Abụ Ọma
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ọma. Abụ.
66 Unu niile ndị bi n’ụwa, tienụ mkpu ọṅụ, tookwanụ Chineke.+
2 Bụọnụ abụ iji too aha ya dị ebube.
Toonụ ya, jaakwanụ ya mma.+
3 Sịnụ Chineke: “Ọrụ gị niile na-eme nnọọ ka a na-atụ egwu gị!+
Ndị iro gị ga-ama jijiji n’ihu gị+
Maka na ike gị dị ukwuu.
4 Ndị niile bi n’ụwa ga-akpọrọ gị isiala.+
Ha ga-abụku gị abụ otuto.
Ha ga-abụ abụ iji too aha gị.”+ (Sila)
5 Bịanụ hụ ọrụ dị iche iche Chineke na-arụ.
Ihe ọ na-emere ndị mmadụ dị ịtụnanya.+
6 O mere ka oké osimiri bụrụ ala nkịtị.+
Ha ji ụkwụ gafee osimiri.+
Anyị ṅụrịrị ọṅụ n’ebe ahụ n’ihi ihe o meere anyị.+
7 O ji ike ya na-achị ruo mgbe ebighị ebi.+
Anya ya na-ahụ mba niile.+
Ndị isi ike ekwesịghị ibuli onwe ha elu.+ (Sila)
Ọ naghị ekwe ka anyị zọhie ụkwụ.*+
10 N’ihi na i nyochaala anyị, Chineke.+
Ị nụchaala anyị otú e si anụcha ọlaọcha.
11 I meela ka ụgbụ e ji siere anyị ọnyà jide anyị.
I boro anyị ibu na-anyịgbu anyị.
12 I kwere ka mmadụ efu zọpịa anyị.*
Anyị tara nnukwu ahụhụ ka à ga-asị na anyị si n’etiti ọkụ nakwa n’etiti mmiri gafere.
I wee kpọbata anyị n’ebe obi ga-eru anyị ala.
13 M ga-eji àjà a na-esucha ọkụ bata n’ụlọ gị.+
15 M ga-eji anụ ndị gbara agba chụọrọ gị àjà a na-esu ọkụ,
M ga-eji ebule chụọrọ gị àjà.
M ga-achụ oké ehi na mkpi n’àjà. (Sila)
17 M ji ọnụ m kpọkuo ya,
M jikwa ire m too ya.
Ọ ṅara ntị n’ekpere m.+