Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 23
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • Ndị na-ekwesịghị iso n’ọgbakọ Chineke (1-8)

      • Ihe ndị Izrel ga-eme ka ebe ha mara ụlọikwuu dị ọcha (9-14)

      • Ihe a ga-eme ohu gbapụrụ n’aka nna ya ukwu (15, 16)

      • E nweghị onye Izrel ga-abụ akwụna (17, 18)

      • Ịna ọmụrụ nwa na imezu nkwa (19-23)

      • Ihe onye na-agafe n’ubi mmadụ nwere ike iri (24, 25)

Diuterọnọmi 23:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 21:18, 20; Aịz 56:4, 5

Diuterọnọmi 23:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 20:14; Le 20:10

Diuterọnọmi 23:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Neh 13:1, 2

Diuterọnọmi 23:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ka ọ kpọọ unu iyi.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ikp 11:18
  • +Ọg 22:6; Jos 24:9

Diuterọnọmi 23:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:35
  • +Ọg 23:11, 25; 24:10
  • +Di 7:7, 8

Diuterọnọmi 23:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 8:2; 12:31

Diuterọnọmi 23:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 25:25, 26; 36:1; Ọg 20:14
  • +Je 46:6; Le 19:34; Ọm 105:23

Diuterọnọmi 23:9

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ihe ọ bụla ga-emerụ unu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Sa 21:5; 2Sa 11:11

Diuterọnọmi 23:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 15:16

Diuterọnọmi 23:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 15:31

Diuterọnọmi 23:12

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/1/2012, p. 6

    Obi Ụtọ Ezinụlọ, p. 46-47

Diuterọnọmi 23:13

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “Obere ọ́gụ̀.”

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/1/2012, p. 6

    Obi Ụtọ Ezinụlọ, p. 46-47

Diuterọnọmi 23:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:12
  • +1Pi 1:16

Diuterọnọmi 23:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 22:21

Diuterọnọmi 23:17

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “onye na-agba akwụna n’ụlọ arụsị.” O nwere ike ịbụ na ịgba akwụna a bụ ụdị nke e ji efe chi dị iche iche.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 19:29; 21:9
  • +1Ez 14:24; 2Ez 23:7

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/1/1997, p. 29

Diuterọnọmi 23:18

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ego e retara ná nkịta.”

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/1/1997, p. 29

Diuterọnọmi 23:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 22:25; Le 25:36, 37; Neh 5:10; Ọm 15:5

Diuterọnọmi 23:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 15:6
  • +Ilu 28:8
  • +Di 15:4, 7, 10; Ilu 19:17; Lu 6:34, 35

Diuterọnọmi 23:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ikp 11:30, 31; 1Sa 1:11
  • +Jo 2:9
  • +Ek 5:4, 6

Diuterọnọmi 23:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ek 5:5

Diuterọnọmi 23:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 30:2; Ọm 15:4; Ilu 20:25
  • +Ikp 11:35; 1Sa 14:24; Mt 5:33

Diuterọnọmi 23:24

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Mt 6:11; Ro 13:10

Diuterọnọmi 23:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Mt 12:1; Lu 6:1

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 23:1Le 21:18, 20; Aịz 56:4, 5
Diut. 23:2Ọp 20:14; Le 20:10
Diut. 23:3Neh 13:1, 2
Diut. 23:4Ikp 11:18
Diut. 23:4Ọg 22:6; Jos 24:9
Diut. 23:5Ọg 22:35
Diut. 23:5Ọg 23:11, 25; 24:10
Diut. 23:5Di 7:7, 8
Diut. 23:62Sa 8:2; 12:31
Diut. 23:7Je 25:25, 26; 36:1; Ọg 20:14
Diut. 23:7Je 46:6; Le 19:34; Ọm 105:23
Diut. 23:91Sa 21:5; 2Sa 11:11
Diut. 23:10Le 15:16
Diut. 23:11Le 15:31
Diut. 23:14Le 26:12
Diut. 23:141Pi 1:16
Diut. 23:16Ọp 22:21
Diut. 23:17Le 19:29; 21:9
Diut. 23:171Ez 14:24; 2Ez 23:7
Diut. 23:19Ọp 22:25; Le 25:36, 37; Neh 5:10; Ọm 15:5
Diut. 23:20Di 15:6
Diut. 23:20Ilu 28:8
Diut. 23:20Di 15:4, 7, 10; Ilu 19:17; Lu 6:34, 35
Diut. 23:21Ikp 11:30, 31; 1Sa 1:11
Diut. 23:21Jo 2:9
Diut. 23:21Ek 5:4, 6
Diut. 23:22Ek 5:5
Diut. 23:23Ọg 30:2; Ọm 15:4; Ilu 20:25
Diut. 23:23Ikp 11:35; 1Sa 14:24; Mt 5:33
Diut. 23:24Mt 6:11; Ro 13:10
Diut. 23:25Mt 12:1; Lu 6:1
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 23:1-25

Diuterọnọmi

23 “E nweghị nwoke a pịrị amụ, ya bụ, nke a kụpịara mkpụrụ amụ ya, ma ọ bụ nke e bepụrụ ihe o ji bụrụ nwoke ga-eso n’ọgbakọ Jehova.+

2 “E nweghị nwa a kwatara n’iko ga-eso n’ọgbakọ Jehova.+ Nwa ya ọ bụla agaghị eso n’ọgbakọ Jehova, ruokwa n’ọgbọ nke iri n’ụmụ ya.

