Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 13
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • Ihe a ga-eme ndị chọrọ ime ka ndị Izrel fee chi ọzọ (1-18)

Diuterọnọmi 13:3

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 8:19; Jer 27:9
  • +Di 8:2
  • +Di 6:5; 10:12; Mt 22:37

Diuterọnọmi 13:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ga-ejere ozi.”

  • *

    Na Hibru, “ga-arapara ya n’ahụ́.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 10:20

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    10/15/2002, p. 16-17

Diuterọnọmi 13:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 18:20
  • +Di 17:2, 3, 7; 1Kọ 5:13

Diuterọnọmi 13:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 11:4; 2Pi 2:1

Diuterọnọmi 13:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ga 1:8

Diuterọnọmi 13:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 22:20; 32:27; Ọg 25:5
  • +Di 17:2, 3, 7

Diuterọnọmi 13:10

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 20:2, 27

Diuterọnọmi 13:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 17:13; 1Ti 5:20

Diuterọnọmi 13:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 19:15; 1Ti 5:19

Diuterọnọmi 13:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 17:4, 5; 2Ih 28:6
  • +Ọp 22:20

Diuterọnọmi 13:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 6:18
  • +Je 22:15, 17; 26:3, 4

Diuterọnọmi 13:18

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ịna-ege ntị n’olu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 6:18

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 13:3Aịz 8:19; Jer 27:9
Diut. 13:3Di 8:2
Diut. 13:3Di 6:5; 10:12; Mt 22:37
Diut. 13:4Di 10:20
Diut. 13:5Di 18:20
Diut. 13:5Di 17:2, 3, 7; 1Kọ 5:13
Diut. 13:61Ez 11:4; 2Pi 2:1
Diut. 13:8Ga 1:8
Diut. 13:9Ọp 22:20; 32:27; Ọg 25:5
Diut. 13:9Di 17:2, 3, 7
Diut. 13:10Le 20:2, 27
Diut. 13:11Di 17:13; 1Ti 5:20
Diut. 13:14Di 19:15; 1Ti 5:19
Diut. 13:15Di 17:4, 5; 2Ih 28:6
Diut. 13:15Ọp 22:20
Diut. 13:17Jos 6:18
Diut. 13:17Je 22:15, 17; 26:3, 4
Diut. 13:18Di 6:18
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 13:1-18

Diuterọnọmi

13 “Ọ bụrụ na e nwee onye amụma n’obodo unu ma ọ bụ onye na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu n’ihi ihe ọ rọrọ ná nrọ, ya agwa unu na e nwere ihe àmà ma ọ bụ ihe ịtụnanya ga-eme n’ọdịnihu, 2 ihe àmà ahụ ma ọ bụ ihe ịtụnanya ahụ ọ gwara unu emechaa mee, ya asị unu, ‘Ka anyị soro chi ọzọ,’ chi ndị unu na-amaghị, ‘ka anyị feekwa ha ofufe,’ 3 unu egela ntị n’ihe onye amụma ahụ ma ọ bụ ọrọ nrọ ahụ kwuru+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu chọrọ ịnwale unu+ ka ọ mara ma ùnu ji obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya.+ 4 Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu ka unu ga-eso. Ọ bụ ya ka unu ga-atụ egwu. Unu ga-edebe ihe o nyere n’iwu, geekwa ntị n’olu ya. Ọ bụ ya ka unu ga-efe,* unu ahapụkwala ya.*+ 5 Ma, a ga-egbu onye amụma ahụ ma ọ bụ ọrọ nrọ ahụ+ n’ihi na ọ gbara unu ume ka unu nupụrụ Jehova bụ́ Chineke unu isi, bụ́ onye kpọpụtara unu n’Ijipt ma napụta unu n’ebe unu nọ na-agba ohu.* Ọ chọrọ ime ka unu hapụ ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu iwu ka unu na-eme. Unu ga-ewepụkwa ihe ọjọọ n’obodo unu.+

6 “Ọ bụrụ na nwanne gị nwoke, nwa nwoke nne gị mụrụ, ma ọ bụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị ma ọ bụ nwunye gị ị hụrụ n’anya ma ọ bụ ezigbote enyi gị anwaa ịrafu gị na nzuzo, sị, ‘Ka anyị gaa fee chi ọzọ,’+ chi ndị gịnwa ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị 7 n’ime chi dị iche iche ndị niile gbara unu gburugburu na-efe, ma ọ̀ bụ nke ndị bi unu nso ma ọ̀ bụ nke ndị bi unu n’ebe dị anya, malite n’otu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ ya nke ọzọ, 8 ekwetala ihe o kwuru. Egela ya ntị.+ Emerela ya ebere ma ọ bụ nweere ya ọmịiko, echebekwala ya. 9 Kama, unu ga-egburịrị ya.+ Ọ bụ gị ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume, ndị Izrel niile esorozie gị tụọ ya nkume.+ 10 Jirinụ nkume tụgbuo ya+ n’ihi na ọ chọrọ ime ka unu hapụ Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt, n’ebe unu nọ na-agba ohu.* 11 Izrel niile ga-anụ ya wee tụọ egwu. Ha agaghịkwa eme ụdị ihe ọjọọ a ọzọ n’obodo unu.+

12 “Ọ bụrụ na unu anụ ka a na-ekwu n’otu n’ime obodo ndị Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka unu biri, sị, 13 ‘E nwere ụmụ nwoke ndị na-abaghị uru bụ́ ndị pụtara ka ha duhie ndị bi n’obodo ha. Ha na-asị: “Ka anyị gaa fee chi ọzọ,” chi ndị unu na-amaghị,’ 14 unu ga-eleba okwu ahụ anya, sie imi n’ala, jụọkwa ase nke ọma.+ Ọ bụrụ na o doro anya n’eziokwu na e mere arụ a n’obodo unu, 15 unu ga-ejirịrị mma agha gbuo ndị bi n’obodo ahụ.+ Jirinụ mma agha bibie obodo ahụ na ihe niile nọ na ya, ma anụ ụlọ ha.+ 16 Unu ga-akwakọta ihe niile dị n’obodo ahụ n’etiti ámá obodo ahụ. Unu ga-agba obodo ahụ na ihe niile ahụ a kwakọtara ọkụ ka ọ bụrụ àjà a na-esuru Jehova bụ́ Chineke unu ọkụ. Obodo ahụ ga-abụzi ebe e bibiri ebibi ruo mgbe ebighị ebi. E nweghị mgbe a ga-arụghachi ya. 17 Unu ekwesịghị iwere ihe ọ bụla a ga-ebibi ebibi,+ ka Jehova wee kwụsị nnukwu iwe ọ na-ewe ma meere unu ebere, nweere unu ọmịiko, meekwa ka unu mụbaa, otú ọ ṅụụrụ nna nna unu hà n’iyi.+ 18 N’ihi na unu kwesịrị ịna-erubere* Jehova bụ́ Chineke unu isi. Otú unu ga-esi eme ya bụ idebe iwu ya niile m na-enye unu taa, si otú ahụ na-eme ihe dị mma n’anya Jehova bụ́ Chineke unu.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya