Ezra
5 Ndị amụma bụ́ Hagaị+ na Zekaraya+ nwa nwa Ido+ wee buoro ndị Juu nọ na Juda na Jeruselem amụma n’aha Chineke Izrel, onye nọnyeere ha. 2 Ọ bụ mgbe ahụ ka Zerubabel+ nwa Shieltiel na Jeshụa+ nwa Jehozadak malitere ịrụghachi ụlọ Chineke+ dị na Jeruselem. Ndị amụma Chineke nọnyeere ha ma na-enyere ha aka.+ 3 N’oge ahụ, Tatenaị bụ́ gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis* na Shita-bọzenaị na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ bịakwutere ha ma jụọ ha, sị: “Ònye nyere unu iwu ka unu rụọ ụlọ a ma gwunyechaa ogidi ndị a?” 4 Ha jụkwara ha, sị: “Gịnị bụ aha ụmụ nwoke na-arụ ụlọ a?” 5 Ma Chineke nọ na-echebe* ndị okenye ndị Juu.+ Ha akwụsịghịkwa ha ịrụ ọrụ ahụ ruo mgbe e zigaara Darayọs ozi, ya ezitekwa akwụkwọ ozi banyere okwu a.
6 Ihe a bụ ihe e dere n’akwụkwọ ozi ahụ Tatenaị bụ́ gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis na Shita-bọzenaị na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ, ndị osote gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis, zigaara Eze Darayọs. 7 Ha zigaara ya ozi. Ihe a ka ha dere:
“Eze Darayọs:
“Udo dịrị gị! 8 Ka eze mara na anyị gara n’ógbè* Juda, n’ụlọ Chineke ukwu. E ji nnukwu nkume na-arụ ahụ́ ụlọ ahụ, a na-adọnyekwa nnukwu osisi na ya. Ndị ahụ ji obi ha niile na-arụ ọrụ ahụ, ọ na-agakwa n’ihu n’ihu n’ihi mbọ ha na-agba. 9 Anyị wee jụọ ndị okenye ha ajụjụ, sị ha: ‘Ònye nyere unu iwu ka unu rụọ ụlọ a ma gwunyechaa ogidi ndị a?’+ 10 Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị nwee ike ide aha ụmụ nwoke bụ́ ndị isi ha, ka anyị wee mee ka ị mara ndị ha bụ.
11 “Ihe a ka ha zara anyị: ‘Anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa. Anyị na-arụghachi ụlọ a rụrụ ọtụtụ afọ gara aga, nke otu eze ukwu Izrel rụrụ ma rụchaa.+ 12 Ma, ebe ọ bụ na ndị nna nna anyị kpasuru Chineke nke eluigwe iwe,+ o nyefere ha n’aka Eze Nebukadneza+ nke Babịlọn onye Kaldia, bụ́ onye kwadara ụlọ a+ ma dọrọ ndị anyị n’agha laa Babịlọn.+ 13 Ma n’afọ nke mbụ n’ọchịchị Eze Saịrọs nke Babịlọn, Eze Saịrọs nyere iwu ka a rụghachi ụlọ Chineke a.+ 14 Eze Saịrọs sikwa n’ụlọ chi ndị Babịlọn bupụta arịa ọlaedo na nke ọlaọcha ndị dịbu n’ụlọ Chineke, bụ́ ndị Nebukadneza bukọọrọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem ma bute ha n’ụlọ chi ndị Babịlọn.+ O bunyere ha otu nwoke aha ya bụ Sheshbaza,*+ onye Saịrọs mere gọvanọ.+ 15 Saịrọs sịrị ya: “Buru arịa ndị a. Gaa busa ha n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ka a rụghachikwa ụlọ Chineke n’ebe ọ dịbu.”+ 16 Sheshbaza wee bịa, tọọ ntọala ụlọ Chineke+ dị na Jeruselem. A na-arụ ya kemgbe ahụ ruo ugbu a, ma a rụchabeghị ya.’+
17 “Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka a chọọ n’akwụkwọ ndị dị n’ebe a na-edowe akụ̀ eze na Babịlọn iji mata ma Eze Saịrọs ò nyere iwu ka a rụghachi ụlọ Chineke dị na Jeruselem.+ Ka eze zitekwara anyị ihe o kpebiri n’okwu a.”