Zekaraya
5 M leliri anya ọzọ hụ akwụkwọ mpịakọta na-efe efe. 2 Mmụọ ozi ahụ jụrụ m, sị: “Gịnị ka ị na-ahụ?”
M zara, sị: “M na-ahụ akwụkwọ mpịakọta na-efe efe. Ọ dị kubit* iri abụọ n’ogologo, dịkwa kubit iri n’obosara.”
3 O wee sị m: “Ihe a bụ ọbụbụ ọnụ nke na-agagharị n’elu ụwa niile, n’ihi na a taghị ndị na-ezu ohi+ ahụhụ n’agbanyeghị na e dere n’ihu akwụkwọ a na izu ohi bụ arụ. A taghịkwa ndị na-aṅụ iyi ụgha+ ahụhụ n’agbanyeghị na e dere n’azụ akwụkwọ a na mmadụ ịṅụ iyi ụgha bụ arụ. 4 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Ezipụla m ya. Ọ ga-abanye n’ụlọ onye ohi nakwa n’ụlọ onye ji aha m aṅụ iyi ụgha. Ọ ga-anọgide n’ime ụlọ ahụ ma bibie ya na osisi ya nakwa nkume ya.’”
5 Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu wee bịakwute m ma sị m: “Biko, lelie anya hụ ihe na-apụta.”
6 M wee jụọ ya, sị: “Gịnị ka ọ bụ?”
Ọ zara, sị: “Ọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe* na-apụta.” Ọ sịkwara: “Ọ bụ otú a ka ha dị n’ụwa niile.” 7 M wee hụ na e buliri okwuchi ya dị okirikiri nke e ji nkume led* rụọ, e nwekwara otu nwaanyị nọ ọdụ n’ime ya. 8 O wee sị: “Ihe a bụ Ajọ Omume.” O nubaghachiri ya n’ime ihe ahụ e ji atụ̀ ihe, buruzie okwuchi ahụ e ji nkume led* rụọ kwuchie ọnụ ya.
9 M leliri anya hụ ụmụ nwaanyị abụọ ndị na-abịa, ha na-efekwa efe n’ikuku. Ha nwere nku yiri nku ụgbala ọcha.* Ha wee bulie ihe ahụ e ji atụ̀ ihe elu n’agbata eluigwe na ụwa. 10 M wee jụọ mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, sị: “Ebee ka ha na-ebuga ihe ahụ e ji atụ̀ ihe?”
11 Ọ zara, sị: “Ọ bụ n’ala Shaịna,*+ ka a gaa rụọrọ nwaanyị ahụ ụlọ. A rụchaa ya, a ga-ekusa ya ebe ahụ, n’ebe o kwesịrị ịnọ.”