3 “E nweghị onye Amọn ma ọ bụ onye Moab ga-eso n’ọgbakọ Jehova.+ E nweghị mgbe nwa ha ọ bụla ga-eso n’ọgbakọ Jehova, ruokwa n’ọgbọ nke iri n’ụmụ ha, 4 n’ihi na ha ewetaraghị unu nri na mmiri mgbe unu si n’Ijipt na-apụta+ nakwa n’ihi na ha goro Belam nwa Biọ, onye Pitọ nke dị na Mesopotemia, ka ọ bụọ unu ọnụ.*+ 5 Ma, Jehova bụ́ Chineke unu egeghị Belam ntị.+ Kama Jehova bụ́ Chineke unu mere ka ọnụ ọ gaara abụ unu bụrụzie ngọzi,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu hụrụ unu n’anya.+ 6 Ya enwela mgbe unu ga-eme ihe ga-eme ka udo dịrị ha ma ọ bụ ihe ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma n’oge niile unu dị ndụ.+

7 “Akpọla onye Ịdọm asị, n’ihi na ọ bụ nwanne gị.+

“Akpọla onye Ijipt asị, n’ihi na ị bụbu onye mbịarambịa n’obodo ya.+ 8 Ọgbọ nke atọ n’ụmụ ha, ya bụ, ụmụ ụmụ ụmụ ha, nwere ike iso n’ọgbakọ Jehova.

9 “Mgbe unu mara ụlọikwuu ka unu lụso ndị iro unu agha, unu emela ihe ọ bụla dị njọ.*+ 10 Ọ bụrụ na nwoke adịghị ọcha maka na ọbara ọcha gbapụtara ya n’ahụ́ n’abalị,+ ọ ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu pụọ, ọ gaghịkwa abataghachi na ya. 11 Ná mgbede, ọ ga-eji mmiri saa ahụ́. O nweziri ike ịbataghachi n’ebe unu mara ụlọikwuu mgbe anyanwụ dara.+ 12 A ga-ewepụta ebe unu ga na-aga mposi n’ebe dị anya n’ebe unu mara ụlọikwuu. Ọ bụ ebe ahụ ka unu ga na-aga. 13 Mbazụ* so n’ihe unu ga-enwe. Mgbe unu ga-etukwuru ná mpụga ebe ahụ ka unu nyụọ nsị, unu ga-eji ya gwuo ala, unu ga-ekpochikwa nsị unu. 14 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu na-agagharị n’ebe unu mara ụlọikwuu+ ka ọ napụta unu ma nyefee ndị iro unu n’aka unu. Ebe unu mara ụlọikwuu kwesịrị ịdị nsọ,+ ka ọ ghara ịhụ ihe ọ bụla na-adịghị mma n’ebe unu nọ, ya akwụsị iso unu.

15 “Ọ bụrụ na ohu agbapụ n’aka nna ya ukwu gbakwute gị, enyefela ya n’aka nna ya ukwu. 16 O nwere ike iso unu biri n’ebe ọ bụla masịrị ya n’otu n’ime obodo unu nke ọ họọrọ. Emegbula ya.+

17 “E nweghị nwaanyị ọ bụla bụ́ onye Izrel ga-abụ akwụna,*+ e nweghịkwa nwoke ọ bụla bụ́ onye Izrel ga-abụ akwụna.+ 18 Ewebatala ego a kwụrụ nwaanyị na-agba akwụna ma ọ bụ ego a kwụrụ nwoke na-agba akwụna* n’ụlọ Jehova bụ́ Chineke unu ka i jiri ya mezuo nkwa i kwere, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu kpọrọ ndị ahụ asị.

19 “Agwala nwanne gị ka ọ kwụọ ọmụrụ nwa,+ ma ọ̀ bụ ịkwụ ọmụrụ nwa n’ego ma ọ̀ bụ n’ihe oriri ma ọ̀ bụ n’ihe ọ bụla e nwere ike ịgwa mmadụ ka ọ kwụọ ọmụrụ nwa na ya. 20 I nwere ike ịgwa onye mba ọzọ ka ọ kwụọ gị ọmụrụ nwa,+ ma agwala nwanne gị ka ọ kwụọ gị ọmụrụ nwa,+ ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie gị n’ihe ọ bụla ị ga-eme n’ala unu na-aga iweghara.+

21 “Ọ bụrụ na i kwe Jehova bụ́ Chineke gị nkwa,+ egbula oge imezu ihe i kwere ná nkwa.+ N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-achọrịrị ka i mezuo ya. Ọ bụrụ na i mezughị ya, i mehiela.+ 22 Ma, ọ bụrụ na i kweghị nkwa, e nweghị mmehie i mere.+ 23 I kwesịrị imezu ihe ọ bụla i kwuru.+ Ị ga-enyekwa Jehova bụ́ Chineke gị onyinye ọ bụla si gị n’obi nke i kwere nkwa na ị ga-enye ya.+

24 “Ọ bụrụ na ị banye n’ubi vaịn onye agbata obi gị, i nwere ike ịracha mkpụrụ vaịn ole ga-eju gị* afọ, ma i kwesịghị itinye nke ọ bụla n’akpa gị.+

25 “Ọ bụrụ na ị banye n’ubi ọka onye agbata obi gị, i nwere ike iji aka ghọrọ ọka chara acha, ma i kwesịghị iji mma e ji ewe ihe ubi gburu ọka onye agbata obi gị.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya