Ọpụpụ
31 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Lee, ahọrọla m Bezalel,*+ onye ebo Juda. Ọ bụ nwa Yuraị, nwa nwa Họọ.+ 3 M ga-eme ka mmụọ Chineke jupụta n’ime ya, ka o wee nwee amamihe na nghọta ma mara otú e si arụ ọrụ ọ bụla e ji nkà arụ, 4 ka o nwee ike ise otú ihe dị iche iche a ga-arụ arụ ga-adị, ka o nwee ike iji ọlaedo, ọlaọcha, na ọla kọpa arụ ọrụ, 5 ka o nwee ike ịwa nkume+ na ịkwụnye nkume n’ebe ha ga-adị, na ịrụ ụdị ihe ọ bụla e ji osisi arụ.+ 6 Ahọpụtakwala m Oholiab,+ nwa Ahisamak, onye ebo Dan ka o nyere ya aka. M ga-emekwa ka ndị niile nwere nkà* nwee amamihe, ka ha wee rụọ ihe niile m nyere gị n’iwu:+ 7 ụlọikwuu nzute,+ igbe ọgbụgba ndụ*+ na okwuchi ya+ nke ga-adị n’elu ya, arịa niile ga-adị n’ụlọikwuu ahụ, 8 tebụl+ na arịa ya, ihe e ji adọsa ọkụ* e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee na arịa ya niile,+ ebe ịchụàjà insens,+ 9 ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ+ na arịa ya niile, nnukwu ite na ihe a ga-eji adọkwasị ya,+ 10 uwe ndị a kpara nke ọma, uwe nsọ Erọn onye nchụàjà, uwe ụmụ ya ndị nwoke ga-eyi na-arụ ọrụ nchụàjà,+ 11 mmanụ a ga-eji na-ete mmadụ mmanụ, na insens na-esi ísì ọma maka ụlọikwuu ahụ.+ Ha ga-eme ihe niile m nyere gị n’iwu.”
12 Jehova gwakwuru Mosis, sị: 13 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Hụnụ na unu na-edebe ụbọchị izu ike m,+ n’ihi na ọ bụ ihe na-egosi na mụ na unu agbaala ndụ n’ọgbọ unu niile, ka unu wee mara na ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, na-eme ka unu dị nsọ. 14 Unu ga na-edebe Ụbọchị Izu Ike n’ihi na ọ bụụrụ unu ihe dị nsọ.+ A ga-egbu onye ọ bụla merụrụ ya. Onye* ọ bụla rụrụ ọrụ n’ụbọchị ahụ, a ga-egbu ya.*+ 15 E nwere ike ịrụ ọrụ ụbọchị isii, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike, nke a ga-ezu naanị ike na ya.+ Ọ bụ ihe dị nsọ n’anya Jehova. Onye ọ bụla rụrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike, a ga-egbu ya. 16 Ndị Izrel ga-edebe Ụbọchị Izu Ike. Ha ga-edebe Ụbọchị Izu Ike n’ọgbọ ha niile. Ọ bụ ọgbụgba ndụ ga-adịte aka. 17 Ọ bụ ihe àmà ga-adịgide adịgide nke na-egosi na mụ na ndị Izrel agbaala ndụ,+ n’ihi na Jehova ji ụbọchị isii kee eluigwe na ụwa, ma ọ rụghị ọrụ n’ụbọchị nke asaa, kama o zuru ike.’”+
18 Ozugbo ọ gwachara Mosis okwu n’Ugwu Saịnaị, o bunyere ya mbadamba nkume abụọ e dere Ihe Àmà ahụ.+ Ọ bụ mkpịsị aka Chineke dere ihe ná mbadamba nkume ndị ahụ.+