Job
34 Elaịhu kwukwara, sị:
2 “Unu ndị ma ihe, geenụ ntị n’ihe m na-ekwu.
Ṅaanụ m ntị, unu ndị ọkachamara.
4 Ka anyị jiri aka anyị chọpụta ihe bụ́ ihe ziri ezi.
Ka anyị kpebie ihe bụ́ ihe dị mma.
5 N’ihi na Job sịrị, ‘Aka m dị ọcha.+
Ma Chineke ekpeela m ikpe mkpegbu.+
6 M̀ ga-agha ụgha, sị na e kwesịrị ịma m ikpe?
Ọnyá m anaghị ala ala n’agbanyeghị na e nweghị iwu m dara.’+
7 È nwere nwoke ọzọ dị ka Job,
Onye a na-akwa emo, ya ana-aṅụ ya ka mmiri?
8 Ya na ndị na-eme ihe ọjọọ bụzi otu.
Ya na ndị ajọ omume dịkwa ná mma.+
10 N’ihi ya, geenụ m ntị, unu ndị na-aghọta ihe:
Chineke emekataghị mee ihe ọjọọ.+
Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emekataghị mee ihe na-adịghị mma.+
12 N’eziokwu, Chineke anaghị eme ihe ọjọọ.+
Onye Pụrụ Ime Ihe Niile anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.+
13 Ònye nyefere ụwa n’aka ya?
Ọ̀ bụkwa onye họpụtara ya ka o lekọtawa ụwa niile?
14 Ọ bụrụ na o lekwasị ndị mmadụ anya,
Ọ bụrụ na o kpebie ịnapụ ha mmụọ ya na ume ha na-eku,+
Mmadụ ga-alaghachikwa n’ájá.+
16 N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-aghọta ihe, ṅaa ntị.
Gee ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu.
17 Ò kwesịrị ịbụ onye kpọrọ ikpe ziri ezi asị na-achị?
Ka ị̀ ga-akpọ onye dị ike nke na-eme ezi omume onye ọjọọ?
19 E nwere Onye na-anaghị ele ndị isi anya n’ihu,
Onye na-anaghịkwa ahapụ ogbenye menyere ọgaranya,+
N’ihi na ọ bụ ya kere ha niile.+
20 Ha nwere ike ịnwụ na mberede,+ n’etiti abalị.+
Ha na-amasi jijiji ike wee nwụọ.
Ndị dị ike na-alakwa n’iyi, ma ọ bụghị mmadụ na-ala ha n’iyi.+
23 N’ihi na e nweghị onye Chineke yiiri oge
Ọ ga-abịa n’ihu Chineke ka o kpee ya ikpe.
25 N’ihi na ọ ma ihe ha na-eme.+
Ọ na-emeri ha n’abalị, e bibie ha.+
26 Ọ na-ebibi ha n’ihi ajọ omume ha,
N’ebe mmadụ niile ga-ahụ ha,+
27 N’ihi na ha akwụsịla iso ya,+
E nweghịkwa ihe ha ji ihe ọ bụla ọ na-eme kpọrọ.+
28 Ha na-eme ka ndị ogbenye besara ya ákwá,
Nke na-eme ka ọ nụ ákwá ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka.+
29 Ọ bụrụ na Chineke agbachi nkịtị, ònye ga-ama ya ikpe?
Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, ònye ga-ahụ ya?
Ma ọ̀ bụ mba ma ọ̀ bụ otu onye ka o zooro ihu ya, ọ bụ otu ihe ahụ ga-eme,
30 Ya bụ, ọ gaghị ekwe ka onye na-anaghị asọpụrụ ya* chịa+
Ma ọ bụ kwe ka onye ahụ mee ka ọnyà ma ndị mmadụ.
32 Kụziere m ihe m na-ahụbeghị.
Ọ bụrụ na e nwere ihe ọjọọ m mere, agaghị m eme ya ọzọ’?
33 Ọ̀ ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ otú i si chọọ ebe ọ bụ na ị jụrụ ikpe ya?
Ọ bụ gị ga-ekpebi, ọ bụghị m.
Gwazie m ihe ahụ ị ma.
34 Ndị na-aghọta ihe,
Ya bụ, onye ọ bụla ma ihe nke na-anụ ihe m na-ekwu, ga-asị m,
Ihe ọ na-ekwu gosiri na ọ naghị aghọta ihe.’
37 A ka na-ekwu na o mehiere, ya ana-enupụkwa isi.+
Ọ na-akụ aka iji kwaa anyị emo,
Ọ na-ebokwa ezi Chineke ọtụtụ ebubo.”+