Levitikọs
15 Jehova gwakwara Mosis na Erọn, sị: 2 “Gwanụ ndị Izrel okwu, sịnụ ha, ‘Ọ bụrụ na ihe na-agbapụta nwoke n’ihe o ji bụrụ nwoke,* ihe ahụ na-agbapụta ya emeela ka ọ bụrụ onye na-adịghị ọcha.+ 3 Ọ bụ onye na-adịghị ọcha n’ihi ihe ahụ na-agbapụta ya n’ahụ́, ma ihe ahụ ọ̀ ka nọ na-agbapụta ya n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ̀ sụchiri ihe o ji bụrụ nwoke, ọ ka bụ onye na-adịghị ọcha.
4 “‘Àkwà* ọ bụla onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ dinara na ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Ihe ọ bụla ọ nọrọ ọdụ na ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. 5 Onye ọ bụla nke metụrụ àkwà* ya aka ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 6 Onye ọ bụla nọrọ ọdụ n’ihe onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ nọrọ ọdụ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 7 Onye ọ bụla metụrụ onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ aka ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 8 Ọ bụrụ na onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ agbụọ onye dị ọcha asọ mmiri, onye ahụ ọ gbụrụ asọ mmiri ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 9 Ihe ọ bụla onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ ji nọrọ ọdụ n’elu anụmanụ ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. 10 Onye ọ bụla metụrụ ihe ọ bụla ọ nọrọ ọdụ na ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. Onye ọ bụla buuru ihe ndị ahụ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 11 Ọ bụrụ na onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́+ emetụ mmadụ aka mgbe ọ na-akwọbeghị aka ya na mmiri, onye o metụrụ aka ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 12 A ga-akụri ite ụrọ onye ahụ ihe na-agbapụta n’ahụ́ metụrụ aka, jirikwa mmiri saa arịa ọ bụla e ji osisi rụọ.+
13 “‘Mgbe ihe ahụ kwụsịrị ịgbapụta onye ahụ n’ahụ́, ya abụrụ na ahụ́ adịla onye ahụ mma, ọ ga-anọ ụbọchị asaa. Ụbọchị asaa ahụ gachaa, ọ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri iyi saa ahụ́. Ọ ga-abụzi onye dị ọcha.+ 14 N’ụbọchị nke asatọ, ọ ga-anwụrụ nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ+ bịa n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Ọ ga-enye ha onye nchụàjà. 15 Onye nchụàjà ga-achụ ha n’àjà. Ọ ga-eji otu chụọ àjà mmehie, jiri nke ọzọ chụọ àjà a na-esu ọkụ. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya n’ihu Jehova n’ihi ihe ahụ nọ na-agbapụta ya n’ahụ́.
16 “‘Ọ bụrụ na ọbara ọcha agbapụta nwoke n’ahụ́, ọ ga-eji mmiri saa ahụ́ ya niile. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 17 Ọ ga-eji mmiri saa uwe ọ bụla na akpụkpọ anụ ọ bụla ọbara ọcha ahụ mesara. Ihe ahụ o mesara ga-abụ ihe na-adịghị ọcha ruo mgbede.
18 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị enwee mmekọahụ,* ọbara ọcha agbapụta nwoke ahụ n’ahụ́, ha ga-eji mmiri saa ahụ́. Ha ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ruo mgbede.+
19 “‘Ọ bụrụ na ọbara agbapụta nwaanyị n’ahụ́, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa maka nsọ ya ọ na-ahụ.+ Onye ọ bụla metụrụ ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 20 Ihe ọ bụla o dinara ala na ya mgbe ọ na-ahụ nsọ ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Ihe ọ bụla ọ nọkwara ọdụ na ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.+ 21 Onye ọ bụla metụrụ àkwà* ya aka ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 22 Onye ọ bụla metụrụ aka n’ihe ọ bụla ọ nọrọ ọdụ na ya ga-asụ uwe ya ma jiri mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 23 Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ nọdụrụ n’àkwà* ma ọ bụ n’ihe ọzọ, onye metụrụ ihe ahụ ọ nọdụrụ na ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 24 Ọ bụrụ na ya na nwoke enwee mmekọahụ,* ọbara nsọ ya emesa ya,+ nwoke ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa. Àkwà* ọ bụla nwoke ahụ dinara ala na ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.
25 “‘Ọ bụrụ na ọbara agbaa nwaanyị ọtụtụ ụbọchị+ mgbe na-abụghị oge o ji ahụ nsọ ya,+ ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọbara agbaa ya gafee ụbọchị ole ọbara na-agba ya n’oge ọ na-ahụ nsọ ya, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha n’ụbọchị niile ọbara na-agbapụta ya n’ahụ́, otú ọ na-adị n’oge ọ na-ahụ nsọ ya. 26 Àkwà* ọ bụla o dinara na ya n’ụbọchị ndị ahụ ọbara na-agbapụta ya n’ahụ́ ga-abụ ihe na-adịghị ọcha, otú ọ na-adị n’oge ọ na-ahụ nsọ ya.+ Ihe ọ bụla ọ nọkwara ọdụ na ya ga-abụ ihe na-adịghị ọcha, otú ọ na-adị n’oge ọ na-ahụ nsọ ya. 27 Onye ọ bụla metụrụ ihe ndị ahụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha. Ọ ga-asụ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+
28 “‘Ma, mgbe ọbara ahụ kwụsịrị ịgbapụta ya n’ahụ́, ya abụrụ na ahụ́ adịla ya mma, ọ ga-anọ ụbọchị asaa. Ụbọchị asaa ahụ gachaa, ọ ga-abụzi onye dị ọcha.+ 29 N’ụbọchị nke asatọ, ọ ga-anwụrụ nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ+ nwụtara onye nchụàjà n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.+ 30 Onye nchụàjà ga-eji otu chụọ àjà mmehie, jiri nke ọzọ chụọ àjà a na-esu ọkụ. Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya n’ihu Jehova n’ihi ọbara ahụ na-adịghị ọcha nọ na-agbapụta ya n’ahụ́.+
31 “‘Unu ga-esi otú a nyere ndị Izrel aka ka ha na-adị ọcha, ka ha ghara imerụ ụlọikwuu m, nke dị n’etiti ha,+ wee nwụọ.
32 “‘Ihe a bụ iwu banyere nwoke ihe na-agbapụta n’ahụ́, nwoke na-adịghị ọcha n’ihi ọbara ọcha na-agbapụta ya n’ahụ́,+ 33 nwaanyị nọ ná nsọ ya,+ nwoke ọ bụla ma ọ bụ nwaanyị ọ bụla ihe na-agbapụta n’ahụ́,+ nakwa banyere nwoke ya na nwaanyị na-adịghị ọcha nwere mmekọahụ.’”*