehem.+ Ha dị obodo iri na abụọ, ha na ógbè ha niile. 16 Ebe ndị a niile ka ebo Zebulọn ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ Obodo ndị a na ógbè ha niile bụ nke ha.
17 Mgbe e fere nza nke anọ,+ ọ dabaara ebo Ịsaka,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 18 Ala ha ruru Jezril,+ Kesọlọt, Shunem,+ 19 Hafarem, Shayọn, Anaherat, 20 Rabit, Kishiọn, Ibez, 21 Rimet, En-ganim,+ En-hada, na Bet-pazez. 22 Ala ha ruru Tebọ+ na Shahazuma na Bet-shimesh, ma kwụsị n’Osimiri Jọdan. Ha dị obodo iri na isii, ha na ógbè ha niile. 23 Ebe ndị a ka ebo Ịsaka ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ Obodo ndị a na ógbè ha niile bụ nke ha.
24 Mgbe e fere nza nke ise,+ ọ dabaara ebo Asha,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 25 Ala ha ruru Helkat,+ Helaị, Biten, Akshaf, 26 Alamelek, Emad, na Maịshal. O rukwara Kamel dị n’ebe ọdịda anyanwụ,+ ruokwa Shaịhọ-libnat. 27 O sikwa Bet-degọn dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo Zebulọn, ruokwa Ndagwurugwu Ịfta-el dị n’ebe ugwu. O rukwara Bet-imek na Neyel, ruokwa n’aka ekpe Kebul. 28 O rukwara Ibrọn, Rihọb, Hamọn, na Kena, ruokwa Saịdọn bụ́ obodo ọtụtụ mmadụ bi.+ 29 Ala ha ruru Rema, ruokwa Taya bụ́ obodo a rụsiri ike.+ O rukwara Hosa, ma kwụsị n’oké osimiri dị nso n’Akzib, 30 Ọma, Efek,+ na Rihọb.+ Ha dị obodo iri abụọ na abụọ, ha na ógbè ha niile. 31 Ebe ndị a ka ebo Asha ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ Obodo ndị a na ógbè ha niile bụ nke ha.
32 Mgbe e fere nza nke isii,+ ọ dabaara ụmụ Naftalaị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 33 Ala ha bidoro na Hilef nakwa ná nnukwu osisi dị na Zeananim,+ gara ruo Adami-nikeb na Jabniel, ruokwa Lakọm, ma kwụsị n’Osimiri Jọdan. 34 Ala ha sikwa n’ebe ọdịda anyanwụ ruo Aznọt-tebọ. O sikwa ebe ahụ ruo Họkọk, ruokwa Zebulọn n’ebe ndịda. O ruru Asha n’ebe ọdịda anyanwụ, ruokwa Juda n’Osimiri Jọdan n’ebe ọwụwa anyanwụ. 35 Obodo ya ndị a rụsiri ike bụ Zidim, Zee, Hamat,+ Rakat, Kineret, 36 Adama, Rema, Hezọ,+ 37 Kidesh,+ Edraị, En-hezọ, 38 Yaịrọn, Migdal-el, Horem, Bet-enat, na Bet-shimesh.+ Ha dị obodo iri na itoolu, ha na ógbè ha niile. 39 Ebe ndị a ka ebo Naftalaị ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ Obodo ndị a na ógbè ha niile bụ nke ha.
40 Mgbe e fere nza nke asaa,+ ọ dabaara ebo Dan,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 41 Ala ha ruru Zora,+ Eshtaọl, Iye-shimesh, 42 Shealabin,+ Aịjalọn,+ Ịtla, 43 Ịlọn, Timna,+ Ekrọn,+ 44 Elteke, Gibetọn,+ Belat, 45 Jihọd, Bene-birak, Gat-rimọn,+ 46 Me-jakọn, na Rakọn. Ebe ala ha ruru dịkwa nso na Jọpa.+ 47 Ala Dan ketara abaghị ha.+ N’ihi ya, ha gara lụso Lishem agha,+ merie ya ma jiri mma agha bibie ya. Ha weghaara ya ma biri na ya. Ha gụgharịkwara Lishem aha, kpọwa ya Dan, aha nna nna ha.+ 48 Ebe ndị a ka ebo Dan ketara, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Obodo ndị a na ógbè ha niile bụ nke ha.
49 Otú a ka ha si kee ala ahụ, ndị ọ bụla ewere nke ha. Ndị Izrel sizi n’ala ha ketara nye Joshụa nwa Nọn ala. 50 Ha nyere ya obodo ọ rịọrọ ha otú Jehova gwara ha mee. Ha nyere ya Timnat-sira+ dị n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu. Ọ rụghachiri obodo ahụ, birikwa na ya.
51 Ala ndị a ka Elieza onye nchụàjà, Joshụa nwa Nọn na ndị isi ọnụmara ọ bụla n’ebo dị iche iche n’Izrel, keere ha.+ A nọ n’ihu Jehova, n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute+ nke dị na Shaịlo,+ fee nza, keere ha ala ndị ahụ. Otú a ka ha si kechaa ala ahụ niile.