Ilu
2 Debe iwu m na-enye gị ka i wee dị ndụ.+
Were ntụziaka* m ka ihe bara ezigbo uru ka mkpụrụ anya gị.
3 Kee ha ná mkpịsị aka gị.
Dee ha n’obi gị.+
4 Gwa amamihe, sị: “Ị bụ nwanne m nwaanyị,”
Gwakwa nghọta, sị: “Ị bụ onye ikwu m,”
5 Ka o wee chebe gị ka ị ghara ịdaba n’aka nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ,*+
N’aka nwaanyị na-akwa iko,* ka ọ ghara iji ire ụtọ ya rata gị.+
6 M si na windo ụlọ m,
Na mpio ụlọ m, ledata anya.
8 Ọ nọ na-aga n’okporo ụzọ dị nso n’ebe nwaanyị ahụ bi,
Ọ gawakwara n’ụzọ gara n’ụlọ nwaanyị ahụ
9 Mgbe anyanwụ dara, ná mgbede,+
Mgbe chi na-achọ iji, ọchịchịrị achọwakwa ịgba.
10 M wee hụ ka otu nwaanyị gara zute ya.
O jiri ejiji ka akwụna,+ ọ dịkwa aghụghọ.
11 Ọ dị aghara, ọ naghịkwa ekwe ekwe.+
E nweghị mgbe ọ na-anọ n’ụlọ.*
12 Obere oge, ọ nọ n’èzí. Obere oge, ọ nọ n’ámá.
Ọ na-aga chebiri ndị mmadụ n’isi ụzọ ọ bụla.+
13 O jidere nwa okorobịa ahụ susuo ya ọnụ.
Ebe ọ bụ na ihere anaghị eme ya, ọ gwara nwa okorobịa ahụ, sị:
Ọ bụ taa ka m mezuru nkwa m kwere.
15 Ọ bụ ya mere m ji pụta ka m zute gị,
Ka m chọọ gị. M wee chọta gị.
17 M feela mea, alo, na sinamọn n’elu àkwà m.*+
18 Bịa ka anyị ṅụjuo ịhụnanya afọ ka mmiri ruo ụtụtụ.
Ka anyị mee ibe anyị obi ụtọ ma gosi na anyị hụrụ ibe anyị n’anya,
19 N’ihi na di m anọghị n’ụlọ.
Ọ gaala ebe dị anya.
20 O bu akpa ego gaa.
Ọ bụ n’ụbọchị ọnwa ga-agbazu ka ọ ga-alọta.”
21 Ọ gwara ya okwu ruru ya n’obi wee duhie ya.+
O ji ire ụtọ rata ya.
22 Na mberede, o sooro nwaanyị ahụ ka oké ehi nke na-aga n’ebe a ga-egbu ya,
Ka onye nzuzu a ga-atụ ịga ma taa ahụhụ.+
23 Ọ nọ na-aga ruo mgbe akụ́ gbapuru imeju ya.
Ọ dị ka nnụnụ nke ji ọsọ feba n’ọnyà. Ọ maghị na ihe a o mere ga-ata isi ya.+
24 Ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị.
Ṅaakwanụ ntị n’ihe m na-ekwu.
25 Ekwela ka obi gị duba gị n’ụzọ nwaanyị ahụ.
Akpafula banye n’ụzọ ya.+
27 Ụlọ ya na-eduga ndị mmadụ n’ili.*
Ọ na-eduga n’ebe ndị nwụrụ anwụ tọgbọ.