Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ihe E Mere 26
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

      • Ọzaya malitere ịchị Juda (1-5)

      • Ike ndị Ọzaya kpara n’agha (6-15)

      • Chineke mere ka Ọzaya rịawa ekpenta n’ihi na ọ dị mpako (16-21)

      • Mgbe Ọzaya nwụrụ (22, 23)

2 Ihe E Mere 26:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Mt 1:8
  • +2Ez 14:21

2 Ihe E Mere 26:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 14:22
  • +1Ez 9:26; 2Ez 16:6

2 Ihe E Mere 26:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 1:1; 6:1
  • +2Ez 15:2

2 Ihe E Mere 26:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 14:1, 3

2 Ihe E Mere 26:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 14:7; Ọm 1:2, 3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    12/15/2007, p. 10

2 Ihe E Mere 26:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 8:1; 2Ih 21:16; Aịz 14:29
  • +1Ih 18:1
  • +Jos 15:11, 12
  • +Jos 15:20, 46; 1Sa 5:1

2 Ihe E Mere 26:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 17:11

2 Ihe E Mere 26:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 19:36, 38; Ikp 11:15

2 Ihe E Mere 26:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 14:2, 7
  • +2Ez 14:13; Jer 31:38; Zek 14:10
  • +Neh 3:13

2 Ihe E Mere 26:10

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 9:17

2 Ihe E Mere 26:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 24:11
  • +Ọg 1:2, 3; 2Sa 24:9

2 Ihe E Mere 26:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 11:1; 13:3; 14:8; 17:14; 25:5

2 Ihe E Mere 26:14

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Èbè bụ ihe yiri katapọt.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 11:5, 12
  • +1Sa 17:4, 5
  • +Ikp 20:16; 1Sa 17:49; 1Ih 12:1, 2

2 Ihe E Mere 26:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 14:2, 7

2 Ihe E Mere 26:16

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 1:51

2 Ihe E Mere 26:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 16:39, 40; 18:7
  • +Ọp 30:7; 1Ih 23:13

2 Ihe E Mere 26:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 16:10; 25:15, 16
  • +Ọg 12:10; 2Ez 5:27

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, p. 1889

2 Ihe E Mere 26:20

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, p. 1885

2 Ihe E Mere 26:21

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’obí.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 13:45, 46; Ọg 5:2; 12:14, 15
  • +2Ez 15:5-7

2 Ihe E Mere 26:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 1:1; 6:1

2 Ihe E Mere 26:23

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ọ ga-abụ na ala a ha liri ya dị nso n’ala a na-eli ndị eze.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 15:32

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Ihe 26:1Mt 1:8
2 Ihe 26:12Ez 14:21
2 Ihe 26:22Ez 14:22
2 Ihe 26:21Ez 9:26; 2Ez 16:6
2 Ihe 26:3Aịz 1:1; 6:1
2 Ihe 26:32Ez 15:2
2 Ihe 26:42Ez 14:1, 3
2 Ihe 26:52Ih 14:7; Ọm 1:2, 3
2 Ihe 26:62Sa 8:1; 2Ih 21:16; Aịz 14:29
2 Ihe 26:61Ih 18:1
2 Ihe 26:6Jos 15:11, 12
2 Ihe 26:6Jos 15:20, 46; 1Sa 5:1
2 Ihe 26:72Ih 17:11
2 Ihe 26:8Je 19:36, 38; Ikp 11:15
2 Ihe 26:92Ih 14:2, 7
2 Ihe 26:92Ez 14:13; Jer 31:38; Zek 14:10
2 Ihe 26:9Neh 3:13
2 Ihe 26:102Ez 9:17
2 Ihe 26:112Ih 24:11
2 Ihe 26:11Ọg 1:2, 3; 2Sa 24:9
2 Ihe 26:132Ih 11:1; 13:3; 14:8; 17:14; 25:5
2 Ihe 26:142Ih 11:5, 12
2 Ihe 26:141Sa 17:4, 5
2 Ihe 26:14Ikp 20:16; 1Sa 17:49; 1Ih 12:1, 2
2 Ihe 26:152Ih 14:2, 7
2 Ihe 26:16Ọg 1:51
2 Ihe 26:18Ọg 16:39, 40; 18:7
2 Ihe 26:18Ọp 30:7; 1Ih 23:13
2 Ihe 26:192Ih 16:10; 25:15, 16
2 Ihe 26:19Ọg 12:10; 2Ez 5:27
2 Ihe 26:21Le 13:45, 46; Ọg 5:2; 12:14, 15
2 Ihe 26:212Ez 15:5-7
2 Ihe 26:22Aịz 1:1; 6:1
2 Ihe 26:232Ez 15:32
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ihe E Mere 26:1-23

Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

26 Ndị Juda niile wee kpọrọ Ọzaya,+ chie ya eze, ya anọchie Amazaya nna ya.+ Ọ dị afọ iri na isii mgbe ahụ. 2 Mgbe Eze Amazaya nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ,+ Ọzaya nwa ya weghaara Ilọt,+ mee ka ọ bụrụghachi obodo ndị Juda. 3 Ọzaya+ dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri ise na abụọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jekọlaya. Ọ bụ onye Jeruselem.+ 4 Ọ nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova otú Amazaya nna ya mere.+ 5 Ọ nọkwa na-ejere Chineke ozi n’oge Zekaraya dị ndụ, onye kụziiri ya ịtụ egwu Chineke. N’oge ọ nọ na-ejere Jehova ozi, ezi Chineke mere ka ihe gaziere ya.+

