Samuel nke Mbụ
7 Ndị Kiriat-jierim wee bịa buru Igbe Jehova buga n’ụlọ Abinadab+ dị n’ugwu. Ha dokwara Elieza nwa ya nsọ ka ọ na-eche Igbe Jehova nche.
2 Igbe ahụ nọtere aka na Kiriat-jierim. Ọ nọrọ ebe ahụ afọ iri abụọ, malite mgbe e butere ya. Ndị Izrel niile malitekwara ịrịọ Jehova ka o nyere ha aka.+ 3 Samuel wee gwa ndị Izrel niile, sị: “Ọ bụrụ na unu ji obi unu niile na-alọghachikwute Jehova,+ wepụnụ chi ndị mba ọzọ+ na Ashtọret+ dị ebe unu nọ. Ka obi unu niile dịrị ebe Jehova nọ, na-efekwanụ naanị ya.+ Ọ ga-anapụtakwa unu n’aka ndị Filistia.”+ 4 N’ihi ya, ndị Izrel bibiri Bel na Ashtọret ma na-efe naanị Jehova.+
5 Samuel wee sị: “Kpọkọtanụ ndị Izrel niile na Mizpa,+ ka m rịọ Jehova arịrịọ maka unu.”+ 6 Ha wee zukọta na Mizpa, sere mmiri ma wụpụ ya n’ihu Jehova. Ha bukwara ọnụ n’ụbọchị ahụ.+ Ha kwuru ebe ahụ, sị: “Anyị emehiela Jehova.”+ Samuel malitekwara ikpere ndị Izrel ikpe+ na Mizpa.
7 Mgbe ndị Filistia nụrụ na ndị Izrel ezukọọla na Mizpa, ndị isi ndị Filistia+ gara ka ha lụso ndị Izrel agha. Mgbe ndị Izrel nụrụ ya, ụjọ ndị Filistia tụwara ha. 8 Ndị Izrel wee sị Samuel: “Akwụsịkwala ịrịọ Jehova Chineke anyị ka o nyere anyị aka+ ma napụta anyị n’aka ndị Filistia.” 9 Samuel wee jiri nwa atụrụ ka na-aṅụ ara chụọrọ Jehova àjà a na-esucha n’ọkụ.+ Samuel rịọwakwara Jehova ka o nyere ndị Izrel aka, Jehova azaakwa ya.+ 10 Ka Samuel nọ na-achụ àjà ahụ a na-esu ọkụ, ndị Filistia rutere nso ka ha lụso ndị Izrel agha. Jehova wee mee ka égbè eluigwe nke dara oké ụda+ gbaa n’ụbọchị ahụ. O mekwara ka ndị Filistia ghara ịma ihe ha ga-eme eme.+ Ndị Izrel wee merie ha.+ 11 Ndị Izrel sikwa na Mizpa chụwa ndị Filistia, gburukwa ha ruo ndịda Bet-kaa. 12 Samuel buuru otu nkume+ dọwa n’agbata Mizpa na Jeshana ma gụọ ya Ebeniza.* Ọ sịrị: “Jehova nọ na-enyere anyị aka ruo ugbu a.”+ 13 Otú a ka e si merie ndị Filistia. Ha abataghịkwa ọzọ n’ala Izrel.+ Jehova ekweghịkwa ka ndị Filistia lụso ndị Izrel agha ọzọ n’oge niile Samuel nọ ndụ.+ 14 Ndị Izrel napụtakwara ndị Filistia obodo niile ha naara ha, malite n’Ekrọn ruo Gat. Ha napụtakwara ala ha n’aka ndị Filistia.
Ndị Izrel na ndị Amọraịt dịkwa n’udo.+
15 Samuel kpeere ndị Izrel ikpe n’oge niile ọ nọ ndụ.+ 16 N’afọ ọ bụla, ọ na-aga Betel,+ Gilgal,+ na Mizpa,+ na-ekpere ndị Izrel bi ebe ndị a niile ikpe. 17 Ma ọ na-alọta Rema,+ n’ihi na ọ bụ ebe ụlọ ya dị. Ọ na-anọkwa ebe ahụ ekpere ndị Izrel ikpe. Ọ rụkwaara Jehova ebe ịchụàjà ebe ahụ.+