Job
19 Job wee sị:
3 Unu abaarala m mba* ugboro iri ugbu a.
Ihere anaghị eme unu na unu na-emesi m ike.+
4 Ọ bụrụgodị na m mere mmehie,
Ọ bụ n’isi m ka mmehie m dị.
5 Ọ bụrụ na unu ana-ebuli onwe unu elu,
Na-ekwu na ihere nsogbu m nọ na ya na-ebutere m kwesịrị m,
6 Marazienụ na ọ bụ Chineke duhiere m,
O jirikwala ụgbụ o ji achụ nta jide m.
7 M na-eti mkpu n’ihi ahụhụ m na-ata, ma e nweghị onye na-aza m.+
M na-arịọ ka e nyere m aka, ma e nweghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi.+
8 O ji nkume rụchie mgbidi n’ebe m si agafe, enweghịkwa m ike ịgafe.
O meekwala ka ọchịchịrị gbachie okporo ụzọ m.+
9 O meela ka m gharazie inwe ùgwù,
Kpupụkwa m okpueze n’isi.
10 O si n’akụkụ niile na-akụrisị m ruo mgbe ọ lara m n’iyi.
Ọ na-eme ka m ghara inwe olileanya otú osisi e fopụrụ efopụ na-enweghị olileanya.
12 Ndị agha ya abịakọtala ka ha lụso m agha,
Ha gbakwara ụlọikwuu m gburugburu.
14 Ezigbo ndị enyi* m ahapụla m,
Ndị m ma nke ọma echefuokwala m,+
15 Ndị bịara n’ụlọ m+ na ndị ohu m nwaanyị weere m ka onye mbịarambịa.
Abụ m onye mba ọzọ n’anya ha.
16 M na-akpọ onye na-ejere m ozi òkù, ma ọ naghị aza m.
Eji m ọnụ m na-arịọ ya ka o metere m ebere.*
18 Ụmụaka kpọdịrị m asị.
M bilie ọtọ, ha na-amalite iji m eme ihe ọchị.
Ejisiri m ike gbanahụ ọnwụ.*
23 Ọ gaara amasị m ma a sị na e dere okwu m ede,
Ma a sị na e dere ya n’akwụkwọ.
24 Ọ gaara amasị m ma a sị na e ji mkpịsị ígwè na nkume led*
Denye ya n’oké nkume ruo mgbe ebighị ebi.
25 N’ihi na o doro m anya na onye mgbapụta m+ dị ndụ.
Ọ ga-emecha bịa guzoro n’elu ụwa.*
26 Mgbe e si otú a mebichaa akpụkpọ ahụ́ m
N’oge m ka nọ ndụ, m ga-ahụ Chineke,
27 Bụ́ onye m ga-ahụ,
Onye anya m ga-ahụ, ọ bụghị anya onye ọzọ.+
Ma, adaala m mbà n’obi.*
28 N’ihi na unu na-asị, ‘Olee otú anyị si na-akpagbu ya?’+
Ebe ọ bụ na nsogbu m si m n’aka.
Unu kwesịrị ịma na e nwere onyeikpe.”+