Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 1 Ndị Eze 13
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ

      • E buru amụma ihe ga-eme ebe ịchụàjà dị na Betel (1-10)

        • Ebe ịchụàjà ahụ gbawara (5)

      • Onye nke Chineke nupụrụ isi (11-34)

1 Ndị Eze 13:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 23:16, 17
  • +1Ez 12:32; Em 3:14

1 Ndị Eze 13:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 21:24; 22:1
  • +2Ez 23:15, 16; 2Ih 34:33

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    5/1/2014, p. 5

1 Ndị Eze 13:3

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “Ntụ nke ya na abụba gwakọtara.”

1 Ndị Eze 13:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 16:10; Jer 20:2
  • +2Ez 6:18

1 Ndị Eze 13:6

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ka obi ya jụrụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 10:16, 17; Ọg 21:7; Jer 37:3; Ọrụ 8:24

1 Ndị Eze 13:7

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/15/2008, p. 8

1 Ndị Eze 13:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 13:1

1 Ndị Eze 13:18

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/15/2008, p. 9

1 Ndị Eze 13:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 13:30; 2Ez 23:17, 18

1 Ndị Eze 13:23

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “doweere onye amụma ahụ ọ kpọghachitere.”

1 Ndị Eze 13:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 6:7; 1Ez 20:35, 36; 2Ez 17:25

1 Ndị Eze 13:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 13:9
  • +1Ez 13:21, 22

1 Ndị Eze 13:31

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 23:17, 18

1 Ndị Eze 13:32

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 26:30; 1Ez 12:29, 31
  • +2Ez 23:15, 19

1 Ndị Eze 13:33

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:25, 31
  • +2Ih 11:14, 15

1 Ndị Eze 13:34

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 16:30, 31; 2Ez 3:1, 3; 10:31; 13:1, 2
  • +1Ez 14:10; 15:25-29; 2Ez 17:22, 23

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

1 Eze 13:12Ez 23:16, 17
1 Eze 13:11Ez 12:32; Em 3:14
1 Eze 13:22Ez 21:24; 22:1
1 Eze 13:22Ez 23:15, 16; 2Ih 34:33
1 Eze 13:42Ih 16:10; Jer 20:2
1 Eze 13:42Ez 6:18
1 Eze 13:6Ọp 10:16, 17; Ọg 21:7; Jer 37:3; Ọrụ 8:24
1 Eze 13:141Ez 13:1
1 Eze 13:221Ez 13:30; 2Ez 23:17, 18
1 Eze 13:242Sa 6:7; 1Ez 20:35, 36; 2Ez 17:25
1 Eze 13:261Ez 13:9
1 Eze 13:261Ez 13:21, 22
1 Eze 13:312Ez 23:17, 18
1 Eze 13:32Le 26:30; 1Ez 12:29, 31
1 Eze 13:322Ez 23:15, 19
1 Eze 13:331Ez 12:25, 31
1 Eze 13:332Ih 11:14, 15
1 Eze 13:341Ez 16:30, 31; 2Ez 3:1, 3; 10:31; 13:1, 2
1 Eze 13:341Ez 14:10; 15:25-29; 2Ez 17:22, 23
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
1 Ndị Eze 13:1-34

Ndị Eze nke Mbụ

13 Mgbe otu onye nke Chineke+ si Juda rute Betel otú Jehova gwara ya, Jeroboam guzo n’akụkụ ebe ịchụàjà+ ka o suo àjà ọkụ. 2 Onye nke Chineke ji olu dara ụda kwuo ihe Jehova gwara ya ga-eme ebe ịchụàjà ahụ. Ọ sịrị: “Ebe ịchụàjà, ebe ịchụàjà, Jehova kwuru, sị: ‘A ga-amụ nwa nwoke n’ezinụlọ Devid. A ga-agụkwa ya Josaya!+ N’elu gị ka ọ ga-egbu ndị nchụàjà nke ebe ndị dị elu, ndị na-esu àjà ọkụ n’elu gị. Ọ ga-akpọkwa ọkpụkpụ ndị mmadụ ọkụ n’elu gị.’”+ 3 O kwuru ihe ebube ga-eme n’ụbọchị ahụ. Ọ sịrị: “Ihe dị ebube nke ga-eme iji gosi na Jehova kwuru ihe a bụ: A ga-eme ka ebe ịchụàjà a gbawaa. Ntụ* nke dị n’elu ya ga-awụpụsịkwa.”