6 Ọ gara lụso ndị Filistia agha+ ma tipuo mgbidi Gat,+ mgbidi Jabne,+ na mgbidi Ashdọd.+ Ọ rụkwara obodo dị iche iche n’ebe dị nso n’Ashdọd nakwa n’ebe ndị Filistia nwe. 7 Ezi Chineke nọkwa na-enyere ya aka, ya emerie ndị Filistia, ndị Arebia+ bi na Gọbel, na ndị Meyunim. 8 Ndị Amọn+ malitekwara ịtụrụ Ọzaya ụtụ. Ka oge na-aga, ude ya ruru Ijipt, n’ihi na ọ bịara sie ezigbo ike. 9 Ọzaya rụkwara ụlọ nche dị iche iche+ na Jeruselem, rụsiekwa ha ike. Ebe ndị ọ rụrụ ha bụ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Dị n’Ebe Mgbidi Sụkọtara Isi,+ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ndagwurugwu,+ nakwa n’Idé Ji Mgbidi. 10 Ọ rụkwara ụlọ nche+ n’ala ịkpa, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri (n’ihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ). O mekwara otú ahụ na Shefila* nakwa n’ala dị larịị. O nwere ndị ọrụ ubi na ndị na-arụ ọrụ n’ubi vaịn dị n’ugwu nakwa na Kamel, n’ihi na ọrụ ubi na-amasị ya.

11 Ọzaya nwekwara ndị agha nwere ngwá agha dị iche iche. A na-ahazi ha n’ìgwè n’ìgwè ma ha gawa agha. Jeayel bụ́ odeakwụkwọ+ na Measaya bụ́ onyeisi gụrụ ha ọnụ, debakwa aha ha n’akwụkwọ.+ Ọ bụ Hananaya, otu n’ime ndị eze mere ndị isi, bụ onyeisi mmadụ abụọ a. 12 Ndị niile bụ́ ndị isi ọnụmara, bụrụkwa ndị isi ndị a bụ́ dike n’agha, dị puku mmadụ abụọ na narị isii (2,600). 13 Ndị agha ha na-edu aga agha dị narị puku mmadụ atọ, puku asaa na narị ise (307,500). Ha niile bụ ndị agha siri ezigbo ike, ha na-alụsokwa ndị iro eze agha.+ 14 Ọzaya nyere ndị agha ya niile ọta, ube,+ okpu agha, uwe agha,+ ụta, na nkume e ji agba èbè.*+ 15 Ndị ọkachamara nọkwa na Jeruselem rụọrọ ya ígwè ndị e ji alụ agha. A rụnyere ígwè ndị ahụ n’ụlọ nche dị iche iche+ nakwa n’elu ebe dị iche iche mgbidi sụkọtara isi. A na-eji ha agbapụ akụ́ na nnukwu nkume. Ọzaya nọkwa na-ede ude ebe niile n’ihi na Chineke nyeere ya ezigbo aka, ya esie ike.

16 Ma ozugbo o siri ike, ọ bịara dị mpako, si otú ahụ kpatara onwe ya nsogbu. O mebiri iwu Jehova Chineke ya, banye n’ụlọ nsọ Jehova ka ọ mụnye insens* ọkụ n’elu ebe ịchụàjà insens.+ 17 Ma, Azaraya onye nchụàjà na ndị nchụàjà Jehova iri asatọ ndị ọzọ, ndị katara obi, sochiri ya azụ ozugbo. 18 Ha gakwuuru Eze Ọzaya, sị ya: “Ọzaya, ọ bụghị gị kwesịrị ịmụnyere Jehova insens ọkụ.+ Ọ bụ naanị ndị nchụàjà kwesịrị ịna-amụnye insens ọkụ, n’ihi na ha bụ ụmụ ụmụ Erọn,+ ndị e doro nsọ. Si n’ụlọ nsọ a pụọ, n’ihi na i meela ihe ọjọọ. Jehova Chineke agaghị eme ka a kwanyere gị ùgwù n’ihi ihe a i mere.”

19 Ma Ọzaya were ezigbo iwe.+ O jikwa ihe a na-eji etinye insens ka o jiri ya mụnye insens ọkụ. Ka ọ nọ na-ewesa ndị nchụàjà ahụ iwe, ekpenta+ pụtara ya n’egedege ihu n’ụlọ Jehova, n’akụkụ ebe ịchụàjà insens. Ndị nchụàjà ahụ nọkwa ebe ahụ. 20 Mgbe Azaraya onyeisi nchụàjà na ndị nchụàjà niile ahụ lere ya anya, ha hụrụ ekpenta n’egedege ihu ya. Ha meziri ọsọ ọsọ kpọpụ ya ebe ahụ. Yanwa pụwakwara ngwa ngwa n’ihi na Jehova ataala ya ahụhụ.

21 Eze Ọzaya rịagidere ekpenta ruo ụbọchị ọ nwụrụ. O bikwa n’ụlọ a rụpụrụ iche,+ n’ihi na a machiri ya ịga n’ụlọ Jehova. Jotam nwa ya nọzi na-ahụ maka otú ihe si na-aga n’ụlọ* eze, na-ekpekwara ndị obodo ahụ ikpe.+

22 Aịzaya onye amụma,+ bụ́ nwa Emọz, dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Ọzaya, malite ná mbido ruo ná ngwụcha, n’akwụkwọ. 23 Ọzaya mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e lie ya ebe e liri nna nna ya hà. Ma, ha liri ya n’ala dị iche bụ́kwa nke ndị eze,* n’ihi na ha sịrị: “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam nwa ya+ nọchiri ya, malite ịchị.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya