Job
27 Job kwukwara, sị:
2 “Eji m Chineke dị ndụ, bụ́ onye kpere m ikpe mkpegbu, na-aṅụ iyi,+
Eji m Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, bụ́ onye mewara m obi, na-aṅụ iyi+
3 Na ebe ọ bụ na m ka na-eku ume,
Ebe ọ bụkwa na imi m ka na-ekuru ume si n’ebe Chineke nọ,+
4 Ọnụ* m agaghị ekwu okwu ọjọọ ọ bụla.
Ire m agaghịkwa ekwu ihe ọ bụla ga-aghọgbu mmadụ.
5 Agaghị m anwa anwa kpọọ unu ndị ezi omume.
Ruo mgbe m nwụrụ, m ga-ejisi Chineke aka ike.+
6 M ka ga na-eme ezi omume, agaghịkwa m akwụsị.+
Obi m agaghị ama m ikpe* ná ndụ m niile.
7 Ka onye iro m dịrị ka onye na-eme ihe ọjọọ.
Ka ndị na-alụso m ọgụ dịrị ka ndị ajọ omume.
8 N’ihi na olee olileanya onye na-anaghị asọpụrụ Chineke* nwere ma e bibie ya,+
Ma Chineke napụ ya ndụ* ya?
9 Chineke ọ̀ ga-anụ ákwá ya
Mgbe nsogbu ga-abịara ya?+
10 Ka ihe gbasara Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọ̀ ga-amasị ya?
Ọ̀ ga na-arịọ Chineke arịrịọ mgbe niile?
11 M ga-akụziri unu gbasara ike Chineke.
Agaghị m ezoro unu ihe ọ bụla gbasara Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.
12 Ọ bụrụ na unu niile hụrụ ọhụụ,
Gịnị mere na okwu unu enweghị isi na ọdụ?
13 Ọ bụ ihe a ka onye ajọ omume ga-eketa n’aka Chineke.+
Ọ bụ ihe ndị aka ike ga-eketa n’aka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.
14 Ọ bụrụ na ụmụ ya adị ọtụtụ, a ga-eji mma agha gbuo ha,+
Ụmụ ụmụ ya agaghịkwa enwe nri ga-ezuru ha.
15 Ọrịa ọjọọ ga-egbu ndị ọ hapụrụ nwụọ, e lie ha,
Ndị nwunye ha agaghịkwa ebere ha ákwá.
16 Ọ bụrụgodị na ọ kpakọjuo ọlaọcha ka ájá,
Nwejuokwa ọmarịcha uwe ka ájá ụrọ,
17 Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ya gbara mbọ nweta ha,
Ọ bụ onye ezi omume ga-eyi ha.+
Ọ bụkwa ndị aka ha dị ọcha ga-eke ọlaọcha ya.
19 Ọ ga-abụ ọgaranya laba ụra, ma akụnụba ya agaghịzi afọ.*
Mgbe ọ ga-emeghe anya ya, e nweghịzi ihe ga-afọ.
20 Ụjọ ga-ezu ya ahụ́ otú idei mmiri si erikpu mmadụ.
Oké ifufe ga-ebufu ya n’abalị.+
21 Ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-eburu ya. Ọ gaghịzi anọ.
Ọ ga-esi n’ebe o bi bupụ ya.+