4 Ozugbo Jeroboam nụrụ ihe ahụ onye nke ezi Chineke kwuru ga-eme ebe ịchụàjà ahụ dị na Betel, o wepụrụ aka ya n’ebe ịchụàjà ahụ ma tụwa onye nke ezi Chineke aka, sị: “Jidenụ ya!”+ Aka ahụ ọ nọ na-atụ ya akpọnwụọ ozugbo. O nweghịkwa ike imegharị ya emegharị.+ 5 Ebe ịchụàjà ahụ gbawara, ntụ dị na ya awụpụsịakwa otú Jehova si n’ọnụ onye nke ezi Chineke kwuo na ọ ga-eme.

6 Eze wee sị onye nke ezi Chineke: “Biko, rịọ Jehova bụ́ Chineke gị ka o meere m amara,* kpeekwara m ekpere ka o mee ka aka m dịghachi mma.”+ Onye nke ezi Chineke wee rịọ Jehova ka o meere eze amara, aka eze adịghachi mma, dịrị otú ọ dị na mbụ. 7 Eze gwaziri onye nke ezi Chineke, sị: “Soro m ka anyị gaa n’ụlọ ka i rie ihe, ka m nyekwa gị onyinye.” 8 Ma onye nke ezi Chineke sịrị eze: “I nyegodị m ọkara ihe niile dị n’ụlọ gị, agaghị m eso gị aga. Agaghịkwa m eri ihe ma ọ bụ ṅụọ mmiri ebe a. 9 N’ihi na Jehova nyere m iwu, sị, ‘Erila ihe, aṅụkwala mmiri, esikwala ụzọ i si gaa laghachi.’” 10 O sizi ụzọ ọzọ lawa, o sighịkwa ụzọ o si bịa Betel laghachiwe.

11 Ma, e nwere otu onye amụma merela agadi bi na Betel. Mgbe ụmụ ya lọrutere, ha kọọrọ ya ihe niile onye nke ezi Chineke mere na Betel n’ụbọchị ahụ na ihe ọ gwara eze. Mgbe ha kọchaara nna ha ihe a, 12 ya ajụọ ha, sị: “Olee ụzọ o si lawa?” Ụmụ ya egosi ya ụzọ onye nke ezi Chineke nke si Juda bịa si lawa. 13 Ya asị ụmụ ya: “Dowerenụ m ihe m ga-eji nọrọ ọdụ n’elu jakị m.” Ha wee dowere ya ihe ahụ n’elu jakị, ya arịgoro na ya.

14 Ọ chụụrụ onye nke ezi Chineke ahụ gawa ma hụ ya ka ọ nọ ọdụ n’okpuru otu nnukwu osisi. Ọ jụkwara ya, sị: “Ọ̀ bụ gị bụ onye nke ezi Chineke nke si Juda bịa?”+ Ya asị: “Ọ bụ m.” 15 Ya asị ya: “Soro m ka ị gaa rie nri n’ụlọ m.” 16 Ma ọ sịrị: “Agaghị m eso gị laghachi, agaghịkwa m aga n’ụlọ gị. Agaghị m eso gị rie nri ma ọ bụ ṅụọ mmiri ebe a. 17 Jehova nyere m iwu, sị, ‘Erila nri, aṅụkwala mmiri ebe ahụ. Esikwala ụzọ i si gaa laghachi.’” 18 Ya asị ya: “Mụnwa bụ onye amụma otú ị bụ. Otu mmụọ ozi gwara m ihe Jehova gwara ya, sị, ‘Gwa ya ka o soro gị gaa n’ụlọ gị rie nri ma ṅụọ mmiri.’” (Ọ ghọgburu ya.) 19 N’ihi ya, o sooro ya laghachi ka o rie nri ma ṅụọ mmiri n’ụlọ ya.

20 Ka ha nọ na tebụl, Jehova gwara onye amụma ahụ kpọghachiri onye nke ezi Chineke okwu, 21 ya ejiri olu dara ụda gwa onye nke ezi Chineke ahụ si Juda, sị: “Jehova kwuru, sị: ‘Ebe ọ bụ na i meghị ihe Jehova gwara gị, i debeghịkwa iwu Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị, 22 kama, ị laghachiri gaa rie nri ma ṅụọ mmiri ebe a ọ gwara gị gbasara ya, sị: “Erila nri, aṅụkwala mmiri,” a gaghị ebubata ozu gị n’ebe e liri nna nna gị hà.’”+

23 Mgbe onye nke ezi Chineke richara nri, ṅụọkwa mmiri, onye amụma ahụ merela agadi doweere ya* ihe ọ ga-eji nọrọ ọdụ n’elu jakị. 24 Ọ gaziri nọrọ n’elu ya lawa. Ma, ọdụm hụrụ ya n’ụzọ ma gbuo ya,+ ozu ya atọgbọrọ n’ụzọ, jakị ahụ na ọdụm ahụ eguzorokwa n’akụkụ ya. 25 E nwekwara ndị nọ na-agafe ebe ahụ, ndị hụrụ ozu ahụ ka ọ tọgbọ n’okporo ụzọ na ọdụm ahụ guzo n’akụkụ ya. Ha gara n’obodo onye amụma ahụ merela agadi bi kọọ gbasara ya.

26 Ozugbo onye amụma nke kpọghachiri onye nke ezi Chineke nụrụ ya, ọ sịrị: “Ọ bụ onye nke ezi Chineke ahụ nke nupụụrụ Jehova isi.+ Jehova enyefeela ya n’aka ọdụm ka ọ dọgbuo ya, otú ahụ Jehova gwara ya na ọ ga-eme.”+ 27 Ọ gwaziri ụmụ ya, sị, “Dowerenụ m ihe e ji anọ ọdụ n’elu jakị.” Ha agaa dowe ya. 28 Ọ gawaziri ma hụ ozu onye amụma ahụ ka ọ tọgbọ n’okporo ụzọ nakwa jakị ahụ na ọdụm ahụ ka ha guzo n’akụkụ ya. Ọdụm ahụ erighị ozu ya, ọ dọgbughịkwa jakị ahụ. 29 Onye amụma ahụ buuru ozu onye nke ezi Chineke bukwasị n’elu jakị ahụ ma bughachi ya n’obodo nke ya ka o beere ya ákwá, liekwa ya. 30 O liri ozu ya n’ili nke ya, ha ana-ebere ya ákwá, onye ọ bụla n’ime ha ana-asị: “Ewoo, nwanne m nwoke!” 31 Mgbe o lichara ya, ọ gwara ụmụ ya, sị: “M nwụọ, lienụ m ebe ahụ m liri onye nke ezi Chineke. Dowekwanụ ọkpụkpụ m n’akụkụ ọkpụkpụ ya.+ 32 Ihe ahụ Jehova gwara ya kwuo ga-emezurịrị. O kwuru ihe ga-eme ebe ịchụàjà ahụ dị na Betel na ụlọ niile a na-anọ efe arụsị dị n’ebe ndị dị elu+ n’obodo ndị dị na Sameria.”+

33 N’agbanyeghị ihe a niile merenụ, Jeroboam akwụsịghị ịkpa àgwà ọjọọ, kama ọ ka nọ na-ahọpụta ndị nkịtị ka ha bụrụ ndị nchụàjà nke ebe ndị dị elu.+ Onye chọọ, ya ahọpụta ya ka ọ bụrụ onye nchụàjà. Ọ na-asị: “Ka ọ bụrụ otu n’ime ndị nchụàjà nke ebe ndị dị elu.”+ 34 Ihe ọjọọ a ndị ezinụlọ Jeroboam+ nọ na-eme mere ka e bibie ha, laakwa ha n’iyi.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya